Obinna Igbokwe: Etu nwoke si gbaa nwunye ya,ọgọ ya nwaanyị egbe, ma gbagbuo onwe ya n'Amerika

Ebe foto si, Montgomery County Sherrif's Office
Ndị uweojii mpaghara Montgomery County dị na mba Amerịka ekwuola na ezie na otu nwa amala Naijiria bụ Obinna Dwayne Igbokwe gbagburu onwe ya dịka ndị ọrụ ha na-achụ ya maka arụ ọ kpara ụbọchị Wenezde.
Ha sịrị na Igbokwe gbagburu nwunye ya bụ Tangela Igbokwe na na ọgọ ya nwaanyị bụ Linda Larkins ma kpọrọ nwa ha dị ọnwa atọ agba ọsọ oge nke a mere.
Akụkọ kwuru na Obinna na nwunye ya bụ Tangela na-ese okwu, naadọrịta onye ga-akpọrọ nwa ha dị ọnwa atọ, oge Obinna wepụtara egbe gbaa nwunye ya, gbaa ọgọ ya nwaanyị , dịka nd ị uweojii mpaghara ahụ si kwuo.
Tangela nọ n'ọnọdụ ọdịndụ ọnwụ ka mma mana nne ya bụ Linda anwụọla.
Ya bụ ihe mere na Arldine Westfield , Spring Texas.
Ndị uweojii wepụtaburu ozi mgbasaozi na-ekwu na nwoke ahụ a na-enyo nyo kpọrọ nwa ya gbapụ ọsọ ka ọ gbachara nwunye ya na nne nwunye ya egbe.
Ozi ndị uweojii mpaghara Montgomery wepụtara kwuru sị, " N'abalị abụọ nke ọnwa Juun afọ 2022 ebe 12.00 am nke ụtụtụ, ndị uweojii ngalaba nke Corsicana kpọrọ ndị uweojii ndị uweojii mpaghara Montgomery were kwuo na Mansa Igbokwe nọ n'aka ha."
Dịka ngalaba uweojii Corsicana siri kwuo, otu nwoke hapụrụ nwa ahụ n'oche ụgbọala n'otu ụlọnkwari ma kwuo na ya ga-echighata, mana o chighataghị."
Ka nwoke ahụ echighataghị, a kpọrọ ndị uweojii ngalaba Corsicana e were gwa ha na nwoke ahụ, onye ha na-eche bụ Igbokwe, kwọ ụgbọala dị ọcha pụọ."
" E sizara ozi nye ndị uweojii mpaghara Ellis na Navarro na Igbokwe nọ na mpaghara ahụ."
" N'ebe Elekere 1.05 ụtutụ, uweojii ngalba Ennis hụrụ ụgbọala Honda ọcha Igbokwe kwọ, gbalịa ịkwụsị ya. Ka ha chụọ ya ọsọ nwa obere oge, ụgbọala Honda ahụ kwụsịrị ebe a n'ọdọụgbọala ebe ndị uweojii nụrụ ụdaz otu ọnụ egbe. nime ụgbọala ahụ. Ha gbalịrị ịzọ ya ndụ , kpọọ ndị ọrụ ahụike mana n'ihi ụdị ahụ o nwere , Igbokwe nwụrụ n'ụlọọgwụ 'Dallas Hospital' n'ebe Elekere 5.20 nke ụtụtụ."
Ha gara n'ihu kwuo na Mansa Igbokwe nọ ọfụma, na o merụghị ahụ nakwa na ha akpọnyela ya ezinaụlọ ya.































