Eucharia Anunobi ekwuola nke bụ eziokwu gbasara akụkọ agbamakwụkwọ ya na-ewu ugbua.

Ebe foto si, Eucharia Anunobi/Instagram
Akụkọ na-efegharị na soshal midia na nsonso a bụ na onye ejije Nollywood a ma ama bụ Eucharia Anuobi na-akwado agbamakwụwkọ ya.
Dịka a akụkọ a siri kwuo, ya bụ agbamakwụkwọ kwesiri ịdị n'etiti ya na otu nwaokorobịa gbara afọ 27 nke a sị aha ya bụ Lucky Oparah.
Ya bụ akụkọ kwukwara na agbamakwụkwọ ahụ ga-adị n'ụbọchị 30 nke ọnwa Jun afọ 2022.
Mana nwaada Anunobi gwara BBC na akụkọ a na-efegharị bụ akụkọ ụgha.
"Ọ bụrụ na m na-akwado ịme agbamakwụkwọ, unu gara anụ maka ya kemgbe," Anunobi, onye bụkwa ọkammụta na onye oziọma ụka Kraist, gwara BBC.
"Ihe a bụ atụmatụ ndị ọjọọ chọrọ ịmetọ aha m dịka onye na-eme ejije nakwa onye nọ n'isi ụka Kraịst"
Anunobi gara n'ihu kọwaa na ọlụbeghị di ma kwuo na aha ọ na-aza ugbua bụ aha nna ya.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'afọ 2020, o tinyere ọnụ n'okwu alụmdinanwunye ma kwuo ka ndị mmadụ hie asaa n'anya tupu ha abanye na ya bụ ihe.
O kwuru nke a maka ọnọdụ ahụike dulara nwa ya mmụọ bụ 'Sickle Cell Anaemia' na etu ya na nna nwa ahụ gara isi gbochie ọnọdụ a ma ọ bụrụ na ha leziri anya nke ọma tupu a mmụọ ya bụ nwa.

Ebe foto si, Alamy
Ihe ị kwesiri ịma maka Eucharia Anunobi
- Eucharia Anunobi bụ onye ejije Nollywood a ma ama.
- Ọ gbara afọ 47, dịka a mụrụ ya n'ụbọchị 25 nke ọnwa Mee, 1965.
- Nwaada Anunobi na-emepụtakwa ejije ma bụrụkwa onye ozi ụka Kraịst.
- Ọ bụ onye Ahịazụ, Mbaise, Imo steeti ma gụọ akwụkwọ na mahadum Institute of Management and Technology nke Enugwu nakwa mahadum Naịjirịa nke Nsukka.
- Ọ natara ọzụzụ na ngalaba mgbasaozi nakwa asụsụ Bekee bụ English Language.
- Ọha matara ya n'oge gara aga maka agwa ọ kpara n'ejije ochie bụ 'Abuja Connection', 'Letters to a Stranger' nakwa 'Glamour girls'.
- Ọnọdụ ahụike nke ọbara bụ 'Sickle Cell Anaemia' dulara nwa ya nwoke Raymond mmụọ n'afọ 2017.
- N'afọ 2020, a họpụtara ya na ndị ga-erite ihe nrite nke onye enyemaka kacha mma n'ejije (Best supporting Actress in a movie or TV Series) n'emume ndị ejije Nollywood bụ AMVCA.































