Ndị ọrụ DSS anwụchiela otu nwoke maka mwakpo a wakporo Peter Obi na ndị ọzọ n'Edo steeti

Ebe foto si, Yunusa Tanko/X and Udeme Monday/Facebook
Ndị uweojii nzuzo Naịjirịa bụ 'Department of State Services' (DSS) ekwuola na ha anwụchiela onye a na-enyo enyo na aka so dị na mwakpo emere onye ji 'Labour Party' zọọ ọkwa onyeisala na ntuliaka afọ 2023 bụ Peter Obi.
A wakporo Obi bụbu Gọvanọ Anambra steeti, John Oyegun bụbu gọvanọ Edo steeti nakwa ndị ndu nakwa otu pati 'All Democratic Congress (ADC) n'abalị iri abụọ na anọ nke ọnwa Febụwarị na Edo steeti dịka ha si nzukọ na-abata.
Ka ọ gachara obere oge e mechara ha mwakpo, otu nwoke a kpọrọ Udeme Monday Stephen tinyere ozi n' akara ọbaozi ya bụ X ebe ọ nọ na na-eyi egwu ime mwakpo ọzọ megide, Peter Obi.
Udeme sị na Obi nwere isi ọma na ọ gbapụrụ mwakpo ahụ ma kwe nkwa na Peter Obi agaghị enwe isi ọma ụbọchị ọzo
N'okwu ya "Anyị dọrọ ya aka na ntị na ya abịakwala Edo steeti mana ọ chesi na okwu ahụ dịka mkpọtụ ndị na-eso ya bụ Obidiots na-eme. Ya kele kpakpandu ya na ọ lanarịrị nke a"
"A nụrụ m na ọ na-aga Riva steeti. Ọ bụ ndị otu m ga-ahazi ya. Ha anaghị emehie ihe. A gwakwala udo nyere ya maọbụ ndụ ogologo maka na-akara aka ya bụ ọnwụ"
Mwakpo ahụ mere dịka Obi na ndị otu ya si n'ụlọọrụ pati ADC na Edo steeti ebe ha gara nabata Olumide Akpata onye ji lebọ patị zọọ ọkwa gọvanọ na steeti ahụ na pati ọhụrụ ADC na-abata
Peter Obi nakwa ndị ọzọ katọrọ mwakpo ahụ ma kwuo na nkea agaghị egbochi ha.
Gọvanọ steeti ahụ bụ Monday Okpebholo soo kwa katọ mwakpo ahụ.
APC, ADC na-atụ onwe ha aka banyere mwakpo a wakporo Peter Obi

Ebe foto si, Yunusa Tanko/X
Otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'All Progressive Congress (APC) ebola ndị otu All Democratic Congress (ADC) ebubo ijiri ihe mere Peter Obi bụbu Gọvanọ Anambra steeti n'Edo steeti na-achụ nta nkwado.
APC mere ka a mata nke a n'akwụkwọ ha bụ Felix Morka, kesara ndị ntaakụkọ .
Felix Morka kwuru sị "n'ụbọchị Februwarị 25, 2026 ka ADC na-ekwu n'aka APC dị n'egbe maọbụ mmwakpo a wakporo Peter Obi bụbu Gọvanọ Anambra steeti mere n'Edo steeti".
"Ibo APC ebubo tupu ndị ọrụ nchekwa emee nnyocha bụ amaghị ihe. ADC emeela onwe ndị na-ebo ebubo, ndị na-eme nnyocha nakwa ndị ga-ekpe ikpe ahụ n'out aka ahụ".
Ọ gara n'ihe katọọ etu "ADC si kwuo na ọ bụ Gọọmenti nọ n'ọchịchị ji inyi ọha egwu na-emegide ndị patị ndị ọzọ".
"Ebubo ADC boro APC gosiri na ha amaghị etu ọnọdụ nchekwa nakwa agha Naịjirịa na-ebuso ndị na-enyi ọha egwu, ha amaghị ihe ndịagha anyị na-agabịga na-echekwa ndụ anyị".
APC gara n'ihu kwuo "ọgbaaghara na tigbuo zogbuo n'usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ ihe anyị na-anabaghị ma bụrụ ihe ụmụamala Naịjirịa katọrọ".
Ha kwuru na "nnyocha banyere ihe mere kwesiri ibido na ndị ndu otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ADC".
O doro m anya na ndị omekome ahụ chọrọ ịgbagbu Peter Obi n'Edo Steeti – Yunusa Tanko

Ebe foto si, Yunusa Tanko/X
Yunusa Tanko bụ onye ndụmọdụ Peter Obi agwala BBC Igbo etu ndị omekome ji egbe si wakpoo Peter Obi na ndị pati African Democratic Congress (ADC) ndị ọzọ oge ha gara mmemme iji nabata Olumide Akpata na osote na pati ha n'Edo steeti ma kwuo na o doro ya anya na ndị omekome ahụ chọrọ ịgbagbu Peter Obi.
Na mkparịtaụka ya na BBC nwere n'ụbọchị Wenezde 25 Febụwarị, 2026, Tanko kwuru na Peter Obi rutere n'ọdọụgbọelu dị n'Edo steeti oge ọ kụrụ elekere asatọ nke ụtụtụ n'ụbọchị Tuzde maka mmemme ahụ.
"Peter Obi gara ụlọọgwụ Philomina Catholic Hospital ebe ndị ụmụakwụkwọ nọọsụ na ndị orụ nabatara ya".
Tanko kwuru na Obi ji ohere ahụ mezuo nkwa o kwere ụlọọgwụ ahụ oge a na-arụ ya.
"Oge anyị hapụrụ ebe ahụ, anyị gara n'isiụlọọrụ pati ADC iji nabata Olumide Akpata na pati anyị, ọtụtụ ndị nkwado anyị jupụtara n'igwe ma nabata anyị n'ebe ahụ".

Ebe foto si, Yunusa Tanko/X
O kwuru na ọ bụ oge ha nọ ebe ahụ ka ha nwetere ozi na ndị omekome chọrọ iwakpo isiụlọọrụ ADC ahụ, nke mere ka ha mee mmemme ahụ ngwangwa ma pụọ gawa n'ụlọ John Odigie-Oyegun.
Tanko kọwara na ọ bụ oge Peter Obi, Ọkammụta Oserheimen Aigberaodion Osunbor bụbu Gọvanọ Edo steeti na ndị ọzọ so ha mee njem ahụ chọrọ ịhapụ ụlọ Oyegun gawa ọdọụgbọelu, ka ndị ojiegbe wakporo ụlọ Oyegun ma malite ịgba ha egbe.
"Ngwangwa ndị omokome ahụ malitere ịgba egbe ma mebie ọtụtụ ụgbọala, Peter Obi na ndị ọzọ laghachiri n'ime ụlọ Oyegun iji chekwaa onwe ha".
"Nke bụ eziokwu bụ na o doro anyị anya na ọ bụ Peter Obi na ndịisi pati ADC ndị ọzọ ka ndị omekome ahụ chọrọ igbu site na mwakpo ahụ ha mere".
Ka ọ dị ugbua, Tanko kwuru na ụfọdụ ndị nkwado pati ADC merụrụ ahụ site na mwakpo ahụ nọ n'ụlọọgwụ dị iche iche eweta nleta.
N'aka nke ọzọ, Peter Obi katọrọ mwakpo ahụ ma kwuo na ọ bụ ihe ịma aka nye ọchịchị onyekwuouche ya na Naịjirịa.
Ihe gọọmenti Edo steeti kwuru maka mwakpo ahụ

Ebe foto si, Monday Okpebholo/X
Gọvanọ Monday Okpebholo na-achị Edo steeti akatọọla mwakpo ahụ ndị omekome wakporo Peter Obi na ndị otu pati ADC steeti ya.
Gọvanọ Okpebholo kọwara mwakpo ahụ dịka mpụtara nsogbu pati ADC na-enwe n'ime onwe ha.
N'okwu ya "Dịka aka na-achị Edo steeti, ekwerenye m na a kpọbatara ndị omekome ahụ iji tee Edo steeti unyi n'ihu".
"Agaghị m ekwe ka ndị mmadụ kpọbata ndị omekome na steeti ya iji metọọ, tinye ọgbaghara ma gbochie mbọ gọọmenti m na-agba iweta udo na steeti anyị".
Gọvanọ Okpebholo kwuru na o doghị anya ihe bụ ebumnobi ndị omekome ahụ mana gọọmeti ya ga-egbochi ndị maọbụ otu ọbụla chọrọ itisa udo dị n'Edo steeti.
Ọ kpọrọ oku ka pati ADC ghara ị na-atụ gọọmenti ya aka banyere mwakpo ahụ ma mee ka o doo anya na gọọmenti ya ga-egbochi nkata ọbụla pati chọrọ iwere ọchịchị na-akpa iji metọọ gọọmenti ya.





























