Mwakpo ndị ọrụnchekwa n'obodo anyị eriela isi ọtụtụ mmadụ dịka gọọmentị gbachiri ụlọakwụkwọ, ụlọọgwu, ahịa obodo anyị - Ndị Amasiri n'Ebonyi

Ebe foto si, BBC/Oko Family
Ndị obodo Amasiri dị n'Okpuru Ọchịchị Afikpo ,Ebonyi steeti etiela mkpu banyere ihe ha kpọrọ 'mkpagbu' nke gọọmentị steeti ahụ dịka ndịagha weghara ọnọdụ n'obodo kemgbe otu ọnwa.
Ọtụtụ mmadụ anwụọla kemgbe ndị ọrụ nchekwa weere ọnọdụ n'obodo Amasiri kemgbe abalị 31 nke ọnwa Jenwarị afọ 2026, dịka ndị obodo Amasiri si gwa BBC Igbo.
Ndị nwụrụ gụnyere nwoke gbara afọ 31 a kpọrọ Uchekwukwu Oko,onye ogbe Amauzu Ezeke Amasiri bụ onye a sị nwụrụ n'aka ndị nchekwa nwụchiri ya na okorobịa abụọ ndị ọzọ, dịka ndị obodo ha si kwuo.
Osote Onyeisi otu Amasiri Town Union bụ Amadi Njoku gwara BBC Igbo sị, "Ụfọdụ bụ ndị agha tigburu, ụfọdụ bụ ndị a gbagburu, ndị amaghị ndị ha bụ a tọgburu otu nwoke abalị ole na ole gara agaa, ụfọdụ nwuru n'ọrịa nihi na emechiri ụlọọgwụ, "

Ebe foto si, Screengrab
Nke a na-abịa dịka ọrụ nchekwa weghara ọnọdụ n'Amasiri kemgbe ngwụcha ọnwa Jenụwarị afọ 2026.
"Agụụ egbuola ndị mmadụ, ndị mmadụ anaghị aganwu ahịa, ha na-agalị ugbo. "
"Ọ bụ eziokwu na anyị na obodo anyí ịna ha gbara agbataobi nwere esemokwu, mana Gọvanọ mee nnyocha mara ihe mere."
" Onweghị ebe ndị Amasiri gbakọrọ kpebie si gaa
"Ihe na-ewute anyị bụ etu o siri tinye mmachi, mechie ụlọakwụkwọ, ụlọọgwụ mechie ahịa, o nweghị onye na-agagharị kemgbe ihe karịrị otu ọnwa n'obodo anyị ugbua."

Ebe foto si, BBC/Oko Family
N'abalị 29 nke ọnwa Jenụwarị ndị bu egbe a maghị ndị ha bụ wakporo obodo Oso Edda, dị n'Okpuru ọchịchị Edda, gbuo mmadu ise, tọọrọ ọtụtụ ma gbaa ọtụtụ ụlọ ọkụ.
Gọvanọ Steeti ahụ bụ Francis Nwifuru kwụsịrị ndị jị ọkwa ọchịchị na gọọmentị si Amasiri ọrụ nwa mgbe nta ma nye iwu ka ndị obodo Amasịrị bụ ebe a na-enyo na ndị kpara mkpamkpa ahụ wepụta ndị mere ya bụ ihe.
Mana ndị Amasịrị na-ekwu na Gọvanọ Nwifụrụ mara ha ikpe ma na-ata ha ahụhụ na-emeghị nnyocha zuru oke iji mata ndị mere ya bụ ihe n'ezie.

Ebe foto si, Screengrab
Okwudi Udechukwu Oko, gbara afọ 31,onye ogbe Amauzu Ezeke Amasiri bụ onye nwụrụ n'aka ndị nchekwa nwụchiri ya na okorobịa atọ ndị ọzọ, dịka ndị ezinaụlọ ya si gwaa BBC Igbo.
Nwunye ya bụ Comfort Udechukwu gbara afọ 27 gwara BBC Igbo sị, "N'abalị 19 nke ọnwa gara aga(Febụwarị), ọ nọ n'Ahịa Akaeze oge ndịagha bịara nwuchie ya kpụrụ ha gawa Abakaliki."
"Ka ọ gachara abalị ole na ole, anyị nwetara ozi na e tigburu ya."
Oge a kpọtụrụ ya n'ekwentị, Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi na steeti ahụ bụ Iheuwa Omabe gwara BBC Igbo ka onye anyị oge iji zaa ajụjụ a jụrụ ya.
Ihe Ebonyi steeti kwuru
Gọọmentị Ebonyi Steeti ekwuola na ha amaghị maka ndị e kwuru nwụọrọla site na mwakpo ndịagha na ndị ọrụ nchekwa mere n'Amasiri.
Na mkparịtaụka BBC Igbo na Komishona mgbasaozi steeti ahụ bụ Ọkaiwu Iheuwa Omabe nwere n'ekwenti, o kwuru sị, " Enweghị m ike ikwu maka ihe m na- amaghị ganye na m nụta olu ndị uweojii."Aga m
Ọ gara n'ihu kwuo na "Anyị ejighị nchekwa ndị be anyị egwu egwu."
Dịka agaghị ekwu ihe a ihe na-eme n'Ihe ị na-anụ bụ kekpukepu ihe bụ gọọmentị na-akwanyere ndị obodo
Ihe Ndị uweojii Ebonyi kwuru
Ndị uweojii Ebonyi kwuru na ha amaghị maka ọnwụ nwoke ahụ a sị egburu nke ha na-anụ maka nwoke a tọgburu.
Ọnụ na-ekwuru ha bụ Joshua Ukandu gwara BBC Igbo n'ekwentị na " jụrụ na-eneghị mgbagha ọbụla na onweghị onye ọmasiri nwụrụ n'aka ndị uweojii nna nnyocha okwu dapụtara n'etiti ndị Amasiri na ndi Okporojor."






























