Akụkọ dị mkpa - Maachị 4, 2026
Akụkọ dị mkpa - Maachị 4, 2026
Gee ihe na-eme n'ụwa taa n'otu nkeji:
- Otu na-ahụ maka usoro ndị dọkịta na etu ndị dịbịa eze si arụ ọrụ bụ Medical and Dental Council of Nigeria (MDCN) akwụsịtụla ndị dọkịta abụọ nke ụlọọgwụ Euracare Multi-Specialist Hospital ọrụ.
- A kwụsịrị ha ọrụ dịka a na-enyocha ha maka ebubo ndahie n'ọnwụ nwa Chimamanda Ngozi Adichie bụ Nkanu Nnamdi Esege.
- Gọọmenti Anambra steeti ewepụla ego n'ụgwọ ọnwa Febụwarị nke ọtụtụ ndị ọrụ Oyibo na steeti ahụ.
- E wepụrụ ego n'ụgwọọnwa ha maka ịnọrọ n'ụlọ n'ụbọchị Monde n'agbanyeghị na gọọmentị machiri nke a na nsonso a.
Soyere anyị na websaịtị, Instagram, Facebook na WhatsApp chanelụ maka akụkọ niile na-eme n'ụwa.






