Ana m akpụ ụzụ ka akaọrụ a ghara ịla n'obodo anyị bụ Akulu Isuofia - Anthony Okafor

Aha onyonyo, Aka m na-akpụ ụzụ ka akaọrụ a ghara ịla n'obodo anyị bụ Akulu Isuofia - Anthony Okafor
Ana m akpụ ụzụ ka akaọrụ a ghara ịla n'obodo anyị bụ Akulu Isuofia - Anthony Okafor

Maazị Anthony Okafọr bụ onye ọkpụ ụzụ a ma ama n'obodo Akulu Isuofia nke Anambra akọwaala ihe mere o jiri nọrọ n'ọrụ ahụ ruo ugbua n'agbanyeghi na akaọrụ a na-ala ala ugbua.

Na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere, Okafor kwuru na ọ malitere ịkpụ ụzụ n'ihe dịka afọ 1998 mana o bidoro ikuziri ndị ọzọ n'afọ 2014.

O kwuru na ihe e ji mara ndị obodo ha bụ ịkpụ ụzụ, mana akaọrụ ahụ na-alazi ala.

Ana m akpụ ụzụ ka akaọrụ a ghara ịla n'obodo anyị bụ Akulu Isuofia - Anthony Okafor

Maazị Okafor kwuru na ebumnobi ya bụ iwere ọtụtụ ndị ntoroọbịa n'ọrụ ọkachasị ndị nọ n'ụlọmkpọrọ, nke bụ na ha pụta, ha agaghị etinyezi aka n'ihe ọjọọ ọzọ.

O kwuru na nsogbu ọ na-enwe bụ enweghi ezi nkwado. O kwuru na ọ bụrụ na ọ ga-enwete nkwado ego, na ọ ga-emezu ihe ndị ahụ.

Ụfọdụ ihe ndị ha na-akpụpụta n'ụzụ gụnyere ekwu igwe, ọgụ, ọnya, ube, ịga na ihe ndị ọzọ.

Kirie ihe o kwuru n'uju.