NA EME UGBU A, Ihe mere Anambara steeti ji wepụ ego n'ụgwọọnwa ụfodu ndị ọrụ oyibo

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'izu a.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu, Uche Akolisa

  1. Naịjirịa akwụsịla njem ịga Ala Nsọ n'ihi esemokwu Middle East

    Cheta na ọtụtụ puku Ndị Kraịst Naịjirịa na-aga njem nsọ kwa afọ n’ebe Baịbụl kwuru na Jerusalem, Betlehem na Nazaret.

    Ebe foto si, AFP via Getty Images

    Nkọwa foto, Cheta na ọtụtụ puku Ndị Kraịst Naịjirịa na-aga njem nsọ kwa afọ n’ebe Baịbụl kwuru na Jerusalem, Betlehem na Nazaret.

    Ndị ọchịchị Naịjirịa akwụsịla njem niile na-aga Izrel na West Bank ozugbo, n'ihi nsogbu nchekwa maka esemokwu na-akawanye njọ na mpaghara Middle East.

    Ọ bụ otu na-ahụ maka ịhazi njem Ndị Kraịst nke Naịjirịa bụ Nigerian Christian Pilgrim Commission (NCPC), kwupụtara mkpebi a.

    N'okwu ha, ụlọọrụ ahụ kwuru na ihe a dị mkpa iji mee ka "nchekwa na ọnọdụ dị mma" nke ndị njem ala nsọ Naịjirịa buru ụzọ.

    Ka ọ dị ugbua, esemokwu ahụ gbasara n'ofe Middle East mgbe ndị Amerịka na ndị Izrel wakporo Iran, nke gburu onye ndu kachasị elu nke mba ahụ bụ Ayatollah Ali Khamenei.

    Iran azaghachila ha site n'ịwakpo Izrel na mba ndị ha na Amerịka jikọrọ aka na mpaghara Gulf.

    Ọzọ, a kagbuola ọtụtụ ụgbọelu na-aga mpaghara Middle East, ebe mba dị iche iche na mpaghara ahụ mechiri ụzọ ụgbọelu ha, nke mere ka ndị njem nọrọ n'ọnọdụ adịghị mma.

    Nkwụsị njem Ndị Kraịst metụtara njem niile gọọmentị haziri yana ndị ọrụ njem onwe ha haziri.

    Ndị ọrụ gọọmentị kwuru na mmachibido iwu ahụ ga-adịgide ruo mgbe ọnọdụ dị na mpaghara ahụ ga-adị mma.

    Cheta na ọtụtụ puku Ndị Kraịst Naịjirịa na-aga njem nsọ kwa afọ n’ebe Baịbụl kwuru na Jerusalem, Betlehem na Nazaret.

    Njem ndị a, nke gọọmentị steeti na-enye ego maọbụ na-ahazi, so n'ihe ndị dị mkpa na kalenda okpukperechi Kraịst na Naịjirịa.

    Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  2. Gọọmenti Anambra steeti ewepụla ego n’ụgwọọnwa ndị ọrụ n'ọnwa Febrụwarị

    Charles Soludo

    Ebe foto si, Charles Soludo

    Gọọmenti Anambra steeti ewepụla ego n’ụgwọ ọnwa Febrụwarị nke ọtụtụ ndị ọrụ.

    E wepụrụ ego n’ụgwọ ọnwa ha maka na ha abịaghị ọrụ n’ụbọchị Monde.

    Gọọmenti steeti ahụ machiburu ịnọ n'ụlọ n'ụbọchị Monde ma dọọ ndị ọrụ bekee aka na ntị na ọ ga-abụzị,"onye arụghị, ọ gaghị eri".

    Kọmishona mgbasaozi na steeti ahụ bụ Law Mefor kwuru na ozi o wepụtara sị,"Achọrọ m ka onye ọrụoyibo ọbụla mara na anyị na-ahụ mbọ ha."

    Ọ gara n'ihu kwuo, "Anyị ji ndị Anambara ụgwọ ịhụ na eji ego ha eme ka o kwesịrị, ọbụladi ma ọ gaeme ka mee ihe ga-afụ ụfụ ime."

    Mefor gwakwara BBC Igbo n'ekwentị na "etu e si ewepụ ego ahụ n'ụgwọ ọnwa ha bụ a gbakọọ mọnde ole onye ahụ abịaghị, e wepụ ihe ọ pụtara n'ụgwọ ọnwa onye ahụ".

    Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ mkpebi gọọmenti Anambra dịka etu a ga-esi kwụsị adịghị abịa ọrụ n'ụbọchị monde.

    Mana mgbe BBC jụrụ Mefor na a na-ewepụ ego n'ụgwọ ọnwa ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-arụrụ gọọmentị ọrụ ka ọ sara sị "amaghị m maka nke a, mana ọ bụ kọmịshịọna na-ahụ maka akụnụba ga-ama na ha e na-ewepụ ego".

  3. Etu agha dị n’Ịran ga-esi metụta ọnụahịa mmanụ na mbaụwa

    Etu agha dị n’Ịran ga-esi metụta ọnụahịa mmanụ na mbaụwa

    Ebe foto si, Getty Images

    Agaala n’ihu na-enwe ọgbaaghara n’etiti Ịran, Amerịka na Izrel kemgbe e gbuchara onyendu kachasị n’Ịran bụ Ayatollah Ali Khamenei.

    Dịka Izrel na Amerịka gara n’ihu na-awakpo obodo Ịran dị iche iche, Ịran amụbaala mwakpo ha na-eme n’ụlọọrụ Amerịka dị iche iche nakwa akụrụngwa ndị na-enye ikike na mpaghara Middle East.

    Mpaghara ọzọ a tụrụ anya na agha a ga-emetụta bụ ngalaba ikike.

    Ọnụahịa otu barel mmanụ agbịdị ejirila pasenti anọ rịa elu dịka ọgbaaghara a gara n’ihu na-efesa na Middle East.

    N’ụbọchị Tuzde, e rere otu barel mmanụ gaasị n’ọnụego dọla iri asatọ, nke kachasị kemgbe mmalite afọ a.

    Ịran emechiela Strait of Hormuz, nke bụ ụzọ mmiri dị warawara e si ebupụ mmadụ, nke jikọtara mpaghara Gulf na Indian Ocean.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

    BBC kpọtụụrụ onye ọkachamara na-ahụ maka ikike na Naịjiria bụ Ọkankụzi Ahmed Adamu, onyenkụzi na mahadum Philomath University dị na Naịjirịa, onye kwuru na ọnọdụ dị na Middle East ga-emetụta ọnụahịa mmanụ na Naịjirịa.

    “Ọ bụ ihe na-enweghị mgbagha na ọnụahịa mmanụ ga-arị elu na mbaụwa n’ihi na Ịran bụ mba nke anọ kachasị emepụta mmanụ agbịdị n’ụwa.”

    Ọ dọrọ aka na ntị na ọnụahịa mmanụ ụgbọala na gaasị nwereike ịrị elu n’ihi ịrị elu nke ọnụahịa mmanụ agbịdị na mbaụwa.

    Ndị ọkachamara kwenyere na ọ bụ eziokwu na ịrị elu n’ọnụahịa mmanụ agbịdị nwereike kwalite ego mkpata Naịjirịa, mana ọ ga-emetụta ọnụahịa a na-ere otu lita ha na Naịjirịa.

    Nke a ka o kwuru ga-emetụta ọtụtụ ngalaba, dịka ime njem nakwa ihe dị iche iche ndị mmadụ ji eme ihe.

  4. NAFDAC ekwuola na ịmachi mmanya ọkụ ndị a gbanyere n’obere akpa ga-ebelata aṅụrụma n’etiti ụmụaka

    NAFDAC ekwuola na ịmachi mmanya ọkụ ndị a gbanyere n’obere akpa ga-ebelata aṅụrụma n’etiti ụmụaka

    Ebe foto si, NAFDAC, Getty

    Nnukwu Onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ụzọ e si eji ihe oriri na ọgwụ eme ihe na Naịjirịa (NAFDAC) bụ Mojisola Adeyeye akọwaala ihe mere e ji machie mmanya ọkụ ndị a gbanyere n’obere akpa gburugburu Naịjirịa.

    Adeyeye kwuru na mmachi ahụ bụ ụzọ kachasị mma a ga-esi gbochie ogogo na-arị elu ụmụaka ji aṅụ mmanya ndị na-aba n’anya na Naịjirịa.

    Nnukwu Onyeisi ụlọọrụ NAFDAC nyere nkọwa a n’Abuja n’ụbọchị Tuzde 3 Maachị 2026 n’ọgbakọ ya na ndị ntaakụkọ nwere iji malite mmachi ahụ.

    NAFDAC press statement

    Ebe foto si, NAFDAC/X

    O kwuru na ụlọọrụ NAFDAC ga-agbakọọrọ ụlọọrụ National Orientation Agency (NOA), na Federal Competition and Consumer Protection Commission (FCCPC) aka iji mejupụta mmachi ahụ.

    Dịka Adeyeye siri kwuo, ịmachi mmanya ọkụ ndị a gbanyere n’obere akpa nakwa obere karama ndị a pụrụ izo ngwangwa ga-ebelata etu ụmụaka si enweta mmanya ọkụ.

    Ọ kọwakwara na mmanya ọkụ ka bụkwa otu n’ime ihe ndị a kachasị emetọ n’etiti ndị na-eto eto.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  5. Igbo nwe mmadụ, ụnụ abọọla chi?, Ọfọ anyị taa bụ ndụ mmiri, ndụ azụ. Mmiri atala ma azụ anwụla.

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Wenezde 4 Maachị, 2026.

    Sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ndị gbara ọkpụrụkpụ si Naịjirịa, Afrịka na mbaụwa niile.

    Sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ anyị maka akụkọ, foto na onyonyoo dị iche iche ga-amasị gị.

    Nnọọ!

  6. Anyị amaghị maka akụkọ kwuru na nwaanyị gburu nne ya n’obodo Ezema Nru nke Nsukka – Ndị uweojii

    Mana otu onye agbataobi na achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC na a kpọrọla ụmụnwaanyị abụọ ahụ gawa ebe a na-elekọta ndị nwere ọnọdụ ahụike nke ụbụrụ n’Enugwu.
    Nkọwa foto, Mana otu onye agbataobi na achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC na a kpọrọla ụmụnwaanyị abụọ ahụ gawa ebe a na-elekọta ndị nwere ọnọdụ ahụike nke ụbụrụ n’Enugwu.

    Ndị uweoji ekwuola na ha amaghị maka akụkọ kwuru na otu nwaanyị na nwa ya nwaanyị gburu nne ha n’obodo Umunkporogidi Ezema Nru nke dị n’okpuru ọchịchị Nsụka Enugwu Steeti n’ụbọchị Tuzde abalị iri abụọ na anọ nke ọnwa Febụwarị 2026.

    Na nzaghachi ajụjụ ụlọmgbasa ozi BBC News Igbo jụrụ ya n’ekwentị, ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n’Enugwu Steeti bụ Daniel Ndukwe kwuru na ndị uweojii anataghị ozi ọbụla banyere akụkọ ahụ.

    Mana mgbe onye ntaakụkọ BBC News Igbo gara n’obodo Umunkporogidi Ezema Nru ka anyị chọpụtara na onweghị onye ọbụla nọ n’ezinaụlọ ahụ ihe ahụ mere dịka a gbachiri ụlọ ha agbachi.

    Mana Onyeisi ndị ntoroọbịa aha ya bụ Casmire Ezeugwu kọwara BBC News na ya na onyeisi obodo ahụ ji ọsọ gbaaga n’ebe ahụ ihe mere mgbe ha nọrọ akụkọ ahụ.

    Ezeugwu bụ onye gwara BBC News Igbo na akụkọ ahụ mere eme, kwuru na ndị uweojii kpọọrọ nwaanyị ya na nwa ya nwaanyị gburu nne ha gawa n’ụlọọrụ ndị uweojii dịka e tinyere ozu nwaanyị nwụrụ anwụ n’oba ozu.

    Onyeisi ndị ntoroọbịa gwara BBC na ya amaghị ebe nwaanyị ya na nwa ya gburu nne ha nọọ ugbua.

    Mana otu onye agbataobi na achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC na a kpọrọla ụmụnwaanyị abụọ ahụ gawa ebe a na-elekọta ndị nwere ọnọdụ ahụike nke ụbụrụ n’Enugwu.

    Mana Onyeisi ndị ntoroọbịa aha ya bụ Casmire Ezeugwu gwara BBC News na akụkọ ahụ mere eme
    Nkọwa foto, Mana Onyeisi ndị ntoroọbịa aha ya bụ Casmire Ezeugwu gwara BBC News na akụkọ ahụ mere eme

    Cheta na akụkọ malitere na-efegharị na otu nwaanyị na nwa ya nwanyị gburu otu nwaanyị dị afọ iri asaa, nke a maara dịka "Mama Oliver," n'ihe mberede ezinụlọ dịka ụlọmgbasa ozi mpaghara siri kọọ.

    Ndị hụrụ ihe merenụ kwuru na nwaanyị ahụ nwụrụ anwụ si Umabor-Ehalumona gaa ka ya na ada ya nwaanyị bụ Loretta Asadu biri, iji lekọta ada ya na nwa ya nwaanyị, ha abụọ bụ ndị e kwuru na ha nwere nsogbu ahụike ụbụrụ.

    Onye ahụ kọrọ na Loretta Asadu bụ nwunye Ignatius Asadu nke Umunkporogidi nwụrụ anwụ, ma kwuo na ọnọdụ ahụike ụbụrụ ya malitere ịka njọ n'oge na-adịbeghị anya.

    E kwuru na ọdachi ahụ mere mgbe agadi nwaanyị ahụ mere mkpesa maka agụụ. Otu nwoke n'ezinụlọ ahụ aha ya bụ Abumchukwu, onye a sịrị na ọ bụ nwa Loretta, gara ịzụtara nne nne ya nri mgbe ihe ahụ mere.

    "Tupu ya apụọ, Abumchukwu kechiri aka nne ya n'ihi na ọ na-eme ihe ike," ka onye agbata obi ya kwuru. "Mgbe ọ nọghị, Chikamso tọpụrụ nne ya. A kọrọ na ha abụọ wakporo agadi nwaanyị ahụ, dọkpụo ya n'azụ ụlọ ma gbuo ya,” ka ụlọmgbasa ozi mpaghara kọrọ.

    Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  7. Mba Amerịka amachiela ndiagha Rwanda maka imebi nkwekọrịta udo n’etiti ndị ọchịchị Congo na Rwanda

    Mba Amerịka boro ndịagha Rwanda ebubo ịlụ agha n'akụkụ ndi otu nnupuisi M23

    Ebe foto si, AFP via Getty Images

    Nkọwa foto, Mba Amerịka boro ndịagha Rwanda ebubo ịlụ agha n'akụkụ ndi otu nnupuisi M23

    Mba Amerịka amachiela ndịagha mba Rụwanda nakwa ndị isi ha mmadụ anọ, na-ebo ha ebubo ịkpali ọgbaghara na mba agbataobi ha bụ Kongo( Democratic Republic of Congo.)

    Ọgụ ka na-aga n’ihu n’agbanyeghị atụmatụ nkwekọrịta udo nke mba Amerịka wetara n' ọnwa Disemba n’etiti ndị ọchịchị Kongo na Rwanda.

    Ụlọọrụ Amerịka na-ahụ maka ego boro ndịagha Rụwanda ebubo imebi nkwekọrịta udo site n’ọzụzụ, ịkwadebe ihe na ịlụ ọgụ n'akụkụ otu ndị nnupụisi M23.

    Rụwanda gọrọ ebubo ndị ahụ ngwa ngwa , na-ekwu na ebobo ahụ ekwghị kpọmkpwem etu okwu ahụ sịrị dịrị, n’agbanyeghị ihe akaebe nke na-egosi nke bụ eziokwu.

    Rụwanda sị na ndịagha ha nọ na mpaghara ebe ahụ bụ ihe nchebe megide iyi egwu nke ndị otu agha nnupuisi na Kongo na-eyi nchekwa Rwanda.

    Gụọ akụkọ ọzọ ebea:

  8. Izrel atụọla ogbunigwe n'ụlọọrụ Gọọmenti mba Iran

    Nke a na-egosi ebe mba Amerịka na Izrel tụrụ ogbunigwe n'isi obodo mba Iran n'ọnwa Maachi 1, 2026

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndịagha mba Izrel ekwuola na ha tụrụ ogbunigwe n'ụlọọrụ Gọọmenti mba Iran.

    Israeli Defense Force (IDF) mere ka a mata nke a n'akwụkwọ ozi ha zipuru.

    IDF sị na "atụtụ ogbunigwe ka a tụrụ n'ụlọọrụ Onyeisiala mba Iran na isi ụlọọrụ ndịagha Iran".

    Ha sị na a tụkwara ogbunigwe n'ụlọọrụ ebe a na-azụpụta ndịagha nakwa ụlọọrụ gọọmenti mba Iran dị icheiche.

    Cheta na onye ndu mba Iran bụ Ayatollah Ali Khamenei nwụrụ n'ogbunigwe mba Amerịka na mba Izrel jikọrọ aka ọnụ tụọ n'ụlọ ya n'ime izuụka garaaga.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  9. A tọhapụla ndị ụka ndị ojiegbe tọọrọ n’Ondo Steeti

    Ụgbọala ndị uweojii na otu onye uweojii bu egbe

    Ebe foto si, Getty Images

    Akụkọ kwuru na a tọhapụla ndị ụka ise ahụ a ndị ojiegbe tọọrọ n’ụlọụka Celestial Church of Christ (CCC) dị n’Uso, n’okpuru ọchịchị Owo Ondo Steeti.

    E kwuru na ezinaụlọ mmadụ anọ n’ime ha kwụrụ ndị ojiegbe ahụ nde naịra itoolu (₦9m) iji mee ka ha tọhapụ ha.

    Otu onye ezinaụlọ na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara ndị ntaakụkọ na ndị ojiegbe ahụ kwuru ka a kwụọ ha nde naịra iri anọ (₦40m) mana ha mechara belata ya dịka ha rịọrọ ha.

    Isi ụlọọrụ ndị uweojii n’Ondo Steeti kwuru na ha ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ malitere ịrụ ọrụ ngwa ngwa ha nwetara ozi banyere ndị ahụ ndị ojiegbe tọọrọ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Abayomi Jimoh kwuru na ndị ọrụ ya nwuchiri out onye ndị ojiegbe ahụ ebe a na-eme nnyocha inwuchi ndị nke ọzọ gbara ọsọ.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  10. Unu asaala chi ndị be anyị?

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tuzde 3 Maachị, 2026.

    Sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ndị gbara ọkpụrụkpụ si Naịjirịa, Afrịka na mbaụwa niile.

    Sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ anyị maka akụkọ, foto na onyonyoo dị iche iche ga-amasị gị.

    Nnọọ!

  11. Mmadụ 169 anwụọla na mwakpo mere na mba Saụt Sudan

    Onye ojiegbe bu egbe

    Ebe foto si, AFP via Getty Images

    Ndị ọchịchị na mba Saụt Sudan ekwuola na mmadụ ruru 169 gụnyere ndịisi ọchịchị anwụọla na mwakpo ndị ojiegbe a na-amaghị wakporo mpaghara ugwu mba ahụ n’ụbọchị Sọnde Maachị 1, 2026.

    Mịnịsta na-ahụ maka mgabasaozi bụ James Monyluak Mijok boro ebubo na ndị ojiegbe ahụ si n’Unity steeti dị ha nso ma bụrụ ndị e kwuru na ndị otu Sudan People's Liberation Army in Opposition (SPLA-IO) nwere mmekọ.

    Otu SPLA-IO gọnarịrị ma kwuo na aka ha adịghị na mwakpo ahụ ma kwuo na ndịisi ọchịchị Unity steeti ahụ na-achọ itikọ isi na isi.

    Mijok kwuru na ndị ahụ nwụrụ gụnyere ụmụaka 90, ụmụnwaanyị na ndị okenye na mmadụ 79 e kwuru na ha bụ ndị ọrụ nchekwa gụnyere ndị uweojii.

    E kwuru na e bugara mmadụ 50 ndị ọzọ merụrụ ahụ n’ụlọọgwụ ebe ha nọ na-eweta nleta zuruoke.

    Mijok gwara BBC na ndị ojiegbe ahụ batara obodo Abiemnom dị na mpaghara Ruweng n’isi ọtụtụ ụbọchị Sọnde oge ndị obodo na-ehi ụra.

    O kwuru na ndị ojiegbe ahụ mụnyere ọtụtụ ụlọ na ụlọahịa ọkụ n’ọgụ ruru awa anọ.

    Akụkọ ndị ọzọ nwereike ịmasị gị:

  12. Otu Shia na Naịjirịa emeela ngagharịiwe iji kwadoo mba Ịran n'ọgụ ha na Amerịka/Izrel

    Ndị otu Shia yi uwe ojii jiri ọkọlọtọ mba Ịran n'aka na-eme ngagharịiwe

    Ebe foto si, Media Forum of the Islamic movement

    Ndị otu alaka okpukperechi Alakụba a kpọrọ Shia na Naịjirịa emeela ngagharịiwe na mpaghara ugwu Naịjirịa n’ụbọchị Sọnde maka ọnwụ onyendu mba Iran bụ Ali Khamenei, nke nwụrụ site n’ogbunigwe mba Amerịka na Izrel tụrụ na mba ha.

    Ozi si n’aka onyendu otu Islamic Movement in Nigeria (IMN) bụ Sheikh Ibraheem Zakzaky kwuru na ha mere ngagharịiwe ahụ n’Abuja, Kaduna, Kano, Bauchi, Niger na Katsina. Ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia gosiri ka ndị otu a bucha foto onyendu Iran nwụrụ anwụ bụ Khamenei na-akpagharị ma na-ekpe ekpere.

    Otu okpukperechi Alakụba Shia dị n’Ịran nakwa mba ọzọ na-ahụta Onyendu a dịka onyeisi nakwa onye ntuziaka n’okukperechi. Otu Shia na Naịjirịa so na ndị kachasị obere n’ọnụọgụgụ n’okpukperechi Alakụba na Naịjirịa.

    Ndị otu Shia yi uwe ojii jiri ọkọlọtọ mba Ịran n'aka na-eme ngagharịiwe

    Ebe foto si, Media Forum of the Islamic movement

    E kewapụtara ha n’ihe dịka afọ 1970 nke ngalaba Iran Islamic Revolution kpalitere mmụọ nkewapụta ya. Ha na mba Iran na-akpa ofu agwa ma a bịa n’omenala nakwa okpukperechi, nke mere na ihe mere n’Ịran jiri emetụta ha.

    Ndị ọrụ gọọmenti Naịjirịa kwuru na ha na-ele ka ngagharịiwe ahụ si aga iji kpochie ọgbaghara. Ndị uweojii Naịjirịa kwuru na ha ekeela nkwụcha na mpaghara ugwu ma dọọ aka na ntị “atụmatụ mmadụ ọbụla nwere ibute ọgbaghara banyere okpukperechi na Naịjirịa, onye ahụ ga-anata ntaramahụhụ dị nay a.”

    Otu Shia bụ na ndị ọrụ nchekwa na Naịjirịa enweela ọtụtụ ọgbaghara n’oge gara aga, ebe a nwuchiela onyendu ha bụ Zakzaky ọtụtụ ugboro. Otu a kwuru na ha ga-eme ngagharịiwe a n’ụbọchị Fraịde iji kwadoo mba Ịran ma ruo uju ọnwụ onyendu ha.

    Ndị otu Shia yi uwe ojii jiri ọkọlọtọ mba Ịran n'aka na-eme ngagharịiwe

    Ebe foto si, Media Forum of the Islamic movement

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  13. Ịran ekwuola na ha wakporo ụlọọrụ Praịm Mịnịsta mba Izrel

    Benjamin Netanyahu bụ Praịm mịnịsta mba Izrel

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụlọmgbasaozi na mba Ịran ekwuola na ọnụ na-ekwuru ndịagha Revolutionary Guards mba Ịran wakporo ụlọọrụ Praịm Mịnịsta Izrel bụ Benjamin Netanyahu nakwa isiụlọọrụ ndịagha ụgbọelu mba Izrel

    Akwụkwọozi ndịagha ahụ wepụtara kwuru na ha ga-egosi ihe ụfọdụ mwakpo ahụ mebiri n’oge adịghị anya dịka ụlọọrụ mgbasaozi BBC Persian si kwuo.

    Ka ọ dị ugbua, ụlọọrụ Praịm Mịnịsta Netanyahu ekwughị ihe ọbụla banyere okwu a.

    Cheta na ndịagha Revolutionary Guards kwuru na ha ji ogbunigwe Khyber wakpo Izrel.

    Ogbunigwe mba Ịran ji wakpo Izrel

    Ebe foto si, Getty Images

    Ha kwuru na ọ bụ mpaghara Tel Aviv, Haifa na ọwụwa anyanwụ Jerusalem ka ha wakporo.

    Ogbunigwe Khyber ahụ bụ nke nwereike iru ihe ruru kilomita puku abụọ (2,000km).

    Osote onyeisi ndịagha mba Ịran bụ Mohammad Reza Ashtiani kọwara ogbunigwe ahụ dịka ọkaibe nke ụlọọrụ dị n’ime obodo rụpụtara tinyere na o nwereike ibu ogbunigwe ruru 1,500kg.

    N’aka nke ọzọ, ndịagha Ịran kwuru na ha wakporo ogige ndịagha Ali al-Salem dị na Kuwait nakwa ngwaagha ime mmiri mba Amerịka dị n’osimiri mba Indịa.

    Gụọ akụkọ ndị ọzọ ebe a:

    Ogbunigwe mba Ịran ji wakpo Izrel

    Ebe foto si, Getty Images

  14. O bụghị eziokwu na mmadụ chọrọ itinye nsi na nri Onyeisala Tinubu - Ụlọọrụ Onyeisiala

    Onyeisisala Naịjirịa bụ Bola Tinubu

    Ebe foto si, Bayo Onanuga / X

    Nkọwa foto, Onyeisisala Naịjirịa bụ Bola Tinubu

    Ụlọọrụ Onyeisiala Bola Tinubu ekwuola n’ihe onyonyo ahụ na-efegharị gbasara na e nwere onye chọrọ itinye Tinubu nsi na nri ya bụ akụkọ ụgha.

    Na nsonso a, ihe onyonye fegharịrị n' ịntaneti na e jidere otu onye n’ime ndị na-esi nri n' obi ọchịchị Naịjrịa chọrọ itinye nsi na nri Onyeisiala Tinubu ga-eri.

    N’onyonyo ahụ, a kọwara na a nwụchiela ma na-eme nnyocha onye ahụ chọrọ itinye nsi na nri Tinubu.

    Mana ọnụ na-ekwuru Onyeisiala bụ Bayo Onanuga kwuru n'ozi o wepụtara ozi n' ọbaozi X ya sị, “O nweghi onye na-arụ na ebe a na-esi nri na obi ọchịchị Naịjirịa ejidere. O nweghị onye n’ime ndị na-esi nri na obi ọchịchị Naịjrịa chọrọ itinye nsi na nri Onyeisiala Tinubu”

    Gụọ akụkọ ndị ọzọ ebe a:

  15. Izrel na ndị Hezbollah nọ na Lebanon akwarịtala onwe ha mgbọ, dịka a wakpochara Ịran

    Izrel na ndị Hezbollah nọ na Lebanon akwarịtala onwe ha mgbọ, dịka a wakpochara Ịran

    Mba Izrel na ndị otu Hezbollah nọ na Lebanọn agaala n’ihu na-akwarịta onwe ha mgbọ dịka ọgbaaghara dị n’Ịran kawanyere njọ.

    Otu nchekwa Israel Defense Forces agwala ndị bi n’ime obodo karịrị iri ise na Lebanọn ka ha kwapụ dịka otu Hezbollah nke Ịran na-akwado tụchara ogbunigwe rọket n’Izrel.

    Na mbụ ka ụlọọrụ US Central Command kwuru na e gbuola ndịagha Amerịka atọ n’ihu agha ebe ise ndị nke ọzọ nwetara “nnukwu mmerụahụ” dịka Donald Trump dọrọ aka na ntị na “e nwereike inwekwu” ndị Amerịka ga-ezute ọnọdụ ọjọọ.

    Izrel ekwela nkwa ịmụbawanye mwakpo ha na-eme n’Ịran, dịka Trump kwuru na agha ndịagha Amerịka na-ebu nwereike iwe ọtụtụ izuụka.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

    Mịnịstrị nchekwa mba Brịten kwuru na ogige ndịgaha Briten dị na Cyprus bụ nke e lekwasara anya tụọ “ogbunigwe droonu a na-enyo enyo” n’abalị Sọnde.

    Ọnụahịa mmanụ rịrị elu oge ahịa mepere na mba Asia n’ụbọchị Mọnde, dịka a gara n’ihu na-akagbu njem, ma mechie ihu igwe gburugburu mpaghara Gulf.

  16. Igbo ndị ọma, ụnụ asaala chi?

    Anyị ji obi aṅụrị anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Mọnde 2 Maachị, 2026.

    Ọfọ anyị bụ ka ọnwa ọhụrụ a mịtara gị ezi mkpụrụ.

    Sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ndị gbara ọkpụrụkpụ si Naịjirịa, Afrịka na mbaụwa niile.

    Sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ anyị maka akụkọ, foto na onyonyoo dị iche iche ga-amasị gị.

    Nnọọ!

  17. Otu ndị katọlik Bishọpụ na Naịjirịa akpọla okwu ka gọọmenti bilite n’ụra

    Otu ndị Bishọpụ na Naịjirịa toro onyeisiala Tinubu ike maka ọrụ ndị ọ na-arụ ma gwa ya ka ọgba mbọ ọfụma ihe n'ihe gbasara nchekwa kwụsịrị

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Otu ndị Bishọpụ na Naịjirịa toro onyeisiala Tinubu ike maka ọrụ ndị ọ na-arụ ma gwa ya ka ọgba mbọ ọfụma ihe n'ihe gbasara nchekwa kwụsịrị

    Ọgbakọ ndị Bịshọp ụka Katọlik na Naịjirịa akpọọla onyeisiala Naịjiria bụ Bola Tinubu ka ome ihe ngwa ngwa gbasara ọnọdụ nchekwa na-akwanye njo n’ihi na ọtụtụ ihe emebiela.

    Ha kpọrọ oku a oge ha mere nzukọ nke mbụ ha nke malitere na-abalị iri na itolu ruo abalị iri abụọ na isii nke ọnwa Febụwarị afọ 2026 na Abuja.

    Ha bere akwa arịrị n’ogbugbu a na-egbu ndị mmadụ karịsịa ndị okpukperechi ụka nakwa alakụba.

    N'akwụkwọ akụkọ ha wepụtara nke onyeisioche otu a bụ Lucius Iwejuru Ugorji nakwa Donatus Ogun Osa, onye odeaakwụkwọ otu a binyere aka, otu ndị Bishọpụ rụtụrụ aka na mbibi nakwa ogbugbu ndị na-eyi ọha egwu nke alakụba gburu ndị mmadụ n’obodo Woro na Nuku nke ndị na Kwara ebe ihe karịrị narị abụọ nke gunyere ndị ụka na alakụba nwụrụ.

    Ha kọwara obi nwute ha maka na ndị na-akụ ọrụ ugbo anaghị enwe ike ịbanye na ọrụ ụgbọ ha ma wepụta ihe ndị mmadụ ga-eri n’ihi na ha na-atụ ụjọ na-enwere ike igbu ha maọbụ tụrụ ha. Ụmụakwụkwọ sokwa na ndị ihe a na-emetụta.

    Nke kachasị ewe otu ndị Bishọpụ a iwe bụ na ndị ekperima na ndị omekome na-eme ihe na-akpa mkpa mkpa n’ihu mbara elụigwe na-enweghị ndị na alụsị ha ọgụ maọbụ gbochie ha.

    Ha nyere ndụmọdụ ka gọọmenti na mpaghara nile tinye mbọ ha n’ịzụta teknuzu iji enyocha ebe nile ma mee ka usoro eji enweta ozi ọrụ sikwuo ike.

    Ndị otu Bishopụ rịọrịọ gọọmenti arịrịọ ka ha hu na ndị ọbụla ejidere na-eyị ọha egwu ga-ata ahụhụ dịrị ha dịka iwu Naịjirịa kwudobere.

    Ha gara n’ihu kwuo maka mkpa ọ dị ihu na usoro eji eme ntuliaka bụ nke dooro anya

    Iji gbochie mpụ na aghugho ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-eme oge ntuliaka.

  18. A tọrọla nna onye bụbu osote gọvano Ebonyi steeti

    Ndị ntọ ji ọgbatumtum gbochie ụzọ dịka Francis Igwe ji ụgbọala ya na-agba n’ụzọ ebe ọ na-aga ụlọụka

    Ebe foto si, Ada Oraedo/SA, Media

    Nkọwa foto, Ndị ntọ ji ọgbatumtum gbochie ụzọ dịka Francis Igwe ji ụgbọala ya na-agba n’ụzọ ebe ọ na-aga ụlọụka

    Ndị uweojii n' Ebonyi steeti ekwuola na ndị ọjiegbe a na-amaghị ndị ha bụ atọrọla nna Kelechi Igwe , bụbu Osote Gọvanọ Ebonyi steeti ma bụrụkwaeze na-achị obodo Ndufu-Alike.

    A tọọrọ Francis Igwe n’ọtụtụ ụbọchị ụka nke mbụ n’ọnwa Maachị na n' Okpuru Ọchịchị ime obodo Ikwo dị n' Ebonyi steeti mgbe ọ nọ n’ụzọ aga ụlọụka.

    Dịka ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ bụ Joshua Ukandu si kwuo, a malitela inyocha iji napụta Eze ahụ a tọọrọla ma chọpụta ndị mere ya.

    Ndị hụrụ ihe mere kọwara na ndị ntọrị mmadụ ahụ ji ọgbatumtum gbochie ụzọ dịka Eze Francis Igwe ji ụgbọala ya na-agba n’ụzọ, ma kpọrọ ya tinye isi ebe ndị mmadụ na-amabeghị.

    Gọvanọ steeti ahụ bu Francis Nwifuru Ogbonna enyeela ndị nchekwa nọ na steeti iwu ka ha napụta Francis Igwe.

    Onyeisioche ọchịchị ime obodo Ikwo, Sunday Nwankwo sị na ya na ndị uweojii na-arụkọta ọrụ ọnụ iji hụ na a zọpụtara Francis Igwe, nna onye bụbu osote gọvanọ steeti ahụ.

    Gụọ akụko ndị ọzọ ebe a:

  19. E gbuola ihe karịrị mmadụ puku ma tụrụ ọtụtụ mmadụ na Naịjirịa kemgbe ọnwa abụọ - Peter Obi

    Na nso nso a ndị omekome amaghị ndị ha bụ wakporo Peter Obi dịka ọ gara Edo steeti maka emume nnabata Akpata na pati ADC

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Na nso nso a ndị omekome amaghị ndị ha bụ wakporo Peter Obi dịka ọ gara Edo steeti maka emume nnabata Akpata na pati ADC

    Onye ji labour pati zọọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka afọ 2023 Peter Obi ekwuola n’ihe karịrị mmadụ puku anwụọla dịka a tụrụla ọtụtụ site n’ọnwa Jenụwarị ruo Febụwarị afọ 2026.

    N’ozi ọ wepụtara n’obaozi ya bụ X, Obi sị na ihe ike na-eme na Naịjirịa akawanyela njọ karịa mba ndị nọ na agha.

    O boro ndị ọchịchị ebubo ịtụgharịrị ndị mmadụ azụ ma tinye uche obi ha na ndọrọndọrọ ọchịchị nke afọ 2027 kama ị chọ etu ha ga-asi echekwebe ndị Naịjirịa.

    “Ọ bụ ihe na-enye nsogbu na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị dịka anyị tinyere obi na ume anyị na ntuliaka nke afọ 2027 ma chefuo ihe gbasara ọnọdu nchekwa ebe sọsọ ọnwa abụọ n’afọ 2026 ndị mmadụ ruru otu puku anwụọla dịka a tụrụ ọtụtụ”

    “Otụtụ ezinaụlọ na Zamfara, Kwara, Ondo, Kebbi, Edo, Benue, Adamawa, Plateau nakwa ndị ọzọ eliela ndị ha hụrụ n'anya ebe ụfọdụ ndị obodo agbapụla n’obodo ha nyere ụjọ”

    Onye bụbu gọvanọ Anambra steeti boro ebubo na ndị na-eyi ọha egwu awakpola ihe ruru steeti iri abụọ na ise na Naịjirịa mana ndị ọchịchị emegeghị ihe gbara ọkpụrụkpụ gbasara ya.

    Guọ ọzọ ebe a:

  20. Ayatolla Khamenei: Ndị ngagharịiwe ataala isi mmadụ itoolu na Pakistan

    Ndị na-eme ngagharịiwe  wakporo Ụlọnnochite Amerịka na Karachi, Isiobodo Pakistan

    Ebe foto si, Reuters

    Mmadụ itoolu nwụrụ, ebe o pekata mpe mmadụ 32 merụrụ dịka ndị na-eme ngagharịịwe na mba Pakistan wakporo ụlọ nnochite mba Amerịka nadị n'isiobodo ha bụ Karachi iji gosi iwe ha banyere mwakpo tara isi Ayatola Khamenei, onye ndu ndị Ụka Alakụba nke mba Iran.

    Gọọmentị mba Uk enyela ozi ịdọ aka na ntị nye ụmụamaala ha nọ na mba Pakistan ka ha welata aka na ị gbagharị n'ihi ọgbaghara ahụ. Ndị na-akwado mba Iran malitere ngagahrịiwe na mpaghara dị iche iche ebe ndị alaka ụka Alakụba a kpọrọ Shia bụ ndị na-akwado ọchịchị Iran nọ.

    Ọtụtụ n'ime ha zọrọ gaa Lahore ebe Ụlọnnochite Amerịka dị.

    Mwakpo Amerịka na Izrel na-eme n'Iran mere Pakistan na-adọli ị hụ na o nw ha emekụtaghị mmekọrịta ha na Donald Trump nwere na nkwado ha nwere nye ịran.

    Miniista na-ahụ maka mmekọrịta Pakistan na mba dị ozọ katọburu ihe ọ kpọrọ 'mwakpo enweghị ihe kpatara ya megide Iran'.