Ụlọikpe eyigharịala ikpe Nasir El-Rufai maka ebubo ụlọọrụ DSS boro ya

Ebe foto si, Nasir El-Rufai/Facebook
Ọkaikpe Joyce Abdulmalik nke ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja eyigharịala ikpe Nasir El-Rufai bụbu gọvanọ Kaduna steeti maka ebubo atọ ụlọọrụ DSS boro ya nke gụnyere igere oku ekwenti NSA Nuhu Ribadu na nzuzo.
Cheta na ụlọikpe kwuburu na ọ bụ n'ụbọchị Wenezde 25 Febụwarị ka ha ga-anụ ikpe ahụ mana El-Rufai abịaghị ụlọikpe maka na ụlọọrụ Independent Corrupt Practices and Other Related Offences Commission (ICPC), ka ji ya maka nnyocha ebubo nrụrụaka ya.
Ọ bụ nke a mere ka ụlọikpe ahụ yigharịa ikpe n'ụbọchị Tọzde 23 Eprel, 2026.
El-Rufai akpụpụla ụlọọrụ ICPC ụlọikpe maka ebubo ịwakpo ụlọ ya dị n'Abuja

Ebe foto si, Nasir El-Rufai/ Facebook
Onye bụbu Gọvanọ Kaduna Steeti bụ Nasir El-Rufai, etinyela akwụkwọ mkpesa maka mmejọ ikike ya nke ọnụego ya ruru otu ijeri naịra megide ụlọọrụ na-ebu agha megide nrụrụaka na mpụ ndị ọzọ yiri ya bụ ICPC maka ebubo mwakpo ụlọ ya dị n'Abuja n'ụzọ iwu na-akwadoghị.
Dịka ụlọmgbasaozi mpaghara siri kọọ, El-Rufai, site n'aka ndị ọkaiwu ya nke Oluwole Iyamu na-edu, na-agbagha izi ezi nke akwụkwọ ikike ịchọ ihe e nyere n'abalị anọ nke ọnwa Febụwarị site n'aka Onyeisi Ụlọikpe Maji dị n'isi obodo Abụja, nke e depụtara dịka onye na-azara ọnụ ya nke abụọ n'ụlọikpe ahụ.
Onye ahụ bụbu Gọvanọ gbara ụlọọrụ ICPC akwụkwọ dịka onye mbụ ga-azara ọnụ ya, ebe a kpọrọ onyeisi ọkaikpe nke Ụlọikpe Maji dị n'Abụja; Onyeisi ndị uweojii 'Inspector-General' nke Naịjirịa na ọkaiwu kachasị na Naịjirịa 'AGF' dịka ndị ọzọ ga-azara ọnụ ha dịka mmadụ nke abụọ ruo nke anọ dịka e siri depụta ha.
N'akwụkwọ ikpe nke Iyamu dere ma tinye n'ụlọikpe n'abalị iri abụọ nke ọnwa Febụwarị, ka El-Rufai rịọrọ ụlọikpe maka enyemaka asaa.
Ọ gwara ụlọikpe ka o kwupụta na akwụkwọ ikike ịchọ ihe nke ụlọọrụ ICPC jiri chọọ ihe ma jidekwa ihe n'ụlọ ya abụghị eziokwu.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ọ gwakwara ụlọikpe ka ha kwupụta akwụkwọ ikike ịchọ ihe ahụ dịka ihe "abaghị uru n'ihi enweghị nkọwa kpọmkwem, mmejọ ide ihe, mgbagwoju anya banyere etu a ga-esi mmezu ya, oke ibu, na enweghị ihe kpatara ya, nke a mere ka ọ bụrụ nnyocha iwu na-akwadoghị na nke na-enweghị isi nke megidere nkeji nke iri atọ na asaa (37) nke Iwu Naịjirịa."
Onye ahụ bụbu Gọvanọ rịọkwara ụlọikpe ka o kwupụta na mwakpo na ịchọgharị ihe n'ụlọ ya dị n'Abuja, n'abalị iri na itoolu nke ọnwa Febụwarị n'ihe dịka elekere abụọ nke ehihie, nke ndị ọrụ ICPC na ndị uweojii mere, "n'okpuru akwụkwọ ikike na-adịghị mma, bụ mmebi iwu nke ikike dịrị mmadụ nke onye na-arịọ arịrịọ maka ugwu mmadụ, nnwere onwe, ikpe ziri ezi, na ikike nzuzo dịka nkeji nke 34, 35, 36, na 37 nke Iwu Naịjirịa si dị."
Ọ gwakwara ụlọikpe ka ha kwupụta na "ihe akaebe ọ bụla e nwetara site n'akwụkwọ ikike na-adịghị mma na ịchọ ihe na-ezighi ezi bụrụ ihe agaghị anabata n'ụlọikpe ọ bụla megide ya, n'ihi na e nwetere ya n'ụzọ megidere iwu."
El-Rufai kwuru na otu ijeri naịra ọnụegu mkpesa ahụ gụnyere "nde naịra atọ dịka ụgwọ maka mmerụ ahụ uche, nsogbu mmetụta uche, na ufu ufu nke nchekwa onwe onye;
Nde anọ bụ maka mmebi ihe iji gbochie mmejọ n'ọdịnihu site n'aka ndị mmanye iwu ma kwado ikike onye na-arịọ arịrịọ.
Nde naịra atọ bụ maka mmebi ihe maka omume obi ọjọọ, aka ike na mmegbu gụnyere iji akwụkwọ ikike adịghị mma."
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ chọkwara otu nde naịra maka ego ole o nwere ya iji itinye akwụkwọ mkpesa ahụ, gụnyere ụgwọ iwu na mmefu ndị metụtara ya.
ICPC ekwuola na El-Rufai nọ n'ụlọọrụ ha

Ebe foto si, Mallam Nasir El-Rufai / x
Ụlọọrụ na-ebu agha megide nrụrụaka na Naịjirịa bụ 'The Independent Corrupt Practices and Other Related Offences Commission' (ICPC) ekwuola na Nasir El-Rufai nọ n'ụlọọrụ ha.
Onyeisi mgbasaozi ụlọọrụ ahụ bụ John Odey kwuru na El-Rufai bụbụ gọvanọ Kaduna steeti ka nọ n'ụlọọrụ ha mgbe ha mechiri ọrụ n'ụbọchị Wenezde maka nnyocha na-aga n'ihu nke ha na-enyocha ya.
"ICPC na-ekwupụta na Malam Nasiru El-Rufai, onye bụbu gọvanọ Kaduna steeti nọ n'ụlọọrụ anyị ka anyị mechiri ọrụ n'ụbọchị Wenezde abalị iri na asatọ nke ọnwa Febụwarị maka nnyocha nke na-aga n'ihu."
ICPC enyeghị nkọwa gbasara ụdị nnyocha ha na-eme El-Rufai.
Nwuchi ya n'abịa dịka ụlọọrụ nchekwa Naịjirịa na-ebo ebubo ịkpa nkata gere mkparịtaụka NSA na nzuzo,.
Cheta na ụbọchị Fraịde gara aga, El-Rufai kwuru n'ụlọọrụ ICPC nyere ya akwụkwọ ịkpọ oku nke onye ọkaiwu ya zaghachiri na ọ ga-abịa ụbọchị Wenezde.
Abalị atọ gara aga, El-Rufai ga kwara ụlọọrụ na-ebu agha megide nrụrụka ego dị n'Abuja.
Ụbọchị ole na ole gara aga, ndị nchekwa DSS chọrọ inwuchi El-Rufai n'ọdọụgbọelu Nnamdi Azikiwe dị n'Abuja dịka o si njem o mere n'Ijipt na-abata.
El-Rufai rahụrụ n'ụlọọrụ EFCC mgbe ọ gara ịza ajụjụ dị ka ndị nchekwa DSS na-eche ịkpụrụ ya

Ebe foto si, Nasir El-Rufai/ Facebook na EFCC/Facebook
Nasir El-Rufai bụbu Gọvanọ Kaduna steeti arahụla otu abalị n'ụlọọrụ ndị na-ebu agha megide mpụ na nrụrụaka ego bụ 'Economic and Financial Crimes Commission' (EFCC).
EFCC jichiri El-Rufai mgbe ọ bịara ịza oku a kpọrọ ya n'isi ụlọọrụ ha dị n'Abuja.
A na-ebubo El-Rufai ebubo mpụ na nrụrụaka ego karịrị narị ijeri naịra anọ na ụma (N432bn) nke EFCC na-eme nnyocha maka ya.
E mere ka ndị ntaakụkọ mara na ebobo nrụrụaka ahụ bụ ụlọ omeiwu Kaduna steeti boro ya.
Ha sị na ọchichi ya tinyere Kaduna steeti n'iji oke ụgwọ mgbe ọ bụ Gọvanọ nakwa ebubo ndị ọzọ dị icheiche.
Ọnụ na-ekwuru EFCC kwuru na ọ bụ eziokwu na El-Rufai nọ n'ụlọọrụ ha ịza oku ha kpọrọ ya mana okwughị ihe ọzọ banyere udiri ajụjụ a na-agba ya.
N'aka nke ọzọ, a chọpụtara na ụlọọrụ ndị uweojii nzuzo bụ Department of security Services (DSS) na-echere ka El-Rufai pụta n'aka ndị EFCC ka ha kpụrụkwa ya.
DSS na-eme nnyocha n'isi El-Rufai maka ebubo igere ihe Nuhu Ribadu na-ekwu n'ekwentị n'ụzọ ha sị megidere iwu Naịjirịa.
Dịka EFCC na-agba El-Rufai ajụjụ ọnụ maka mpu na nrụrụaka, gọọmenti etiti gbara ya akwụkwọ n'ụlọikpe dị elu na-ebo ya ebubo igere mkparịtaụka Nuhu Ribadu bụ onye ndụmọdụ pụrụiche nke Onyeisiala Naịjirịa n'ụzọ megidere iwu.
Gọọmenti akpụpụla Nasir El-Rufai ụlọikpe maka igere mkparịtaụka ekwentị NSA na nzuzo
Gọọmenti Naịjirịa akpụpụla Malam Nasir El-Rufai ụlọikpe maka igere mkparịtaụka ekwentị NSA na nzuzo.
Akwụkwọ ikpe ahụ nke ọkaiwu Deji Adeyanju wepụtara n'akara Facebook n'ụbọchị Mọnde 16 Febụwarị, 2026, mere ka o doo anya na ọ bụ n'ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abuja ka a kpụpụrụ El-Rufai.
Akwụkwọ ikpe kwuru na El-Rufai na ndị ya na ya so kpaa nkata igere mkparịtaụka NSA ahụ na nzuzo, kpara agwa megidere iwu Naịjirịa.

Ebe foto si, Deji Adeyanju/Facebook

Ebe foto si, Deji Adeyanju/Facebook
Nuhu Ribadu azaghachila El-Rufai maka ebubo na e bubatara nsi na Naịjirịa

Onye ndụmọọdụ pụrụiche na nchekwa bụ Malam Nuhu Ribadu, azaghachila Nasir El-Rufai bụbu gọvanọ Kaduna Steeti maka ebubo na e bubatara nsi na Naịjirịa.
Cheta na akwụkwọozi El-Rufai wepụtara n'akara soshal midịa ya, boro ụlọọrụ Ribadu ebubo ma kwuo na ha bubatara kemịkal a kpọrọ 'thallium sulphate' ruru kilogram 10 na Naịjirịa nke ha zụtara na mba Poland.
Akwụkwọ ozi ahụ bụ nke El-Rufai degaara ụlọọrụ Nuhu Ribadu, bụ nke o kwuru na ọ chọrọ ka ụlọọrụ ya kọwaara ndị Naịjirịa niile etu ha si zụta kemịkal ahụ nke El-Rufai kwuru na ọ bụ ihe nwereike ichere ahụike ọhanaeze aka mgba.
Na nzaghachi ha, ozi ụlọọrụ Nuhu Ribdau wepụtara nke Ọchịagha OM Adesuyi binyere aka na ya, gọnarịrị ebubo ahụ ma gwa El-Rufai ka o nye ụlọọrụ DSS ihe akaebe ya n'ebubo ahụ ka ha jiri ya mee nnyocha.
Ọchiagha Adesuyi kwuru na ụlọọrụ DSS ga-akpọ ndị niile aka ha dị n'ebubo a ka ha wetakwa ihe akaebe ga-enyere aka na nnyocha ha ga-eme iji chọpụta nke bụ eziokwu.
Ihe mere ekweghị m iso ndị ọrụ nchekwa chọrọ inwuchi m - El-Rufai
Onye bụbu gọvanọ Kadunna steeti bụ Nasir El-Rufai akọwala ihe mere mgbe ndị nchekwa bịara inwuchi ya n'ọdọụgbọelụ Nnamdi Azikiwe nke dị n'Abuja mgbe o si njem ọ gara na mba Ijipt.
Ọ gwara BBC na obere arụmarụka dapụtara n'etiti ya na ndị nchekwa ahụ mgbe ha gwara ya soro ha ga n'ụlọọrụ ha ka ha gosi ya akwụkwọ nyere ha ikike inwuchi ya mana ha ejighị akwụkwọ ọbụla.
"Dịka m si ụgbọelu na-apụta, otu nwa ntoroọbịa bịakwutere m wee gwam na ha si ụlọọrụ nchekwa DSS, na ha chọrọ ihu m n'ụlọọrụ ha. A gwara m ha na m chọrọ ihu akwụkwọ ikike. Mana ha si na ha ga-enye m akwụkwọ"
El -Rufai gara n'ihu kwuo na "mgbe m pụtara n'ọdọụgboelụ, ndị isi DSS ahụ bịakwara gwa m otu ihe ahụ na ha chọrọ ihu m n'ụlọọrụ ha. A gwara m ha ka ha 'enye m akwụkwọ'. Ụlọ obibi m nọketere ụlọọrụ unu, ya bụrụ na ọ bụ DSS, m ga-aga n'ụlọ. Ya bụrụ, na ijighị akwụkwọ inwuchi m ugbua, wetara m ya ebe obibi m, ịgaghị egbochi m n'ọdọụgbọelu"
Ọ kọwara na ọ dịka omume ahụ ndị nchekwa mere dịka mgbalị imebi ugwu mmadụ nke iwu obodo Naịjirịa anabataghị. Dịka o si kwuo, ụjọ egbochighị ya ịchụpụ ndị nchekwa bịara inwuchi ya.
"O nweghị onye m na-atụ ụjọ ma ọbụghị Chineke. Kemgbe ọgụ afọ ana m eso gọọmenti arụ ọrụ, a gwaala m onye ọ bụla nwere ihe ọ bụla, onye ọ bụla kwuru na o nyere m ego maọbụ na m rịọrọ ya ego maọbụ na enwere m akụnụba ọ bụla m na-ejighị ọsụsọ m nweta, pụta kwuo na abụ m onye ụgha"
El-Rufai sị na kemgbe afọ abụọ na ọkara ụlọọrụ na-ahụ maka mpụ gbasara ego na akụnụba EFCC na ICPC nọ na-enyocha ndị rụrụ orụ mgbe ọ nọ n'ọchịchị mana enweghị ihe ha chọpụtara.

Ebe foto si, El-Rufai/Instagram
El-Rufai: Mbọ ndị ọrụ nchekwa gbara inwuchi ya megidere iwu - Ọkaiwu Ubong Akpan

Ebe foto si, Mallam Nasir El-Rufai / x
Ubong Akpan bụ ọkaiwu Mallam Nasir El-Rufai ekwuola na etu ndi ọrụ nchekwa si chọọ inwuchi Gọvanọ chiburu Kaduna steeti megidere iwu Naịjirịa.
Ọkaiwu Akpan mere ka a mata nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara ebe ọ kọwara ihe mere.
Ọkaiwu Akpan sị na "ndị ọrụ nchekwa chọrọ inwuchi El-Rufai oge o si Cairo, isi obodo mba Ijipt bata n'Abuja ma kọwa ya dịka ihe megidere iwu kwadoro ikike dịrị mmadụ".
Ọ kọwara na ụlọọrụ gọọmentị na-ebu agha megide mpụ na nrụrụaka bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) wetere ozi ka Malam El-Rufai bịa zara ọnụ ya n'ebubo dị icheiche n'oge El-Rufai nọ na mba ofesi, mana ya agwala EFCC na El-Rufai ga-abịa mgbe ọbụla ọ laghachitere na Naịjirịa.
"Anyị gwara EFCC na ọ ga-abịa n'ụlọọrụ ha n'elekere iri, n'ụbọchị Monde, February 16, 2026".
Ọ sị na "mgbe El-Rufai laghachitere Naịjirịa, ka ndị ọrụ uweojii nzuzo Naịjirịa bụ Department of State Services gara ịkpụrụ ya na-ejighị akwụkwọ ikike ọbụla".
"Mgbe El-Rufai gwara ha gosi ya akwụkwọ nyere ha ikike maọbụ akwụkwọ ha ji si ya bịa n'ụlọọrụ DSS mana enweghị onye n'ime ha nwere ya".
Ọkaiwu Akpan gbakwụnyere na "Ndị ọrụ nchekwa ahụ napụkwara El-Rufai akwụkwọ njem paspọt ya".
Ihe dapụtara dịka ndị ọrụ nchekwa gbalịrị ịkpụrụ aka chiburu Kaduna steeti

Ebe foto si, Mallam Nasir El-Rufai
Akụkọ na-eru anyị ntị na-ekwu na ndị ọrụ nchekwa gbalịrị ịkpụrụ aka chịburu Kaduna steeti bụ Mallam Nasir El-Rufai taa n'ọdọụgbọelu dịka o si njem o mere gaa Ijipt abata.
Dịka ọnụ na-ekwuru ya bụ Muyiwa Adeleke sị gbaa n'ama n'ozi o wepụtrara n'akara ya n'ọbaozi X n'ehihie Tọzde, El-Rufai jụrụ iso ka dịka ọ jụrụ ha ase akwụkwọ gosiri na ha kpọrọ ya oku.
Ozi ahụ sịrị,"Ndị nchekwa nwara ịnwụchị Mallam Nasir Elrufai dịka o si Cairo febata."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1

Ebe foto si, Mallam Nasir El-Rufai / x
Ọ gara n'ihu kwuo na ha napụrụ nna ya ukwu akwụkwọ njem ya oge mbọ ha amịtaghị mkpụrụ.

Ebe foto si, Muyiwa Adekeye/X
Cheta na El-Rufai mere njem ofesi kemgbe ọnwa Novemba afọ 2025 nke mere ka ụfọdụ chee na ọ gbara ọsọ.
Mana ọ gbara ama ụbọchị Wenezde na ya na-abata.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Na-agbanyeghị na a na-eche na El-Rufai so na ndị kwadoro Onyeisiala Bola Tinubu inweta ọkọlọtọ ịzọ ọkwa Onyeisiala n'aha APC n'afọ 2023 mana mmadụ abuọ ahụ adịghịkwa na mma.
Tinubu họpụtaburu El-Rufai dịka Minista mana Ụlọomeiwu akwadoghị nhọpụta ahụ.


































