Adịghị m ime, nke m na-akwado ịlụ Lucky Oparah - Eucharia Anunobi

Eucharia Anunobi na Lucky Oparah

Ebe foto si, Lucky Oparah

Onye ihe ejije a ma ama bụ Eucharia Anunobi akatọọla kepukepu fegharịrị na nso nso a nke kwuru na ọ na-akwado ịlụ nwaokorobia o ji afọ 20 tọọ.

Akụkọ fegharịrị na soshal midia na nsonso a boro ebubo na Anunobi ha sị gbara afọ 57 na-ayị, ma na-akwado ịlụ Lucky Ọparah gbara afọ 27 bụ onye na-etolite etolite n'ihe ejije Nollywood.

Ụfọdụ akụkọ ahụ fegharịrị boro ebubo na Opara atụnyelarịị Anunobi ime.

Mana n'ihe onyonyo o wepụtara na nsonso a n'akara Youtube ya, Eucharia Anunobi kwuru na akụkọ ndị a niile bụ "nkonukọ na okpotokpo asị si ọkụ ala mmụọ".

O kwuru n'ezie na ya ma Lucky Oparah bụ onye ya na ya zutere n'ihu ọrụ ime ejije bụ ebe o mere agwa nne ya.

O kwuru na aka ọrụ ya tụrụ nwaokorobịa ahụ n'anya nke mere ka ọ bịa rịọ ya ga ya na-agbaziri ya ụzọ.

O kwuru na dịka ndị mmadụ na-eme dịka ha hụ onye ezinaụlọ ha maọbụ onye nwere agba, ha na ya ese foto na onyonyo, tinye n'aka ọbaozi ha, na Oparah ji ekwentị ya see foto na ihe onyonyo o tinyere n' ọba ozi ya nke ndị ọ kpọrọ "ndị obi ọjọọ" were gaa na-ekesa akụkọ ụgha banyere ha.

Eucharia Anunobi na Lucky Obara

Ebe foto si, Eucharia Anunobi

Ọ sịrị: "Achọrọ m ịgwa ndị ezinaụlọ m nile, ndị hụrụ n'anya, ndị enyi ,ndị na-eso m, ndị isiụka na ndị ụkọchụkwụ, na akụkọ ndị a nile bụ nkonukọ na okpotokpo asị si ọkụ ala mmụọ".

" Achọrọ m iji ohere kwuo gbowam na mụ na Lucky Oparah anaghị ayị ,nke a enwe agbam akwụkwọ ọbụla a na-akwado."

"Ọ bụ mkparị nye ọkpụkpọ Chukwu kpọrọ m ndị ọbi ọjọọ a sị na m dị ime na-alubeghị di dịka onye bụ 'apọstle.'"

"Onye ọbụla ma m ma makara maka ọrụ dịka onye ụkọchukwu ma na m na-ekwugide ụd̄ị ihe a."

Anunobi kwuru na ndị fesara akụkọ ahụ ghakwara ụgha banyere afọ ole ya dị dịka ha sị na ọ dị agbata afọ 56 na 57, ma kwuo na ekpere ya bụ na ya ga-adị ndụ rue afọ ole ndị a nile ha sị ya dị.

Eucharia na Lucky Oparah

Ebe foto si, Eucharia / Lucky Oparah

O kwuru na ndị kwuru na ya adịla ime na alụbeghị kpụrụ ọkpụkpọ Chineke kpọọ ya dịka ụkọchukwu n'ala dịka ya na-ekwugide ndụ luru inyi mgbe ọbụla.

" Ọ bụkwa ihe ịkpa ọchị na ndị a obi ha gbagọrọ agbagọ nyere m afọ ole abụghị nke m."

"Ụfọdụ sị na adị m afọ 56, ụfọdụ sị na m dị 57."

"Ikekwe, ụfọdụ ga-apụta sị na m dị afọ 120."

"N'ezie, ama m Lucky Oparah, Ọ bụ onye m na-agbaziri ụzọ(mentee)."

" Mụ na ya zutere na-ebe anyị na-eme ihe ejije."

"Etu m si eme ihe ejije tụrụ ya n'anya nke mere ka ọ bịa rịọ m ka m na-agbaziri ya ụzọ."

Lucky Oparah na Eucharia Anunobi

Ebe foto si, Lucky Oparah na Eucharia Anunobi

Ọ gara n'ihu kọwaa na dịka ndị mmadụ na-ese foto maọbụ onyonyo ndị ezinaụlọ ha, ndị enyi, ndị ama ama, na "Lucky sere foto na ihe onyonyo mụ na ya oge anyị nọ n'ihu ọrụ tinye ya n'aka ọbaozi ya, ọ bụ ya ka ndị iro, ndị iro nwe ha gbakọtara tinye dịka ihe gosiri akụkọ ụgha ha"

Ọ gara n'ihu boo "ndị kpọrọ ya asị" ebubo idepụta ma kesaa akụkọ ụgha ahụ sị na kama imegide ya, na o mere ka aha ya dawa ụda karịa ka ọ dị na mbụ na Naijiria nakwa ụwa nile dịka ọtụtụ ndị mmadụ na otu nwere agba na-akpọ ya n'ekwentị ịmata nke bu eziokwu.

Ihe i kwesịrị ịma maka Eucharia Anunobi

Eucharia Anunobi

Ebe foto si, Lucky Oparah

  • Eucharia Anunobi bụ onye ejije Nollywood a ma ama.Ọ gbara afọ 47, dịka a mụrụ ya n'ụbọchị 25 nke ọnwa Mee, 1965.
  • Nwaada Anunobi na-emepụtakwa ejije ma bụrụkwa onye ozi ụka Kraịst.
  • Ọ bụ onye Ahịazụ, Mbaise, Imo steeti ma gụọ akwụkwọ na mahadum Institute of Management and Technology nke Enugwu nakwa mahadum Naịjirịa nke Nsukka.
  • Ọ natara ọzụzụ na ngalaba mgbasaozi nakwa asụsụ Bekee bụ English Language.
  • Ọha matara ya n'oge gara aga maka agwa ọ kpara n'ejije ochie bụ 'Abuja Connection', 'Letters to a Stranger' nakwa 'Glamour girls'.
  • Ọnọdụ ahụike nke ọbara bụ 'Sickle Cell Anaemia' dulara nwa ya nwoke Raymond mmụọ n'afọ 2017.
  • N'afọ 2020, a họpụtara ya na ndị ga-erite ihe nrite nke onye enyemaka kacha mma n'ejije (Best supporting Actress in a movie or TV Series) n'emume ndị ejije Nollywood bụ AMVCA.

Ihe i kwesịrị ịma maka Lucky Oparah

Lucky Oparah

Ebe foto si, Lucky Oparah/Instagram

  • Lucky Oparah bụ onye ejije na-etolite etolite na Nollywood.
  • O sonyela n'ihe ejije gụnyere; 'My Father’s Name', 'The Royal Maid', 'A Drop of Tears', 'Mother and Child'.