Nigerian Foods: Lee uzọ iri ị ga-esi sie akpụ gị ka ọ bụrụ dachịị

Ebe foto si, Matse Cooks/Ntanta Delicacies
- Onye dere ya, Chioma Obianinwa
- Ndị mere akụkọ a, Senior Broadcast Journalist, Igbo
Ọ karịala afọ narị ise gara aga akpụ batara Afịrịka, ma turuzie ugo n'ala Igbo.
Ọ bụ nri na-enye ọtụtụ ndị na-eri ya ume.
A sị na onweghị ụzọ isi jewe Ọnicha ọ dị mfe mana nke a abụghị maka akpụ, makana ma onye ukwu ma onye nta ga-egotenwu, ga-esinwu ya ma na-erinwu ya.
Enwereike ịbacha ya, sie ya, ghe ya eghe, gbakpọ ya maọbụ baa ya na mmiri.
Enwere akpụ na-atọ ụtọ nakwa nke na-enu inu.
Lee ụzọ iri i ga-esi mee akpụ gị ka ọ bụrụ dachịị.
1) Ịsụ akpụ asụ

Ebe foto si, Matse Cooks
Nke a ka ndị Igbo na-akpọ "santana" ma ahazicha ya n'efere.
I jụọ m ihe eji akpọ ya, amaghị m nwanne mana otu ihe m mara bụ na akpụ asụrụ asụ na ofe onugbu, ọra, egusi na nsala dị dịka di na nwunye na-ekweghị agba alụkwaghịm.
Lee ka esi esi akpụ asụrụ asụ
2) Abacha agwọrọ agwọ

Ebe foto si, Ntanta Delicacies Instagram
Onye ọbụla na-eribeghị Abacha agwọrọ agwọ amaghị ihe ọ na-ekwofe makana ya bụ nrị bụ elelebe eje ọrụ ma ịhazicha ya.
Eji okporoko, anụ Kanda, azụ, anyara nakwa ihe ndị ọzọ na-adọ n'akpịrị were ahazi ya.
E nwere obodo ebe Abacha bụ ọjị a ga-enye gị tupu ebutezie nri ị ga-eri.
3) Nke a atọ bụ Garri

Ebe foto si, Matse Cooks Instagram
Nwanne o nwere ndị Garri na-ejere ozi ka ọ bụ odibo ha.
Ụfọdụ na-asị na akpụ asụrụ asụ na-esi ha isi n'aka ya mere ha ji ekopu ma ị nye ha Garri na ofe.
Garrị bụ akpụ ebechara, kwụọ ya, wunye n'akpa ma kwe ka ọ gụchasia mmiri tupu eghe ya nke ọma ka ọkpọ ọfụma.
Ọtụtụ mmadụ na-aṅụ Garrị dịka mgbadoume eji eche nri ka oghe.
Ya bụ nri kacha dị fecha fecha ime mana ka m kuziere gị ka ị ga-esi mee Garrị ị na-anụ anụ ka ọ tọwaa nti.
Ka esi mee ya
- Wepụta oke ị ga-aṅụchali, tupucha ihe ọ bụla bụ ahịahịa dị na ya.
- Gbanye ya mmiri ọfụma ma zapụ ya ugboro abụọ
- Tinye ya mmanụ aṅụ
- Benye ya akụ oyibo, wunye ya 'mik', wunye ọpụpa
- Wunyekwuo ya mmiri juru oyi.
Chaị akpịrị gị akwụrụla ọtọ ugbua!!
4) Achicha bekee

Ebe foto si, Matse Cooks
Echekwala na ọ bụ naanị ọka maọbụ Witi akwọrọ akwọ ka eji eme achịcha.
Ị ta nke eji akpụ akwọrọ akwọ wee mee ị ga-achịkọrọ ihe niile i nwere nye onye nwere ya.
A na-eji akpụ na-enu inu eme ya.
Ka esi mee ya
- Sacha ma becha akpụ gị
- Kwọrie ya
- Zachapụ mmiri dị na ya etu kwere gị
- Hapụ n'ogbe n'ogbe ka ọ kọchapụ
- Sụọ ya ma yọọ ya ayọ
- Tinye ya nnu
- Danye efere achịcha n'oku
- Wunye akpụ ihazirila n'ime efere achịcha ma hapụ ka o ghee n'ọkụ na anaghị enwu nnukwu
- Oghee tụgharịa ya ka okpuru ya gheekwuo
- Hapụ ya ka ọ fụọ.
5. Akpụ Mmiri

Ị na-arụ oke ọrụ tụmadị oke anwụ na-acha gị, akpụ mmiri juru oyi na akụ oyibo ga-abịanyụ okpofu maọbụ mgbakasị ahụ na-eme gị.
Ọ naghị ahịa ahụ omume.
Ka esi eme ya
- Bọpụta ma becha akpụ gị, ịchọkwa isie ya n'azụ ya
- Oghee ị chere ka ọ juo oyi
- I berisie ya kịrịkịrị
- Banye ya na mmiri ka o fo chi
- Sacha ọzọ ma tinye ya na nju oyi maọbụ mmiri juru oyi
- Were akị maọbụ ọpụpa were taa ya, ịgaghị echezọ ụtọ ya echezọ.
6) Stachi a na-elo elo

Ebe foto si, Matse Cooks Instagram
Nri a dịka nwaanyị e ji eje emume maka etu o si acha.
Ndị Delta steeti ejighị ya egwu egwu .
Ha na-eji ofe a na-akpọ banga were eri ya. Ụfọdụ ndị sikwa na mpaghara ala Igbo na-erite ya ọfụma.
Ka esi eme ya
- Bụpụta akpụ, bacha ya ma sacha ya ọfụma
- Berisie ya
- Tinye ya n'igwe eji akwọ ihe
- Were akpoa yọ ya ayọ
- Hapụtụ ihe yọpụtara ka odo obere
- Wepụta stachị pụtara na ya
- Gbarie ya n'obere mmiri ọfụma ka mkpụrụ ọbụla ghara ị dị ya ma sinye ya n'ọkụ
- Tanye obere mmanụ
- Tụgharịa ya ruo mgbe o situru ike tupu isesi we ya ike
- Isekọta ya, ihapụtụ ya ka ọfụtụ.
Stachi gị eyelaaa!!
7)Kpekere eji akpụ eme

Ebe foto si, Getty Images
Nwaanne echekwala na ọ bụ sọ ọgede maọbụ unele na ji ka eji eme kpekere.
Ejikwa akpụ eme ya. Ọ hịaghị ahụ.
Mana ọ bụ ndị Ashịa na-emekarị ya.
Ka esi eme ya
- Bacha akpụ ka ọ na-acha ọcha
- Sacha ya ọfụma
- Berie ya kịrịkịrị etu esi ebe kpekere
- Gbanye mmanụ n'ite dị ọkụ
- fesa nnu na oso kpọrọ nkụ na kpekere ahụ
- Bido ghewe ruo mgbe chara ka ọlaedo.
Ị ga-atalị nke a ebe ọbụla ịnọ
8) Akwụkwọ akpụ bụkwa egwu eji

Ebe foto si, Getty Images
Akwụkwọ nwere ọtụtụ ihe na-edozi ahụ.
Ọ dị mma oriri maọbụrụ na ịgbakpọcha ya. Nke a ga-eme ka 'Hydrogen Cyanide' dị n'ime pụcha ka ọ ghara igbu mmadụ.
Ụfọdụ na-eji ya esi ofe tụmadị ndị mba Centralụ Afịrịka, Sierra Leone na Liberia.
9) Eji akpụ ese nrị

Ebe foto si, Getty Images
10) Ihe ndị ọzọ ị na-amaghị maka akpụ:
- Eji Akwụkwọ akpu esi nri
- Akwụkwọ akpụ nwere protin karịa mgbọrọgwụ ya
- Tupu erie akwụkwọ ya a ga-esiriri ya n'ọkụ ma wufuo mmiri ya
- Akpụ dị mma n'ahụ onye na-achọghị gluten
- Akpụ na-achụpụ ibu makana ọ na-eme ka agụrụ ghara igụ mmadụ
- A na-eji akpu akwọrọ akwọ eme ka anụ ahụ na-akwọ murumuru
- A na-eji mgborogwu akpụ eme ka ụburu rụọ ọrụ ọfụma
- A naghị eri akpụ maọbụrụ na-esighị ya n'ọkụ nke ọma.



































