AFCON 2021 Tournament: Etu Naịjirịa si kwụrụ n'AFCON a kamgbe ọ malitere

Ebe foto si, TotalEnergies Africa Cup of Nations
Ihe mba Afrịka ọbụla kpụụ n'ọnụ ugbua bụ asọmpi Iko Mba Afrịka nke ga-ebiri ọkụ n'ụbọchị itoolu nke Jenụwarị, 2022.
Nke afọ a bụ nke ugboro iri atọ na atọ, ga-akpọtụ na mba Kameroon bụ ndị ga-ele mba iri abụọ na atọ ndị ọzọ ọbịa.
E kwesiburu ịgba ya n'ọnwa Juun afọ 2021 mana a kagburu ya n'ihi nsogbu ọrịa coronavirus metụtara egwu bọọlụ n'ụwa.
Dịka ị na-anụ mkpọtụ maka asọmpi a e ji AFCON maara, ọ ga-adịkwa mma ka ị mata ihe ọbụ n'uju nakwa etu Naịjirịa si kwụrụ.
Gịnị bụ AFCON?

Ebe foto si, TotalEnergies Africa Cup of Nations
AFCON pụtara African Cup of Nations bụ Iko Mba Afrịka nke egwuregwu bọọlụ ụmụnwoke.
Ndị na-ahazi ya bụ otu jikọtara egwuregwu bọọlụ n'Afrịka bụ Confederation of African Football (CAF) na Bekee.
AFCON bụ otu ụzọ gbara ọkpụrụkpụ e ji ewulite ịdị n'otu mba Afrịka niile, nke a bụ uru ọ baara.
A na-agbakaarị ya n'ọnwa Juun/Julaị n'ime afọ abụọ ọbụla. Ọ na-efu otu ọnwa iji gbaa ya.
Lee tebụlụ AFCON 2021
Iko Mba Afrịka 2021
- P - Egwuregwu
- M - Mmeri
- N - Ọdịda
- Ọ - Nhatanha
- Akr - Akara
- NG - Ndiiche na Goolu
-
-
Otu A
Mba P M N Ọ Akr NG Kameruun 3 2 1 0 7 4 Bọkina Faso 3 1 1 1 4 0 Kepu Vedi 3 1 1 1 4 0 Etiopịa 3 0 1 2 1 -4 -
09/01/2022, 17:00Kameruun 2-1 Bọkina Faso-(Penariti)(Ama egwuregwu Olembe )
-
09/01/2022, 20:00Etiopịa 0-1 Kepu Vedi-(Penariti)(Ama egwuregwu Olembe )
-
13/01/2022, 17:00Kameruun 4-1 Etiopịa-(Penariti)(Ama egwuregwu Olembe )
-
13/01/2022, 20:00Kepu Vedi 0-1 Bọkina Faso-(Penariti)(Ama egwuregwu Olembe )
-
17/01/2022, 17:00Bọkina Faso 1-1 Etiopịa-(Penariti)(Ama egwuregwu Kouekong)
-
17/01/2022, 17:00Kepu Vedi 1-1 Kameruun-(Penariti)(Ama egwuregwu Olembe )
-
-
Otu B
Mba P M N Ọ Akr NG Senegal 3 1 2 0 5 1 Guinea 3 1 1 1 4 0 Malawị 3 1 1 1 4 0 Zimbabwe 3 1 0 2 3 -1 -
10/01/2022, 14:00Senegal 1-0 Zimbabwe-(Penariti)(Ama egwuregwu Kouekong)
-
10/01/2022, 17:00Guinea 1-0 Malawị-(Penariti)(Ama egwuregwu Kouekong)
-
14/01/2022, 14:00Senegal 0-0 Guinea-(Penariti)(Ama egwuregwu Kouekong)
-
14/01/2022, 17:00Malawị 2-1 Zimbabwe-(Penariti)(Ama egwuregwu Kouekong)
-
18/01/2022, 17:00Malawị 0-0 Senegal-(Penariti)(Ama egwuregwu Kouekong)
-
18/01/2022, 17:00Zimbabwe 2-1 Guinea-(Penariti)(Ama egwuregwu Stade Omnisport Ahmadou Ahidjo)
-
-
-
-
Otu C
Mba P M N Ọ Akr NG Moroko 3 2 1 0 7 3 Gabọn 3 1 2 0 5 1 Kọmọrọs 3 1 0 2 3 -2 Ghana 3 0 1 2 1 -2 -
10/01/2022, 17:00Moroko 1-0 Ghana-(Penariti)(Ama egwuregwu Stade Omnisport Ahmadou Ahidjo)
-
10/01/2022, 20:00Kọmọrọs 0-1 Gabọn-(Penariti)(Ama egwuregwu Stade Omnisport Ahmadou Ahidjo)
-
14/01/2022, 17:00Moroko 2-0 Kọmọrọs-(Penariti)(Ama egwuregwu Stade Omnisport Ahmadou Ahidjo)
-
14/01/2022, 20:00Gabọn 1-1 Ghana-(Penariti)(Ama egwuregwu Stade Omnisport Ahmadou Ahidjo)
-
18/01/2022, 20:00Gabọn 2-2 Moroko-(Penariti)(Ama egwuregwu Stade Omnisport Ahmadou Ahidjo)
-
18/01/2022, 20:00Ghana 2-3 Kọmọrọs-(Penariti)(Ama egwuregwu Stade Omnisport de Garoua)
-
-
Otu D
Mba P M N Ọ Akr NG Naịjirịa 3 3 0 0 9 5 Masar 3 2 0 1 6 1 Sudan 3 0 1 2 1 -3 Guinea-Bissau 3 0 1 2 1 -3 -
11/01/2022, 17:00Naịjirịa 1-0 Masar-(Penariti)(Ama egwuregwu Stade Omnisport de Garoua)
-
11/01/2022, 20:00Sudan 0-0 Guinea-Bissau-(Penariti)(Ama egwuregwu Stade Omnisport de Garoua)
-
15/01/2022, 17:00Naịjirịa 3-1 Sudan-(Penariti)(Ama egwuregwu Stade Omnisport de Garoua)
-
15/01/2022, 20:00Guinea-Bissau 0-1 Masar-(Penariti)(Ama egwuregwu Stade Omnisport de Garoua)
-
19/01/2022, 20:00Masar 1-0 Sudan-(Penariti)(Ama egwuregwu Stade Omnisport Ahmadou Ahidjo)
-
19/01/2022, 20:00Guinea-Bissau 0-2 Naịjirịa-(Penariti)(Ama egwuregwu Stade Omnisport de Garoua)
-
-
-
-
Otu E
Mba P M N Ọ Akr NG Kote de Vua 3 2 1 0 7 3 Ekwitorịa Gini 3 2 0 1 6 1 Sierra Leone 3 0 2 1 2 -1 Ọọjerịa 3 0 1 2 1 -3 -
11/01/2022, 14:00Ọọjerịa 0-0 Sierra Leone-(Penariti)(Ama egwuregwu Stade Omnisport de Douala)
-
12/01/2022, 20:00Ekwitorịa Gini 0-1 Kote de Vua-(Penariti)(Ama egwuregwu Stade Omnisport de Douala)
-
16/01/2022, 17:00Kote de Vua 2-2 Sierra Leone-(Penariti)(Ama egwuregwu Stade Omnisport de Douala)
-
16/01/2022, 20:00Ọọjerịa 0-1 Ekwitorịa Gini-(Penariti)(Ama egwuregwu Stade Omnisport de Douala)
-
20/01/2022, 17:00Kote de Vua 3-1 Ọọjerịa-(Penariti)(Ama egwuregwu Stade Omnisport de Douala)
-
20/01/2022, 17:00Sierra Leone 0-1 Ekwitorịa Gini-(Penariti)(Ama egwuregwu State Municipal de Limbe)
-
-
Otu F
Mba P M N Ọ Akr NG Malị 3 2 1 0 7 3 Gambia 3 2 1 0 7 2 Tunisịa 3 1 0 2 3 2 Mọrịtanịa 3 0 0 3 0 -7 -
12/01/2022, 14:00Tunisịa 0-1 Malị-(Penariti)(Ama egwuregwu State Municipal de Limbe)
-
12/01/2022, 17:45Mọrịtanịa 0-1 Gambia-(Penariti)(Ama egwuregwu State Municipal de Limbe)
-
16/01/2022, 14:00Gambia 1-1 Malị-(Penariti)(Ama egwuregwu State Municipal de Limbe)
-
16/01/2022, 17:00Tunisịa 4-0 Mọrịtanịa-(Penariti)(Ama egwuregwu State Municipal de Limbe)
-
20/01/2022, 20:00Gambia 1-0 Tunisịa-(Penariti)(Ama egwuregwu State Municipal de Limbe)
-
20/01/2022, 20:00Malị 2-0 Mọrịtanịa-(Penariti)(Ama egwuregwu Stade Omnisport de Douala)
-
-
-
Agba nke 16
-
23/01/2022, 17:00Bọkina Faso 1-1 Gabọn7-6(Penariti)(Ama egwuregwu State Municipal de Limbe)
-
23/01/2022, 20:00Naịjirịa 0-1 Tunisịa-(Penariti)(Ama egwuregwu Stade Omnisport de Garoua)
-
24/01/2022, 17:00Guinea 0-1 Gambia-(Penariti)(Ama egwuregwu Kouekong)
-
24/01/2022, 20:00Kameruun 2-1 Kọmọrọs-(Penariti)(Ama egwuregwu Olembe )
-
25/01/2022, 17:00Senegal 2-0 Kepu Vedi-(Penariti)(Ama egwuregwu Kouekong)
-
25/01/2022, 20:00Moroko 2-1 Malawị-(Penariti)(Ama egwuregwu Stade Omnisport Ahmadou Ahidjo)
-
26/01/2022, 17:00Kote de Vua 0-0 Masar4-5(Penariti)(Ama egwuregwu Stade Omnisport de Douala)
-
26/01/2022, 20:00Malị 0-0 Ekwitorịa Gini5-6(Penariti)(Ama egwuregwu State Municipal de Limbe)
-
-
Agba anọ nke Ikpeazụ
-
29/01/2022, 17:00Gambia 0-2 Kameruun-(Penariti)(Ama egwuregwu Stade Omnisport de Douala)
-
29/01/2022, 20:00Bọkina Faso 1-0 Tunisịa-(Penariti)(Ama egwuregwu Stade Omnisport de Garoua)
-
30/01/2022, 16:00Masar 2-1 Moroko-(Penariti)(Ama egwuregwu Stade Omnisport Ahmadou Ahidjo)
-
30/01/2022, 20:00Senegal 3-1 Ekwitorịa Gini-(Penariti)(Ama egwuregwu Stade Omnisport Ahmadou Ahidjo)
-
-
Ọkara Ikpeazụ
-
02/02/2022, 20:00Bọkina Faso 1-3 Senegal-(Penariti)(Ama egwuregwu Stade Omnisport Ahmadou Ahidjo)
-
03/02/2022, 20:00Kameruun 0-0 Masar1-3(Penariti)(Ama egwuregwu Olembe )
-
-
Ndị gbara atọ na anọ
-
05/02/2022, 20:00Bọkina Faso 3-3 Kameruun3-5(Penariti)(Ama egwuregwu Stade Omnisport Ahmadou Ahidjo)
-
-
Agba nke Ikpeazụ
-
06/02/2022, 20:00Senegal 0-0 Masar4-2(Penariti)(Ama egwuregwu Olembe )
-
Kedụ mgbe AFCON malitere?

Ebe foto si, TotalEnergies Africa Cup of Nations
A tụmatụ ịmalite AFCON pụtara ihe n'afọ 1956, mgbe mba anọ dịka Ijipt, Sudan, Etiopịa na Saụt Afrịka hiwere CAF n'ọgbakọ FIFA e mere na Lisbon, Pọrtugalụ.
Mana asọmpị AFCON malitere kpọmkwen n'ọnwa Febụwarị afọ 1957 na Khartoun bụ isiobodo Sudan.
Naanị mba Ijipt, Etiopịa na Sudan sọnyere n'asọmpi ahụ. A gụpụrụ Saụt Afrịka maka iwu gọọmentị na-achị mgbe ahụ tinyere na ọ bụ naanị ndị ọgba bọọlụ isiọcha ga-aga asọmpi ahụ.
Kedụ mba ole na-agba AFCON?

Ebe foto si, TotalEnergies Africa Cup of Nations
Mgbe asọmpi AFCON malitere n'afọ 1957, naanị mba anọ na-eso agba ya, n'afọ 1961 ha ruru mba itoolu sonyere mana a gbara asọmpi itozuoke nke mbụ ya.
Ọ bụ n'afọ 1963 ka mba ndị dịka Naịjirịa na Tunisia malitere ịgba asọmpi ahụ.
N'afọ 1998 mba ndị na-agba asọmpi AFCON gbagoro iri na ise mana n'afọ 2017 mba iri abụọ na anọ malitere ịgba ya.
Kedụ ihe a na-erite n'asọmpi AFCON.

Ebe foto si, TotalEnergies Africa Cup of Nations
Mba ọbụla gbara ndị mbụ n'asọmpi Iko Mba Afrịka (AFCON) ga-amaburu iko e ji ọlaedo mee nke a rụrụ na mba Ịtali.
Otu CAF ga-enye mba ahụ ego dị nde dọla ise ($5,000,000) ma nye ndị ọgba bọọlụ ha mgbanolu ọlaedo (Gold medal) dị iri atọ.
Ndị gbara ndị nke abụọ ga-enwete nde dọla abụọ na puku narị asaa na puku iri ise ($2,750,000) na mgbanolu ọlaọcha (Silver medal) dị iri atọ.

Ebe foto si, Iheanacho/Sala/Mahrez/Mane/Instagram
N'otu aka ahụ, ndị atọ ga-erite nde dọla abụọ na puku narị abụọ ($2,200,000) na ọlanchara (Bronze medal) iri atọ.
Ebe ndị nke anọ na-erite otu nde dọla na otu puku narị na puku iri asaa na ise ($1,175,000) nakwa ihe itiaka n'obi a kpọrọ 'Diplomas'.
Ebe Naịjirịa kwụ n'AFCON kamgbe ọ malitere

Ebe foto si, TotalEnergies Africa Cup of Nations
Ndị Super Eagles nke Naịjirịa malitere ịgba asọmpi Iko Mba Afrịka (AFCON) n'afọ 1963 bụ ebe e nyere ha ọkpụ goolu iri ma gbapụ ha n'ogogo mbụ.

Asọmpi AFCON nke afọ a ga-eme ya ugboro iri na itoolu ha ga-agba.
Kamgbe ahụ ha ebutela iko a ugboro atọ; n'afọ 1980, 1994 na 2013, gbaa ndị abụọ ugboro atọ.
Ihe ndị ọzọ i kwesịrị ịma maka AFCON

Ebe foto si, TotalEnergies Africa Cup of Nations
Mba Ijipt kachasị buo Iko Mba Afrịka, ha ebuola ya ugboro asaa.
Lekwa ndị niile meriri African Cup of Nations (Afcon) kamgbe ọ malitere n'afọ 1957:

Ebe foto si, Others
































