Aubameyang, Ayew, Lukaku... Lee ndị ọgba bọọlụ Afrịka nna ha bụkwa ọkaibe n'egwu bọọlụ
Ebe foto si, Auba/Jordan Ayew/Romelu Lukaku/Instagram
Egwuregwu bọọlụ ụkwụ bụ egwuregwu a ga-akpọ ọkaibe n'Afrịka n'ihi etu ndị mmadụ si akwado ya.
Mpaghara Afrịka enyekwala ụwa ọtụtụ ndị a ma ama na ya bụ egwuregwu nke mere na a kpọọ aha Afrịka n'eguregwu bọọlụ, ọtụtụ aha ndị ọkaibe ga-agbata ndị mmadụ n'obi.
Dịka ọtụtụ afọ na-agafe, mmụta egwuregwu bọọlụ esila n'aka ndị ọkaibe na-agafe n'aka ụmụ ha dịka ọtụtụ ụmụ ndị gbara bọọlụ n'oge gara aga, bụzịkwa ọkaibe nke onwe ha ugbua.
Lee ụfọdụ ụmụ Afrịka aha ha na-ewu ewu ugbua dịka aha nna ha si wuo ewu n'oge gboo:
Andre na Jordan Ayew
Andre Ayew na nwanne ya nwoke bụ Jordan bụ Abedi Ayew onye e ji Abedi Pele mara.
Abedi bụ onye a na-ahụta dịka ọkaibe n'egwuregwu bọọlụ n'Afrịka n'ihi ike ọ kpara oge ọ nọchitere anya mba ya bụ Ghana malite n'afọ 1982 ruo 1998.
O so na otu ndị Ghana buliri iko mba Afrịka nke afọ 1982, mana ọ gbaghị iko mba ụwa ọbụla tupu ọ laa ezumike.
Ụmụ ya atọ bụ Andre, Jordan na Rahim bụcha ndị ọgba bọọlụ, mana ọ bụ Andre na Jordan ka a kacha anụ aha ha.
Na Disemba 2011, Andre Ayew nwetara nturuugo onye kacha agba bọọlụ n'Afrịka nke BBC na-enye; nna ya bụ Abedi ritekwara nturuugo a n'afọ 1991.
Ugbua, Andre na-agbara otu bọọlụ Al Sadd nke mba Qatar ebe Jordan nọ n'otu bọọlụ Crystal Palace nke mba England.
Pierre-Emerick Aubameyang
Ebe foto si, Getty Images
Aubameyang agbaala bọọlụ n'ọtụtụ otu bọọlụ a ma aha ha na mpaghara Europe nke gụnyere: AC Milan, Borussia Dortmund, Arsenal, Barcelona, na Chelsea ebe ọ nọ ugbua.
Nwa amadị a agbakwaala asọmpi 72 maka mba ya bụ Gabon ma nye goolu 30 tupu ọ laa ezumike ịgbara mba ya bọọlụ n'ọnwa Mee afọ 2022.
Nna ya bụ Pierre-François Aubameyang gbwakwaara mba Gabon bọọlụ malite na 1985 ruo 1998.
O so mba Gabon gaa asọmpi iko mba Afrịka nke afọ 1994 (ebe ọ bụ kaptịn) nakwa nke 1996, mana o bughị iko bụla tupu ọ laa ezumike.
Aubameyang nke okenye gbakwaara otu bọọlụ Stade Lavallois na Le Havre nke mba France.
Romelu Lukaku
Ebe foto si, AfricaFootballClassics/Twitter
Romelu Lukaku bụ aha na-ada ụda n'egwuregwu bọọlụ na mpaghara Europe n'ihi ike nwa amadị a na-akpa, mana ọtụtụ amaghị na nna ya bụ Roger Lukaku gbakwaara mba Congo bọọlụ oge ha ka na-aza Zaire, malite n'afọ 1993 ruo 1996.
Roger Lukaku gbara bọọlụ n'otu egwu KV Oostende, KV Mechelen na Germinal Ekeren nke mba Belgium tupu ọ laa ezumike n'afọ 1999.
Romelu Lukaku na-agbara mba Belgium ugbua ma bụrụ onye kacha nye goolu n'otu bọọlụ mba ahụ, dịka o nyerela goolu 68.
Nwanne ya nwoke bụ Jordan Lukaku na-agbakwa bọọlụ n'otu SD Ponferradina nke mba Spain.
Timothy Tarpeh Weah
Ebe foto si, George Weah/Instagram
Kamgbe egwu bọọlụ malitere, naanị otu onye Afrịka nwetarala nturuugo onye kacha agba bọọlụ n'ụwa niile; onye ahụ bụ nwa amadi Liberia aha ya bụ George Weah, onye bụzi onyeisiala mba Liberia ugbua.
Mana otu ihe George Weah na-emenwughị bụ ịga asọmpi iko mba ụwa.
N'afọ 2022, nwa ya bụ Timothy Weah mere ihe ahụ nna ya emenwughị dịka o so mba USA gaa asọmpi iko mba ụwa na Qatar.
Tupu o sonye otu bọọlụ nke USA, Timothy Weah nwere ohere ịgbara mba anọ bọọlụ: Amerịka - ebe a mụrụ ya, Liberia - obodo nna ya, Jamaica - obodo nne ya, na France obodo ebe ọ nọ kamgbe ọ dị afọ 14.
Na Qatar 2022, Timothy nyere goolu n'asọmpi USA na Wales, nke bụ goolu mbụ ọ na-enye n'asọmpi Iko Mba ụwa.
Ndị ọzọ...
Ebe foto si, Screengrab
- Isaac Drogba, nwa Dider Drogba, na-agbakwa bọọlụ ugbua, mana otu bọọlụ mba Cote D'Ivoire akpọbeghị ya ka o sonyere ha.Isaac gbaara otu bọọlụ ọzụzụ nke Chelsea, mana ebe ọ nọ ugbua bụ na mba Italy ebe ọ na-agbara ndị otu Falgore Caratese.
- Etienne Eto'o, nwa Samuel Eto'o Fils nke mba Cameroon, malitere ịgba bọọlụ n'otu egwuregwu Real Mallorca nke mba Spen.Nna ya bụ Samuel Eto'o bụ ọgbaa bọọlụ kacha rite nturuugo nakwa nkwanye ugwu n'Afrịka.Ugbua, Samuel Eto'o bụ onyeisi otu na-ahazi egwuregwu bọọlụ na mba Cameroon. Nwa ya Etienne agbakwaalara mba Cameroon n'ogogo ndị erubeghị afọ 21.
- Sean Nwankwo, nwa Kanu Nwankwo nke Naịjirịa na-agbara otu bọọlụ Watford nke mba England, n'ogogo ndị erubeghị afọ 16.Kanu Nwankwo n'onwe so n'otu n'ime ndị ọgba bọọlụ Naịjirịa aha ha kacha ada ụda.
- Kevin Martins, nwa Obafemi Martins nke Naịjirịa, na-agbara mba Italy n'ogogo ndị erubeghị afọ 16 ugbua.
Isi akụkọ
Kọwaara m isi akụkọ
Akụkọ akachasị gụọ
Content is not available