Onye bụ Carney Chukwuemeka a yiri ndị Mancity egwu?

Ebe foto si, R.D. Football Scout/Twitter
Aha nwa ntoroọbịa bụ Carney Chukwuemeka na-ada ebe niile na soshal midịa dịka ndị Chelsea na otu Manchester City zutere onwe ha n'ụbọchị Tọọzde.
Agbanyeghị na Mancity ji otu ọkpụ goolu asataghị nchancha merie Chelsea, etu Chukwuemeka onye na-agbara ndị Chelsea bọolụ siri gbaa mbọ na ya bụ asọmpị nyere ndị mmadụ obi ụtọ.
Agbanyeghị na osoghị bido ya bụ asọmpị, ihe mgbanwe gosiri dịka ewebatara ya.
Ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu ka etinye ya site na mbido mgbe ọzọ Chelsea ga-enwe asọmpị.
Lee ihe ịkwesaịrị ịma maka nwa amadị a
- Aha ya bụ Carney Chibueze Chukwuemeka
- A mụrụ ya na mba Austria n'ụbọchị 20 nke ọnwa Oktoba afọ 2003.
- Nne na nna ya sị Austria kwaga Northampton dị na mba Briten.
- Ọ na-agbara ndị otu Chelsea bọọlụ ma na-eyi uwe edere akara 30
- Ọ bụ n'ọnwa Ọgụstụ afọ 2022 ka ndị Chelsea nabatara ya n'aka Aston Villa.
- Chukwuemeka nwereike ịgbara Austria, England maọbụ Naịjirịa bọọlụ dịka o siri dị ugbua.
- Kama ọ gbaarala otu bọọlụ ntoroọbịa Briten nke U17, U18, U19 na nke U20.
Lee ihe ndị ọnụ na-eru n'okwu maka bọọlụ na-ekwu maka ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
CFC-Blues kwuru sị, " Achọrọ ịhu nwa amadị a ọzọ , etu o siri gbaa bọọlụ masịrị m".
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Carney Chukwuemeka nọ n'egwu n'abalị a, etu o siri gbaa bọọlụ masịrị m.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3