Otu National Police Council akwadola nhọpụta Olatunji Disu dịka onyeisi ndị uweojii Naịjirịa

Ebe foto si, Nigeria Police Force/X

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Otu National Police Council akwadola Olatunji Disu dịka onyeisi ndị uweojii Naịjirịa.

Ka ọ dị ugbua, a ga-eziga aha Disu n'ụlọomeiwu Sineti maka nnyocha.

Cheta na Onyeisiala Bola Tinubu họpụtara dịka onyeisi ndị uweojii na Febụwarị 25, 2026 dịka Kayode Egbetokun gbara arụkwaghịm dịka onyeisi ndị uweojii Naịjirịa.

Onyeisiala Tinubu eduola Tunji Disu n'iyi ọrụ dịka onyeisi ndị uweojii Naịjirịa

Ebe foto si, Bayo Onanuga/X

Onyeisiala Bola Tinubu enyela Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa ọhụrụ bụ Olatunji Disu iwu ka ọ malite ibu agha megide ndị na-eyi ọha egwu, ya na ajọ ọnọdụ nchekwa ndị ọzọ na-enye Naịjirịa nsogbu ugbua.

Onyeisiala Tinubu kwupụtara nkea n'ụbọchị Wenezde 25 Febụwarị 2026, mgbe o duru Disu n'iyi ọrụ dịka onye bụbu onyeisi ndị uweojii Kayode Egbetokun, lara ezumike nka.

N'akwụkwọ ozi onye ndumọdu puruiche nke Onyeisiala Tinubu bụ Bayo Onanuga wepụtara, Tinubu kwuru na "Naịjirịa nwere nsogbu nchekwa dị iche iche ma gwa Tunji Disu n'ọrụ ya bụ imeri ndị otu a niile na-enye obodo nsogbu."

Ebe foto si, Bayo Onanuga/X

Tinubu kwuru na Tunji Disu gosipụtara na o nwere ọzụzụ, amamịhe ọrụ, nakwa ikike idu ndi uweojii

"Emere m mkpebi a ka i rụọ ọrụ a. Amaara m ihe ndekọ gị. A hụrụ etu isi rụọ ọrụ mgbe ị nọ na Legọs mgbe m bụ gọvanọ."

Tupu eme Disu onyeisi ndị uweojii, ọ rụrụ ọrụ dịka AIG na-ahụ maka nnyocha mpụ na mpaghara Alagbon dị na Legọs

Ebe foto si, Bayo Onanuga/X

Etu Frank Mbah si laa ezumike ntụmadi díka Osote Onyeisi Ndíuweojii Naijiria

Ebe foto si, NPF

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Osote Onyeisi ndi uweojii Naijiria bụ AIG Frank Mba alala ezumike ntụmadị dịka Onyeisiala Naijiria bụ Bola Tinubu họpụtara Tunji Disu dịka Onyeisi Ndịuweojii Naijiria ọhụrụ.

Omenala ndị uweojii Naijiria bụ na ọ bụrụ na enye onye uweojii ibe ya ka n'ọkwa oche dika onyeisi ndịuweojii, ndị nile bụ Osote Onyeisi uweojii, etinye akwụkwo ezumike nka.

Mba , onye e si n'ọkwa' 'Assistant Inspector -General of Police e mere ya n'ọnwa Maachị afọ 2023, bugo n'ọkwa 'Deputy Inspector -General of Police' nọ ọnwa Juun otu afọ ahụ so na ndị welitere isi n'ọrụ uweojii Naijiria bụ ndị na-aga ezumike nke dịka Disu were oche dịka Onyeisi Ndịuweojii Naijiria.

Ha gụnyere: Basil Idegwu, Osote Onyeisiuweojii na-ahụ ngalaba nnyocha na nhazi( Department of Research and Planning) n'isi ụlọọrụ ndị uweojii n'Abuja;Hamzat bụ Osote Onyeisi Ndịuweojii na-ahụmaka ngalaba Logistics and Supply'; Mohammed Gumel bụ Osote Onyeisi uweojji na-elekọta ngalaba 'Force Intelligence Department' n'isiụlọọrụ ndị uweojii n'Abuja;

Ihe i kwesịrị ịma maka Frank Mba

Ebe foto si, NPF

Onye Ezimo dị n'Okpuru Ọchịchị Udenu, Enugwu Steeti, a mụrụ Frank Mba na Legọs.

Mba banyere ọrụ ndị uweojii n'afọ 1992 dịka 'cadet Inspector'.

E buliri nwaamadi a gụrụ maka Iwu na mahadum 'University of Lagos' n'ọkwa dịka 'Superintendent of Police' (SP) n'afọ 2008.

E mere ya 'Chief Superintendent of Police' n'afọ 2012,

E buliri ya n'ọkwa obere osote Kọmishọna ndị Uweojii (Assistant Commissioner of Police) n'afọ 2014.

Ọ rịgoro n'okwa Osote Komishọna( Deputy Commissioner of Police (DCP) n'afọ 2018.

E mere ya Kọmishọna ndị uweojii (Commissioner of Police) n'afọ 2020.

Ọ rụọla ọrụ dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naijiria ugboro atọ

Onyeisiala Tinubu emeela Tunji Disu onyeisi ndị uweojii dịka Egbetokun gbara arụkwaghịm

Ebe foto si, Bayo Onanuga/X

Nkọwa foto, Foto Tunji Disu oge o yi akwa ndị uweojii

Onyeisiala Bola Tinubu ahọpụtala Tunji Disu dịka onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa dịka Kayode Egbetokun gbara arụkwaghịm

Dịka akwụkwọ ozi onye ndụmọdụ pụrụiche nke Onyeisiala bụ Bayo Onanuga wepụtara siri kwuo, Onyeisiala Tinubu nabatara akwụkwọ arụkwaghịm Egbetokun n'ụbọchị Tuzde abalị ịrị abụọ na anọ nke ọnwa Febụwarị afọ 2026 ma kele ya maka ọrụ ọma ọrụrụ dịka onyeisi ndị uweojii nakwa ndị Naịjirịa.

Onanuga kwuru na a họpụtara Egbetokun dịka onyeisi ndị uweojii n'onwa Juun nke afọ 2023.

O kwuru na ọchịchị ya dịka onyeisi ndị uweojii kwesịrị ị bịa na njedebe n'afọ 2027 mana akwụkwọ arụkwaghịm ya kwuru na ọ bụ maka ihe dị mkpa gbasara ezinụlọ ya kpatara ya.

Onanuga kwupụtakwara na Onyeisiala Tinubu kwadoro nhọpụta Tunji Disu dịka onyeisi ndị uweojii ọhụrụ.

Ọ gara n'ihu kwuo na Onyeisiala Tinubu ga-enwe nzukọ kansul ndị uweojii n'oge na-adịghị anya iji tụlee nhọpụta Disu dịka onyeisi ndị uweojii.

Nke a mechaa, a ga-ezigara ndị Sineti aha ya ka ha kwado nhọpụta ya.

Onye bụ Tunji Disu Tinubu họpụtara dịka onyeisi ndị uweojii?

Ebe foto si, Tunji Disu/X

Nkọwa foto, Foto Tunji Disu oge o yi akwa ndị uweojii

Tunji Disu gara ụlọakwụkwọ na mahadum Legọs a na-akpọ 'University of Lagos', ebe ọ gụrụ 'English'.

O nwere 'Master Degree' n'ihe gbasara 'Criminology, Security, and Legal Psychology na mahadum University of Lagos'

Disu gara ụlọakwụkwọ Praịmarị obere oge na 'Holy Cross Cathedral' nke dị na Ogun steeti tupu ọ gụchapụ na 'Mayflower Junior' dị na steeti ahụ.

A mụrụ Disu n'ọnwa Epril, abalị iri na atọ nke afọ 1966 na Legọs steeti.

Ọ banyere ọrụ uweojii n'ọnwa Mee abalị iri na asatọ nke afọ 1992.

Ọ rụrụ ọrụ dịka 'DPO' na steeti dị iche iche gụnyere Ago Iwoye dị na Ogun steeti, Okare dị na Ondo steeti na Elimbu na Elelenwo dị n'Abuja.

Ebe foto si, Tunji Disu /X

Nkọwa foto, Foto Tunji Disu oge o yi akwa ọrụ ndị uweojii

N'afọ 2005, o duru ndị uweojii ga ọrụ nchekwa udo nke mbu ha na mba Sudan.

Tunji rụkwara ọrụ n'okpuru Usman Alkali Baba onye bụbu onyeisi ndị uweojii Naịjirịa dịka osote kọmishọna na-ahụ maka ngalaba ọrụ na isi ụlọọrụ ndị uweojii n'Abuja.

Disu gara ọmụmụ ihe dị iche iche na Naịjirịa nakwa mba ofesi nke gụnyere ọzụzụ maka ịzụ na ibubata ngwa agha nke iwu na-akwadoghi na Botswana, ọzụzụ maka mpụ ịntaneetị na Mahadum Cambridge nke dị na United Kingdom na ndị ọzọ.

Onye bụ Kayode Egbetokun?

Ebe foto si, Nigeria Police/X

Nkọwa foto, Foto Kayode Egbetokun

Onyeisiala Tinubu họpụtara Egbeokun dịka onyeisi ndị uweojii Naịjirịa n'ụbọchị Mọnde Juun 19, 2023 ka ọ nọchie Usman Alkali Baba.

Egbetokun gbara afọ 58 oge a họpụtara ya dịka onyeisi ndị uweojii Naịjirịa. O kwesiri ịla ezumike nka na Sepụtemba 2024 oge o ruru afọ 60.

Mana ụlọmeiwu Naịjirịa gbanwere iwu ndị uweojii nke nyere Egbetokun oghere ijide ọkwa ahụ ruo afọ anọ maọbụ mgbe Onyeisiala wepụrụ ya.

A mụrụ ya n'abalị anọ nke ọnwa Sepụtemba afọ 1964 na Erinja dị na mpaghara ọchịchị ime obodo Yewa Saụt na Ogun steeti.

Ọ gara ụlọakwụkwọ mahadum Legọs bụ University of Lagos, ebe oji 'bachelor's degree' na mgbakọ na mwepụ pụta n'afọ 1987.

O nwetara 'master's degree' ya na 'Engineering Analysis' na 1996. Ọ rụrụ ọrụ nwa ntakịrị dịka onye nkuzi mgbakọ na mwepụ na mahadum 'Yaba College of Technology'.

Egbetokun banyere ọrụ ndị uweojii n'abali atọ nke ọnwa Maachị afọ 1990 dịka 'Cadet Assistant Superintendent of Police'

Egbetokun bụ onyeisi nchekwa nyere Bola Tinubu mgbe ọ bụ gọvanọ Legọs steeti n'afọ 1999.