Cristiano Ronaldo ahapụla otu Manchester United

Ebe foto si, PA Media
Cristiano Ronaldo ahapụla otu manchester United.
Nke a na-abịa dịka Ronaldo na onye ntaakụkọ aha ya bụ Piers Morgan nwechara mkparịtaụka ebe ọ nọ katọọ Man Utd nakwa ndị nlekọta ha.
N'akwụkwọ ozi si n'aka Manchester United pụta, ha kwuru na nke a bụ nkwekọrịta ha na Ronaldo nwere.
"Otu a na-ekele Ronaldo maka aka niile o nyere n'ugboro abụọ ọ nọrọ na Old Trafford," akwụkwọ ozi ahụ kwuru.
Ha kwuru na ha na-ekpere Ronaldo ekpere ọma maka ya na ezinụlọ ya.
N'otu aka ahụ kwa, Ronaldo wepụtakwara ozi ma kwuo na "mụ na Manchester United ekwekọrịtala ịkagbu nkwekọrịta anyị na-erubeghị eru".
Ọ ka fọrọ ihe dịka ọnwa asaa ka nkwekọrịta Ronaldo na ndị Manchester United bịa n'isi njedebe, mana ugbua, ha akagbuola ya kpamkpam.
Ahụrụ m Manchester United n'anya - Ronaldo

Ebe foto si, Ronaldo
N'akwụkwọ ozi ya, Ronaldo kwuru sị: "Ahụrụ m Manchester United n'anya, ahụkwara m ndị nkwa ya niile n'anya, onweghị ihe ga-agbanwe ya. Mand ka ọ dị ugbua, echere m na oge eruola mgbe m ga-aga ebe ọzọ gaa chọọ ihe ọhụrụ."
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
"Ana m ekpere ndị otu Man Utd ekpere ọma maka ọdịnihu."
Asọmpi ikpeazụ Ronaldo gbaara Man Utd bụ n'ụbọchị isii nke ọnwa Nọvemba 2022, oge Aston Villa ji ọkpụ goolu atọ asatara otu merie ha.
Ronaldo na onye nkuzi ndị Man Utd bụ Eric Ten Hag nwere nghọtahie na Nọvemba 3, na asọmpi ha na ndị Tottenham, mgbe Ten Hag chọrọ itinye ya dịka asọmpi ahụ na-achọ ịgwụ, mana Ronaldo jụ ịbata.
Nke a mere ka Ten Hag ghara itinye ya n'asọmpi Man Utd na Chelsea.
Na mkparịtaụka Ronaldo na onyentaakụ a ma ama nwere n'izuụka gara aga, o kwuru na Ten Hag gharịpụrụ ya, ma kwukwaa na ya na-eche na Man Utd chọrọ ka ọ pụọ n'otu ha.
O kwukwara na ya ahụghị ihe mgbanwe ọbụla na Man Utd kamgbe onye nkuzi mbụ ha bụ Alex Ferguson lachara ezumike nka n'afọ 2013.
Ronaldo na ndị otu bọọlụ mba ya bụ Pọtụgal nọ na Qatar ugbua dịka ha na-esonye n'asọmpi Iko Mba Ụwa nke 2022.
Amabeghị otu bọọlụ ọ ga-esonye n'afọ na-abịanụ.
Ronaldo si otu Sport Lisbon nke mba Pọtụgal bata otu Manchester United n'afọ 2003, ma pụọ na 2009.
Ọ bụ na Man Utd ka ọ nọ rite nturuugo 'Balon d'Or' nke mbụ ya.
Ọ gbaara Man Utd asọmpi 196 ma nyete goolu 84 tupu ọ pụọ gawa Real Madrid.
Na 2021, Ronaldo batakwa otu Man Utd ọzọ, gbaa asọmpi 40 ma nye goolu 19 tupu ugbua.






























