ADC ajụla usoro ntuliaka ọhụrụ Inec hazigharịrị

Bolaji Abdullahi

Ebe foto si, Bolaji Abdullahi/Instagram

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Otu 'African Democratic Congress' akpọrọ ADC n'ịchafụ ajụla ịnabata usoro ntuliaka 2027 nke ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na Naijiria bụ Independent National Electoral Commission(Inec)wepụtara ọhụrụ.

Inec tinyeburu ntuliaka Onyeisiala na Ụlọomeiwu Etiti ka ọ bụrụ n'abalị 20 nke ọnwa Febụwarị afọ 2027 ma buhachi ya ka ọ bụrụ n'abalị 16 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2027, ebe ntuliaka maka ọkwa Gọvanọ na ndị omeiwu steeti Inec tinyeburu n'abalị ise nke ọnwa Maachị ga-abụzị n'abalị 21 nke ọnwa Eprelu.

ADC kwuru na nhazigharị ahụ bụ iji hụ na ọtụtụ ndị mammadụ esonghị na ntuliaka.

Ọnụ na-ekwuru ADC bụ Bolaji Abdullahi kwuru n'ozi mgbasaozi o wepụtara sị, " Ụlọọrụ ahụ na-ahazi ntuliaka, "Ihe dịka nhazi nkịtị etu a ga-esi mee ntuliaka na-abịa bụ ụzọ ndọrọndọọ a chọrọ iji kpachie ụzọ ma hụ na aka ka sie gọọmentị nọ n'ọchịchị aka na ntuliaka.

Ọ rụtụrụ aka na ndebanye aha Inec tiri iwu ka pati ọbụla debanye ndị otu ha na APC amalitelarị ime ya tupu Inec etinye ya n'iwu ga-eji pati na-adọ ọchịchị.

Anyị ewepụtala ụbọchị ọhụrụ maka ntuliaka afọ 2027 - INEC

Anyị ewepụtala ụbọchị ọhụrụ maka ntuliaka afọ 2027 - INEC

Ebe foto si, INEC, Getty Images

Ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (INEC) ewepụtala ozi gbasara usoro ọhụrụ a ga-eji hazie ntuliaka n'afọ 2027.

Nke a dị n'ozi Onyeisi ngalaba na-ahụ maka mgbasaozi n'ụlọọrụ INEC bụ Malam Mohammed Kudu Haruna wepụtara n'ụbọchị Tọzde 26 Febụwarị 2026.

INEC kwuru na ụbọchị ọhụrụ ndị a ha wepụtara maka iji hazie ntuliaka onyeisiala, nke ndị gọvanọ na nke ndị omeiwu bụ nke gbasoro Iwu Ntuliaka afọ 2026.

Dabere n'usoro ọhụrụ a INEC wepụtara, ntuliaka onyeisiala na nke ndị omeiwu etiti ga-abụ n'ụbọchị Satọde 16 Jenụwarị 2027.

N'otu aka ahụ, ntuliaka ndị gọvanọ na ndị omeiwu steeti ga-abụ n'ụbọchị Satọde 6 Febụwarị 2027.

Ntuliaka imeụlọ maka pati dị iche iche ga-amalite n'ụbọchị 23 Eprel ruo n'ụbọchị 30 Mee 2026.

Ịchụ nta vootu maka ndị na-azọ ọkwa onyeisiala na ndị na-azọ ọkwa omeiwu etiti ga-amalite n'ụbọchị 19 Ọgọst 2026, ebe ndị na-azọ ọkwa gọvanọ na ndị na-azọ ọkwa omeiwu steeti ga-amalite nke ha n'ụbọchị 9 Septemba 2026.

INEC kwuru na ịchụ nta vootu niile ga-akụrụ ọnụ n'ime awa iri abụọ na anọ tupu ụbọchị ntuliaka, dịka ha gwara pati niile ka ha rubeisi n'usoro ndị a.

Ụbọchị ntuliaka afọ 2027: INEC ekwuola okwu gbasara mkpesa ndị mmadụ

Ụbọchị ntuliaka afọ 2027: INEC ekwuola okwu gbasara mkpesa ndị mmadụ

Ebe foto si, INEC, Getty Images

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na Naịjirịa bụ INEC ekwuola okwu gbasara mmetụta ụfọdụ mmadụ maka usoro ntuliaka afọ 2027 ha wepụtara na nso nso a.

N'ụbọchị Fraịde 13 Febụwarị 2026 ka INEC kwupụtara na ha ga-ahazi ntuliaka onyeisiala na nke ndị omeiwu Naịjirịa n'ụbọchị 20 Febụwarị 2027, ma hazie nke ndị aka na-achị steeti na ndị omeiwu steeti n'ụbọchị 6 Maachị 2027.

INEC tinyekwara oge ntuliaka pati dị iche iche n'agbata 22 Mee na 20 Juun 2026 iji họpụta ndị ga-eji ọkọlọtọ ha zọọ ọkwa dị iche iche.

Ka o sina dị, ụfọdụ ndị Naịjirịa gosiri mmetụta gbasara ụfọdụ ụbọchị ntuliaka ndị ahụ, ọkachasị ndị Alakụba, dịka ha kwuru na ọ danyere n'ọnwa nsọ nke Ramadan.

Ha kwuru na obubuọnụ ha nwereike ịmetụta ọnụọgụ mmadụ ndị ga-apụta maka ịtụ vootu, ndị ga-ahụ maka njem, ndị nlereanya nakwa ndị ọrụ INEC.

Otu n'ime ndị kpọrọ oku a bụ onye bụbu osote onyeisiala Naịjirịa bụ Atiku Abubakar, onye gbara ụlọọrụ INEC ume ka ha lebagharịa anya n'ụbọchị ndị ha kwupụtara.

N'ihi nke a, Onyeisi kọmitii na-ahụ maka mgbasaozi n'ụlọọrụ INEC bụ Mohammed Haruna wepụtara ozi n'ụbọchị Fraịde, ma kwuo na a haziri usoro ntuliaka ahụ site n'ịgbaso iwu Naịjirịa nke afọ 1999, Iwu Ntuliaka nke afọ 2022 nakwa Iwu na Usoro ụlọọrụ INEC gbasara ịhazi ntuliaka nke afọ 2022.

Haruna kwuru na ọ bụ Iwu na Usoro ụlọọrụ INEC gbasara ịhazi ntuliaka, bụ nke malitere ọrụ kemgbe afọ 2019 na-etinye ụbọchị a na-ahazi ntuliaka.

Ma n'agbanyeghị, INEC kwuru na ha anabatala mkpesa ndị niile nwere aka oke gbasara ndanye ahụ.

Ntuliaka 2027: Lee Ntuziaka etu ọ ga-esi gaa

Joash Amupitan na onye ọrụ Inec

Ebe foto si, Inec/Facebook

Ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka bụ Independent National Electoral Commission (Inec) ehiwela ntuliaka Onyeisiala, nke ndị Ụlọomeiwu nke etiti n'ụbọchị Satọde 20 Febụwarị 2027, ebe ntuliaka ọkwa gọvanọ ga-abụ n'ụbọchị Satọde 7 Maachị 2026.

Onyeisi ụlọọrụ Inec bụ Joash Amupitan bụ onye wepụtara ntuziaka usoro ntuliaka n'Abuja dịka ọ na-agwa ndị ndu ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa ndị na-gba mbọ maka ikike dịịrị onye n'ụbọchị Fraide 13 Febụwarị, 2026.

Joash Amupitan bụ onyeisioche ụlọọrụ Inec

Ebe foto si, Inec/Facebook

Amupitan gbara ama n'usoro ntuliaka 2027 ga-amalite etu a:

  • Ntuliaka onyeisiala na nke Ụlọmeiwu Etiti – Febụwarị 20, 2027
  • Ntuliaka Ọkwa Gọvanọ nakwa ndị omeiwu nke steeti– Maach 6, 2027

Ọkwa ndị a ga-azọ na ntuliak 2027

Na ntụliaka 2027, ọkwa ndị a ga-azụ gụnyere:

  • Ọkwa Onyeisiala nakwa Osote Onyeisiala Naijiria
  • Ọkwa Gọvanọ nakwa Osote ya
  • Ọkwa ndị omeiwu Ụlọomeiwu Ukwu
  • Ọkwa Ụlọnnọchiteanya
  • Ndị ụlọmeiwu nke steeti

Steeti ndị agahị eso na ntuliaka ọkwa gọvanọ

Mana a gaghị enwe ntulika ọkwa gọvanọ n'ụfọdụ steeti na Naijiria dịka:

  • Anambara
  • Bayelsa
  • Edo
  • Ekiti
  • Imo
  • Kogi
  • Ondo
  • Osun