Ụlọikpe Lọndọn ekwuola na Diezani Alison-Madueke naara aka azụ ma mee nrụrụaka dị iche iche

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọikpe dị na Lọndọn ekwuola na Diezani Alison-Madueke bụbu mịnịsta mmanụ agbidi na Naịjirịa, naara aka azụ ma mee nrụrụaka dị iche iche nke gụnyere ịzụ ụlọ n'UK.
Ụlọikpe ahụ boro Madueke ebubo iji ego o nwetara site na nrụrụaka zụọ ụlọ na m aghara Buckinghamshire ma zụọ ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị oke ọnụahịa na Harrods.
Ụlọikpe Southwark Crown kwuru etu Alison-Maduke bụ minister mmanụ agbidi na Naịjirịa site na 2010 ruo 2015, si biri n'UK ma nweta ndị ọrụ dị iche iche nke ọ bụ ego o nwetara na nrụrụaka ka o ji akwụ ha ọgwụ.
Alison-Madueke gọnarịrị ebubo nrụrụaka ndị a niile ụlọikpe boro ya ma kwuo na aka ya dị ọcha.
Ikpe ya ga-aga n'ihu izuụka iri na abụọ.
End of Akụkọ ndị ọzọ gbasara Diezani Alison-Madueke

Ebe foto si, Getty Images
A kpụpụla Diezani Madueke n'ụlọikpe dị na London maka ebubo iri ngarị

Ebe foto si, Getty Images
A kpụpụla onye bụbu Minista mmanụ agbidi na Naịjirịa bụ Diezani Alison-Madueke n'ụlọikpe Southwark Crown dị na Lọndọn, mba United Kingdom maka nnụrụ ikpe ya n'ebubo iri ngarị.
Ikpe a bụ nke a tụrụ anya ịmalite nke ọma n'ụbọchị 26 Jenụwarị 2026.
Alison-Madueke bụ Minista nwaanyị mbụ hụrụ maka mmanụ agbidi site n'afọ 2010 ruo 2015.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ọ bụkwa nwaanyị mbụ bụ Onyeisioche otu jikọtara mba ndị na-ebupụ mmanụ agbidi bụ Organisation of Petroleum Exporting Countries (OPEC).
Madueke dị afọ 65 bụ onye e buuru ụzọ nwuchie na Lọndọn n'ọnwa Ọktoba 2015, mana e mechara gbapụta ya. Ọ gọnarịkwara ebubo isii e boro ya.
N'afọ 2023 ka ụlọọrụ na-ahụ maka mpụ na mba United Kingdom boro ya ebubo iri ngarị n'agbata afọ 2011 na 2015.
Ụlọọrụ ahụ sịrị "na ha na-enyo enyo na Diezani Alison-Madueke ji ike mee ihe n'ụzọ na-ezighị ezi na Naịjirịa ma nata onyinye ego maka inye ọrụ ruru nde paụnd.
Dịka ha si kwuo, Diezani ritere uru otu narị puku euro £100,000 ($134,000), ụgbọala ọkwụọtọ ekele eze, iji ụgbọelu nkeonwe eme njem nakwa inwe ọtụtụ ihe onwunwe na Lọndọn nakwa ihe ndị ọzọ.
A na-atụ anya na ikpe ya a ga-amalite n'ụbọchị Mọnde 26 Jenụwarị ga-erụ izuụka iri maọbụ iri na abụọ.
Mmadụ abụọ ndị ọzọ a kpọrọ aha n'ikpe a bụ Doye Agama, onye nke bịara n'ụlọikpe site n'ihe oyonyoo nakwa Olatimbo Ayinde, onye nke bịara n'ụlọikpe na mmadụ.






























