Ụlọikpe Lọndọn ekwuola na Diezani Alison-Madueke naara aka azụ ma mee nrụrụaka dị iche iche

Alison-Madueke bụ minister mmanụ agbidi na Naịjirịa site n'afọ 2010 ruo 2015

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụlọikpe Lọndọn ekwuola na Diezani Alison-Madueke naara aka azụ ma mee nrụrụaka dị iche iche
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ụlọikpe dị na Lọndọn ekwuola na Diezani Alison-Madueke bụbu mịnịsta mmanụ agbidi na Naịjirịa, naara aka azụ ma mee nrụrụaka dị iche iche nke gụnyere ịzụ ụlọ n'UK.

Ụlọikpe ahụ boro Madueke ebubo iji ego o nwetara site na nrụrụaka zụọ ụlọ na m aghara Buckinghamshire ma zụọ ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị oke ọnụahịa na Harrods.

Ụlọikpe Southwark Crown kwuru etu Alison-Maduke bụ minister mmanụ agbidi na Naịjirịa site na 2010 ruo 2015, si biri n'UK ma nweta ndị ọrụ dị iche iche nke ọ bụ ego o nwetara na nrụrụaka ka o ji akwụ ha ọgwụ.

Alison-Madueke gọnarịrị ebubo nrụrụaka ndị a niile ụlọikpe boro ya ma kwuo na aka ya dị ọcha.

Ikpe ya ga-aga n'ihu izuụka iri na abụọ.

Foto Alison-Madueke ka o si n'ụlọikpe apụ

Ebe foto si, Getty Images

A kpụpụla Diezani Madueke n'ụlọikpe dị na London maka ebubo iri ngarị

A na-atụ anya n’ikpe ya ga-amalite na Mọnde Jenụwarị abalị iri abụọ na isii ga-erụ izuuka ịrị ma ọ bụ iri na abụọ.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onye bụbu minista Naịjirịa na-ahụ maka mmanụ agbidi, Diezani

A kpụpụla onye bụbu Minista mmanụ agbidi na Naịjirịa bụ Diezani Alison-Madueke n'ụlọikpe Southwark Crown dị na Lọndọn, mba United Kingdom maka nnụrụ ikpe ya n'ebubo iri ngarị.

Ikpe a bụ nke a tụrụ anya ịmalite nke ọma n'ụbọchị 26 Jenụwarị 2026.

Alison-Madueke bụ Minista nwaanyị mbụ hụrụ maka mmanụ agbidi site n'afọ 2010 ruo 2015.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ọ bụkwa nwaanyị mbụ bụ Onyeisioche otu jikọtara mba ndị na-ebupụ mmanụ agbidi bụ Organisation of Petroleum Exporting Countries (OPEC).

Madueke dị afọ 65 bụ onye e buuru ụzọ nwuchie na Lọndọn n'ọnwa Ọktoba 2015, mana e mechara gbapụta ya. Ọ gọnarịkwara ebubo isii e boro ya.

N'afọ 2023 ka ụlọọrụ na-ahụ maka mpụ na mba United Kingdom boro ya ebubo iri ngarị n'agbata afọ 2011 na 2015.

Ụlọọrụ ahụ sịrị "na ha na-enyo enyo na Diezani Alison-Madueke ji ike mee ihe n'ụzọ na-ezighị ezi na Naịjirịa ma nata onyinye ego maka inye ọrụ ruru nde paụnd.

Dịka ha si kwuo, Diezani ritere uru otu narị puku euro £100,000 ($134,000), ụgbọala ọkwụọtọ ekele eze, iji ụgbọelu nkeonwe eme njem nakwa inwe ọtụtụ ihe onwunwe na Lọndọn nakwa ihe ndị ọzọ.

A na-atụ anya na ikpe ya a ga-amalite n'ụbọchị Mọnde 26 Jenụwarị ga-erụ izuụka iri maọbụ iri na abụọ.

Mmadụ abụọ ndị ọzọ a kpọrọ aha n'ikpe a bụ Doye Agama, onye nke bịara n'ụlọikpe site n'ihe oyonyoo nakwa Olatimbo Ayinde, onye nke bịara n'ụlọikpe na mmadụ.