'O nweghi onye gwara m na inye nwa ara na-afụ oke ụfụ'

Aha onyonyo, 'O nweghi onye gwara m na inye nwa ara na-afụ oke ụfụ'

Inye nwa ara bụ otu ihe mara mma nke ukwuu ma bụrụ etu Chukwu siri kee ya na nne ga-esi zụọ nwa ya ọ mụrụ ọhụrụ nrị mgbe ọ ka dị ọhụrụ,

Nke a kpatara na ọtụtụ niile ndị na-amụ nwa na-enye nwa ara.

Chukwu kere inye nwa ara ka ọ bụrụ ihe mara mma ga-enyere nne na nwa aka ka ha nwee ezigbo njikọ n'etiti ha makwa wulite ịhụnanya n'etiti nne na nwa.

Nwaanyị ọbụla mụrụ nwa ọhụrụ maọbụ na-akwado ịmụ nwa na-ele anya na ya ga-enye nwa ya ara.

Mana ọ bụkwanụ ihe akị ilu na-atọ na ntị ka ọ na-ada n'ọnụ?

Nwaanyị na-enye nwa ara
Nwaanyị na-enye nwa ya ara
Nkọwa foto, Nwaanyị inye nwa ara ekwesighi ịfụ ụfụ - Dkt Chinny Obinwanne

Inye nwa ara mara mma nke ukwuu ma bụrụ etu Chukwu siri kee ya mana ọ bụghị ọnatarachi dịka ọtụtụ si eche.

Nke a kpatara na ọtụtụ ụmụnwaanyị ji ebe akwa arịrị maka ihe ha na-ezute oge ha na-enye nwa ara.

Dịka a na-eme emume ncheta inye nwa ara nke afọ a, BBC Igbo gbara ụfọdụ ụmụnwaanyị ajụjụọnụ gbasara etu inye nwa ara ha siri gaa nakwa ihe e kwesiri ịgwa ụmụnwaanyị tupu ha amalite inye nwa ara.

Lee ihe ndị ha sara anyị n'onyonyo dị ebe a.