Ogbonnaya Onu, Akpabio... Lee ndị Mịnịsta gbara arụkwaghịm n'ihi ịzọ ọkwa ọchịchị

Mịnịsta na-ahụ maka Sayensị na Tekịnụzụ bụ Ogbonnaya Onu etinyela akwụkwọ arụkwaghịm.
O mere nke a iji rube isi n'iwu Onyeisiala Muhammadu Buhari tiiri ndị niile ọ nyere ọkwa ka ha gbaa arụkwaghịm ma ọ bụrụ na ha chọrọ ịzọ ọkwa ọchịchị ọbụla.
N'otu aka ahụ kwa, Mịnịsta na-ahụ maka mpaghara Niger-Delta bụ Godswill Akpabio agbakwaala arụkwaghịm.
Nke a mere ya ndị Mịnịsta atọ gbarala arụkwaghịm n'ime obi ọchịchị Buhari n'ihi na ha nwere mmasị ịzọ ọkwa ọchịchị.
Cheta na Mịnịsta nta na-ahụ maka agụmakwụkwọ bụ Chukwuemeka Nwajiuba tinyere akwụkwọ arụkwaghịm nke ya n'ụbọchị Wenezde.
Nwajiuba, Akpabio na Ogbonnaya agbatala akwụkwọ pati APC maka ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na 2023.
Mana ọ bụghị naanị mmadụ atọ a bụ ndị nọ n'ime obi ọchịchị Buhari chọrọ ịzọ ọkwa ọchịchị na 2023.
Ndị ọzọ gụnyere: Rotimi Amaechi (Mịnịsta Njem), Chris Ngige (Mịnịsta Ndị ọrụ), Timipre Sylva (Mịnịsta nta maka mmanụ agbịdị), Abubakar Malami (Mịnịsta ikpe ziri ezi), Uche Ogah (Mịnịsta igwupụta akụ ọnatarachi n'ala), na Pauline Tallen (Mịnịsta okwu ụmụnwaanyị.
Onye ọzọkwa bụ onyeisi ụlọakụ etiti bụ Godwin Emefiele, onye kepukepu kwurula na ọ na-achọ ịzọ ọkwa Onyeisiala.
Emeka Nwajiuba: Mịnịsta nta maka agụmakwụkwọ etinyela akwụkwọ arụkwaghịm

Mịnịsta nta na-ahụ maka agụmakwụkwọ bụ Emeka Nwajiuba etinyela akwụkwọ arụkwaghịm.
Nke a na-abịa dịka Onyeisiala Muhammdu Buhari nyere ndị ime obi ọchịchị ya iwu ka onye ọbụla n'ime ha chọrọ ịzọ ọkwa ọchịchị n'afọ 2023, gbaa arụkwaghịm.
Emeka Nwajiuba ekwuola na ya ga-azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa na 2023.
Ọ gbatala akwụkwọ ndị pati 'All Progressives Congress' maka nke a.
Ụlọọrụ ntaakụkọ Channels TV kwuru na ọ bụ ọnụ na-ekwuru Buhari bụ Garba Shehu gbaara ha ama na Nwajiuba agbaala arụkwaghị m n'ezie.
Lee ndị Onyeisiala Buhari nyere ọsọ n'obi ọchịchị ya

Ebe foto si, Nigerian Presidency
Onyeisiala Muhammadu Buhari asịla ndị obi ọchịchị ya a kpọrọ Federal Executive Council (FEC) chọrọ ịzọ ọkwa ọchịchị ka ha gbaa arụkwaghịm.
Ọ sị ha mee nke tupu ụbọchị Mọnde bụ 16 Mee, 2022.
Minista mgbasaozi bụ Lai Mohammed kwuru nke a n'ụbọchị Wednezde mgbe ha mechara nzukọ.
Ndị nke a metụtara gụnyere minista ikpe ziri ezi bụ Abubakar Malami, nke Njem bụ Rotimi Amaechi, nke Niger-Delta bụ Godswill Akpabio, nke ndị ọrụ bekee bụ Chris Ngige, nke Sayensị na Tekịnụzụ bụ Ogbonnaya Onu, nke osote agụmaakwụkwọ bụ Emeka Nwajiuba.
Ndị a niile azụọla akwụkwọ mmasị na ha chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala na pati APC.
Ndị ọzọ nke metụtara bụ minista na-ahụ maka ọnatarachi bụ Uche Ogah, onye na-azọ ọkwa gọvanọ Abia Steetị, minista ụmụnwaanyị bụ Pauline Tallen onye chọrọ ịzọ ọkwa Sinetọ.
Ọ sị na iwu a emetụtaghị osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo maka na ọ bụ onye a họpụtara na ntuliaka.
Mohammed sị na ọ bụrụ ihe gbanwee banyere iwu a na ọ ga-eme ka ọha mara.
Ụlọikpe Mkpegharị akụpụla mkpebi wepụrụ akụkụ 84(12) nke Iwu Ntuliaka afọ 2022

Ebe foto si, Uche Akolisa
Ụlọikpe Mkpegharị akụchapụla mkpebi nke Ulọikpe Ukwu Etiti dị n'ụmụahịa nke kagburu akụkọ 84(12) nke Iwu Ntuliaka afọ 2022.
Akụkụ 84 (12) nke Iwu Ntuliaka 2022 kwuru sị, : "O nweghị onye a họrọ n'ọrụ nchọrọndọrọ ọchịchị nke ga-abụ onye ga-atụli vootu na ntuliaka imeụlọ nke pati ọbụla maka ịhọpụta onye ga-azọọ ọchịchị n'aha pati na ntuliaka."
Na mkpebi ha, ndị ọkaikpe mmadụ atọ nyere mkpebi ahụ nke Jọstis Hamma Barka nọ n'isi ya kwuru na Ụlọikpe Ukwu Nke Etiti dị n'Ụmụahịa enweghị ikike ịge ikpe ahụ nke Nduka Edede gbara . Ihe a bú akúkó BBC Igbo na nkeji.
Ụlọikpe Mkpegharị kwuru na Edede enweghị ikike ịgba ya bụ akwụkwọ.
Cheta na n'ọnwa Maachị afọ 2022, Nduka Edede bụ onye ọkaiwu mabụrụkwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị otu 'Action Alliance' gbara akwụkwọ n'Ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị n'Ụmụahịa na-arịọ ka Ụlọikpe ahụ kagbuo Akụkụ 84(12) nke Iwu Ntuliaka 2022 maka imegide Akụkụ 66,107,137 na 182 nke Iwu Naijiria afọ 1999.
Ụlọikpe ahụ nke Justice Evelyn Anyadike nọ n'isi ya zara ekpere ya ma kpụpụ akụkụ 84(12) nke Iwu Ntuliaka afọ 2022 sị na o megidere iwu Naijiria.
Ọkaikpe Anyadike kwuru na onye ji ọrụ gọọmentị nọ n'ọkwa ọchịchị dịka iwu siri kwuo, nwere ohere itinye akwụkwọ arụkwaghịm abalị 30 tupu ụbọchị ntuliaka.
Agaghị m anọfe Mee 29 n'ọkwa onyeisiala - Buhari

Ebe foto si, Muhammadu Buhari/Facebook
Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buhari ekwuola na ya kwudosiri ike inyefe ọchịchị n'aka onye nkịtị n'ụbọchị iri abụọ na atọ nke ọnwa Mei afọ 2023 dịka ọ dị n'ịwụ Naijiria.
Nke a na-abịa otu ọkaiwu ukwu bụ Robert Clark(SAN) tụrụ alo ka e dowe Iwu Naijiria n'ụsọ ka Buharị nọrọ n'ọchịchị ọnwa isii ọzọ iji rụchaa ọrụ ya nke ọma.
Mana n'ọsịsa Buhari nke ọnụ na-ekwuru ya bụ Garba Shehu gbara n'anwụ n'ozi mgbasaozi o wepụtara, "Anyị na-ekwusị ike , na Onyeisala ga-arịtu n'abalị 29 nke ọnwa Mee afọ 2023 ka ọchịchịchara agba abụọ dịka Iwu siri kwuo."
"Dịka ọ bụ onye mbụ patị anọghị nọ ọchịchị natara ikike ọchịchị n'aka onye nọ n'ọkwa nke onye anaghị , Onyeisiala kwenyesiri ike na ịhụ na usoro ọchịchị onyekwuouche ya tọrọ atọ."
" Ọ ga-agba mbọ inyefe ike n'aka onye ọbụla a họpụtara na ntuliaka e mere n'ụzọ kwụ ọtọ."
Robert Clarke kpoburu oku ka Buhari gbatie ọchịchị ya ọnwa isi iji nye ohere ka egbo ọgụ ndakpọ nchekwa tupu ntuliaka afọ 2023 amalite.O kwuru na Iwu Naijiria nyere ohere ịji ọnwa isii gbatia ọkwa onyeisiala.
Anyị gburu ndị ofufe Kraịst 20 iji bọkwara onyeisi anyị e gburu - Boko Haram
Otu oyiegwu bụ Islamic State egosila ihe onyonyo ha ji akọwa na ha egbuola ndị okpukperechi nke Kraịst mmadụ iri abụọ na Borno Steeti.
Ndị mere ya bụ ihe onyonyo na-asụ asụsụ awụsa.
Ha kwuru na ha na-ebuso ndị ụka Kraịst agha ma sị na ndị ha gburu bụ iji bọkwata ogbugbu ndị isi ha abụọ na mpaghara 'Middle East' na mbido afọ a.
Enweghị etu a ga-esi amata ma ndị egburu ha abụ ndị ofufe Kraịst n'ezie.
Otu Islamic State West Africa Province nke bụ nnọchite anyas otu oyi egwu IS na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka na otu Boko Haram nọ na-agbagharịa dịka egburu ọtụtụ ndị otu ha na mpaghara Lake Chad.

Ebe foto si, Getty Images


































