World Cup Draw: Lee mba ndị ga-ezute onwe ha n’asọmpị iko mbaụwa 2022

Fifa ewepụtala aha mba ndị ga-ezute onwe ha n'asọmpị iko mba ụwa 2022
Nkọwa foto, Fifa ewepụtala aha mba ndị ga-ezute onwe ha n'asọmpị iko mba ụwa 2022

Otu nchịkọta egwu bọọlụ na mba ụwa bụ Fifa n'ịchafụ ewepụta mba ndị ga-ezute onwe ha n'asọmpị iko mbaụwa nke 2022 a ga-agba na mba Qatar.

Mba Briten ga-ezute mba Amerịka ebe mba Mexico ga ezute mba Argentina dịka akwụkwọ ozi Fifa siri depụta.

France bụ mba nwetere mmeri n'asọmpị a n'afọ 2018 ga-ezute Denmark ebe Portugal bụ mba Cristiano Ronaldo ga-ezute Uruguay.

Mba Qatar bụ mba a ga-anọ gbaa asọmpị a ga-ezute mba Netherland na oke nke 'Group A' ebe mba Brazil ga-ezute Switzerland, mba Belgium ga-ezute Croatia ebe Spain na Germany ga-achịpụ ya. Group a nke Spain na Germany nọ bụ nke mmapụ obi dịka ọtụtụ mba ndị nọ na ya bụ mba nd ọkaibe n'egwu bọọlụ.

Lee mba ndị ozọ ga-ezute onwe ha ebe a:

  • Group A: Qatar, Ecuador, Senegal, Netherlands
  • Group B: England, Iran, USA, Wales/Scotland/Ukraine
  • Group C: Argentina, Saudi Arabia, Mexico, Poland
  • Group D: France, UAE/Australia/Peru, Denmark, Tunisia
  • Group E: Spain, Costa Rica/New Zealand, Germany, Japan
  • Group F: Belgium, Canada, Morocco, Croatia
  • Group G: Brazil, Serbia, Switzerland, Cameroon
  • Group H: Portugal, Ghana, Uruguay, South Korea

Kedụ mgbe a ga-agba asọmpị Iko mbaụwa 2022?

Asọmpi a ga-amalite n'ụbọchị Mọnde, bụ ụbọchị 21 n'ọnwa Nọvemba dịka egwuregwu mmepe asọmpị ga-abụ nke mba Qatar na mba Ecuador n'ama egwuregwu Al Bayt dị na Qatar.

A ga-agba nzugbu nzugbu asọmpị ruo ụbọchị Fraịde bụ ụbọchị abụọ n'ọnwa Disemba tupu egwuregwu mgbapụ nke mbụ amalite n'ụbọchị atọ nke ọnwa Disemba 2022.

A ga-agba asọmpị ikpeazụ nke iko mbaụwa nke afọ 2022 n'ama egwuregwu Lusail n'ụbọchị 18 nke ọnwa Disemba 18.

Etu ama egwuregwu nke Qatar Foundation dị
Nkọwa foto, Etu ama egwuregwu nke Qatar Foundation dị

Kedụ maka usoro nchekwa n'aka ọria Covid-19?

Otu ahụike mba ụwa bụ WHO n'ịchafụ, ọtụ egwuegwu Fifa na mba Qatar enwela nkweọrịta n'ihibe usoro nchekwa ahụike ndị mmadụ n'asọmpị iko mbaụịwa nke 2022 a ga-eme na Qatar

Ha atọ kwuru na emume a ga-eso usoro nchekwa maka ọrịa covid nye ndị niile ga-abịa ya bụ asọmpị Qatar 2022.