Pius Okigbo: Ihe gbara ọkpụrụkpụ maka ndụ odogwu Igbo a

Ebe foto si, Patrick Okigbo III
Pius Nwabufo Charles Okigbo bụ odogwu wetaara ndị Igbo nakwa Naịjirịa niile aha ọma n'oge gara aga.
Ọ bụrụ na Pius Okigbo ka nọ ndụ, taa bụ abalị isii nke ọnwa Febụrụwarị afọ 2021 ka ọ gaara agba afọ iri itoolu na asaa.
Mana ọ bụ eziokwu na odogwu a alaala mmụọ kamgbe afọ iri abụọ na otu gara aga, aha ya ka na-ada ụda n'ụwa niile.
Ihe i kwesịrị ịma maka Pius Okigbo

Ebe foto si, Okigbo Family
- A mụrụ Pius Okigbo n'afọ 1924
- Ọ bụ onye Ojoto dị n'okpuru ọchịchị Idemmili South n'Anambra steeti
- Ezinụlọ Okigbo bụ nnukwu ezinụlọ a ma ama n'Ojoto dịka ha nwere ọtụtụ nnukwu mmadụ a nụrụ aha ha na Naịjirịa dịka Chris Okigbo na Patrick Okigbo
- Pius Okigbo gụrụ akwụkwọ Sekọndịrị n'ụlọakwụkwọ Christ the King College n'Ọnịcha,
- O gosiri ihe o ji bụrụ ọkaibe oge o nwetara nzere 'bacherlors degree' na ngalaba 'Economics' nke 'London University', mana ọ jighị ụkwụ ya abụọ gaa ụlọwkaụkwọ ahụ, kama ọ nọ na Naịjirịa gụọ ya nke a kpọrọ 'correspondence' n'oge ahụ
- N'eziokwu, nzere atọ ka Pius Okigbo nwetara n'ụzọ correspondece na 'London University' - B.A History, B.SC Economics, na LLB (nzere ọkaiwu)
- Pius Okigbo bụ onye Naịjirịa mbụ nwetara ụdị nturu ugo a
- O mechara nweta nzere 'Masters' nakwa 'Ph.D' na mahadum 'Northwestern University' nke mba Amerịka
- Ọ bụ ya bụ onye Afrịka mbụ nwetara Ph.D na mahadum a.
- Pius Okigbo dere ọtụtụ akwụkwọ gbasara mmụta 'Economics', nke mbụ bụ nke ọ kpọrọ 'Nigeria Public Finance' n'afọ 1956

Ebe foto si, okigbo memorial secondary school Ojoto
- Oge Biafra kewapụrụ na Naịjirịa, Pius Okigbo sonyeere Biafra
- Ọ bụ ya bụ onye na-enyere Odumegwu Ojukwu aka ikpezi nghọtahie dapụtara n'etiti ndị isi n'otu ndị agha Biafra
- Ka agha kwụsịrị n'afọ 1970, gọọmentị Naịjirịa tukpuru Pius Okigbo na mkpọrọ ruo otu afọ na ọkara
- Na 1977 o nwetara nkwanye ugwu 'Commander of the Order of the Niger (CON)
- Na 1983, e nyekwara ya nkwanye ugwu 'Nigeria National Order of Merit'
- Pius Okigbo bụ onyeisi kọmiti Onyeisiala Sani Abacha hibere ka ha hzigharịa ụlọakụ etiti (Central Bank) n'afọ 1994.
- Ruo taa, ihe a na-akpọ mpụtara nnyocha kọmiti a mere bụ 'Okigbo Report'
- Okigbo nwụrụ n'ọnwa Sepụtemba afọ 2000



























