Abia state: "Agaghị ebido akwụkwọ ruo mgbe gọọmentị gere anyị ntị" - NUT

Ụlọakwụkwọ
Nkọwa foto, World Bank Primary School, Umuahia North

Dịka ọ karịchara ọnwa atọ gọọmentị Abịa steeti nyere ikike ka ndị ụlọakwụkwọ prịamarị na sekọndrị malite akwụkwọ, ndị nkụzị ụlọakwụkwọ na steeti ahụ akpọọla ekwọ nkụ na ha agaghị agba ọnụ nkịtị na-agba aja. Makana agbara ọnụ na-agba aja, ọ na-ada aja aja.

Ndị nkụzị ndị a na-ata ikikirieze maka ụgwọ ọnwa iri na abụọ gọọmentị Abịa steeti ji ha.

Ndị mmadụ na-eti ma na-ebe ka gọọmentị leruo ndị nkuzị ndị a anya ngwangwa maka ọdịmma ụmụ ha na agụmakwụkwọ ha.

Ndị isi otu ndị nkuzi na steeti ahụ bụ Kizito Kalu nakwa odeakwụkwọ ha bụ oriakụ Nnanna Okonkwo akpọọla ekwo nkụ na ha agaghị amalịte ọrụ rụọ mgbe gọọmentị kwụrụ ha ụgwọ ha "makana ọdịghị ka onwere ihe gọomentị Abịa steeti na-eme maka ọnọdụ anyị".

Model Primary School 2

Ndị isi otu ọrụ ndị nkuzị a na-akọwa na ụgwọ ọnwa atọ a gọọmentị kwụrụ ha na Desimba 2020 bụ ụkaọchị na-ebe ụgwọ ọnwa iri na otu ha ji ha.

N'onu ya, "ka ọ dị ugbua, eji ndị nkwuzi sekọndịrị ụgwọ ọnwa atọ". Ya bụ anyị agaghị alahachị n'ọrụ rụọ mgbe ha kwuchara anyị ụgwọ".

Ụmụakwụkwọ na-agagharị ebe niile na-achụzị ego n'Umuahia nakwa Aba site na-ire ahịa maọbụ ịrụ ọrụ ndị ọzọ kemgbe emechiri ụlọakwụkwọ.

Chiemela Iroha
Nkọwa foto, Chiemela Iroha bụ onye nna nwere ụmụakwụkwọ

Onye nna bụ Chiemela Iroha sị na "ịhapụ ụmụaka ka ha na-akpagharị ghara ịgụ akwụkwọ nwere ezigbo ọgbatauhie n'ọdịnihu makana onye na-enweghị akaọrụ bụ ngwaọrụ ekwensụ", ọ ya mere o ji dị mkpa itinye uche ụmụaka a n'ọrụ tupu ha aghọọ ihe ọzọ".

Iroha tikwara mkpu maka ndị omekome na ga n'ụlọakwụkwọ ndị a ezu ohi.

Nmonwu Diana Ononeze, onye nkuzi na Model Primary School 2 ji obi nwute kọwaa agwa ọjọọ ana akpasa ndị nkuzị na steeti ahụ dịka o kwuru "na abụbụ ọrụ a bụ ụzọ ha ga-esi eme ka gọọmentị gee ha ntị maka ahụhụ ha na-ata".

Ononeze Diana
Nkọwa foto, Ononeze Diana bụ onye nkụzị n'Model Primary School 2 Umuahia

Ononeze bụ onye malitere ọrụ nkuzị kemgbe 2006 sị na-egwu na-atụ ya maka etu echi ụmụaka ahụ ga-adị dịka ọ na-akpọkụ gọọmentị ka ha were ọsọ were iji bịa lebe ọnọdụ ụlọakwụkwọ na nke ndị nkuzi anya.

Cheta na otu ndị ọrụ nkuzi bụ Nigeria Union of Teachers nke Abịa steeti na ụbọchị abụọ nke ọnwa Disemba 2020 degaara gọomentị steeti ahụ akwụkwọ ịdọ aka na ntị abalị iri abụọ na otu maọbụ ha agbaa abụbụ ọrụ a.

O kwuru na ọnweghị ihe gọọmentị na-eme gbasara ọnọdụ ha.

Dịka Kalu na-egosi nwute maka ya bụ ọgbata uhie so ya bụ abụbụ ọrụ, ọ sị na ha "agaghị ebido akwụkwọ ruo mgbe gọomentị gere anyị ntị".

Gịnị ka gọọmentị Abia steeti nwere ikwu?

We are meeting with them to resolve all the issues. So far, we paid them 3 months arrears in December 2020 and have paid one month in January 2021. Next week they will receive another one month to make up to 2 months in January. We will continue that way till we pay off all the arrears.

Kọmịshọna na-ahụ maka mgbasa ozi na steeti ahụ bụ John Okiyi Kalu gwara BBC Igbo na ha na ndị nkuzi a na-enwe mkparịta ụka iji dozie ya bụ okwu.

O kwukwara na gọọmentị Abia steti kwụru ndị nkuzi a ụgwọ ọnwa atọ n'ime nke ha ji ha n'ọnwa Disemba 2020 ma kwụọ kwa ha nke otu ọnwa n'afọ Jenụwarị 2021.

O kwuru sị, " Anyị ga-akwụ ha ụgwọ ọzọn'ime izuụka na-abịa nke ga eme ya ụgwọ abụọ n'ime ọnwa Jenuwarị".

Kalu kọwara na ọ ga-eme ya etu a tutu ha akwụcha ya bụ ụgwọ.

O kwukwara na ha na-atule ego ole atụmatụ TSS ndị nkuzi a kwuru ha chọrọ ga-eri gọọmentị.

O kwuru sị, " Anyị na-atụ anya na ndị nkuzi ga-alọhachi n'ụlọ akwụkwọ n'oge na adịghị anya, ndị nkuzi Abia steeti kacha ndị ọzọ mma nke mere na gọọmentị ga-eme ihe niile ha nwereike ime maka ọdịmma ha na-agbanyeghị ọtanịsị nọ na Naijirịa".

Ihe gọọmentị Abia steeti sara mgbe ajụrụ ha ọnwa ole ha ji ndị nkuzi

John Okiyi Kalu zara ajụjọ ọnwa ole gọọmenti Abia steeti ji ndị nkuzi were sị," ihe m gbọtara bụ na akwụọla ndị nkuzi prịmarị na Sekọndịrị ụgwọ ruo ọnwa Nọvemba afọ 2020 nke pụtara na ọ bụ nanị otu ọnwa ka eji ha n'ụgwọ".

Kama ụgwọ eji ndị nkuzi sekọndrị karịrị kama ọ bụ kwa ha ritere ụgwọ ọnwa ugboro atọ n'ọnwa disemba, otu n'izuụka gara aga ebe ha ga-erite ọzọ n'izuụka na-abịa"