Etu ndi 'unknown gunmen' a sị na-achụ Chris Uba siri gbuo ndi uweojii abụọ na Uga, Anambra steeti,

Ndịuweojii Anambara steeti ekwupụtala na ha amalitela ịma imi n'ala n' ịchụ ndị omekome gburu ndị otu abụọ na steeti ahụ na nso nso a.
Ndị omekataraihe daa ụjọ bu egbe wakporo onye ndọrọndọroo ọchịchị a ma ama bụ Chris Ubah dịka ya na ndị ọzọ na-eme njem n'ebeUga dị na okpuru ọchịchị Aguata, Anambra steeti, gbagbo ndị uweojii so ya na njem ahụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga kwuputara na ya bụ ihe mere n'ezie ma kwụọ na ndị uweojii ebidola ịchụ ndị omekome ahu gburu ndị otu ha.
Ikenga, onye kọwara na ihe ahụ mere ụbọchị Fraịde, sịrị na "ọ bu mgbe ndi uweojii na-eme ka ohere ịgafe diara ụgbọala ha so ka ndị omekeome ahụ waporo ha ma gbagbuo mmadu abuo”.
Peter obi bu Gọvanọ chịbụrụ Anambara steeti, akatọọla ihe mere, sị na ya bu mkpamkpa bụ " ịhe mgbawa obi", ma kpọ ọkụ ka ahara ịme mpahara ndịda anyawu dika obodo ebe ejịghị ndu mmadu kpọrọ ịhe.
Na okwu ya, “mkpamkpa ọjọọ nke mere ụnyahụ, 28 Disemba na Uga dị na Anambra steetị bu akụkọ na-agbawa obi.
Ndị ojiegbe gburu ndị uwe ojii abụọ bụ ndị na esọ ezigbo nwanne m nwoke bụ Chris Ubah. Nke a bụ ihe na-ewute nke ukwuu. Ọ dị nwute na katakata di na obodo anyị”
Obi gara n’ ihu rịọ ka ndị nchekwe nakwa ndị ọchịchị gbaa mbọ mee ka ụdị ajọ ihe a kwụsị.
Kemgbe afọ 2021, tigbuo-zogbuo na-akpọtụ n'Ọwụwa Anyanwụ.
Gọọmentị Etiti na ndị ọrụ nchekwa eboola otu nwereonwe Biafra a kpọrọ Ipob na Alaka ọgụ ha bụ ESN na-anyị ihe na-esi.
Mana ugboro ugboro, Ipob agọọla n'aka ha dị ọcha.




































