Ọ bụ ndị ụfụanya gburu nwanne m nwoke na South Africa - Monday Chukwunta

Ebe foto si, Monday Chukwunta
Monday Chukwunta bụ nwanne Chukwunta Friday Julius mmadụ anọ wakporo ma gbuo na mba Saụt Afrịka, ekwuola na ọ bụ ndị ụfụanya na ekworo kpara nkata ma gbuo nwanne ya nwoke .
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Monday Chukwunta kọwara nwanne ya nwoke dịka onye na-anaghị achọ nsogbu.
"Nwanne nwoke Julius, bụ otiegwu, ọ na-agba mbọ ịhụ na egwu ya malitere iwu ewu. Ọ bụghị onye na-achọ mmadụ okwu maọbụ bụrụ onye na-emekpa mmadụ ahụ n'ụdịrị ọbụla", ka Monday kwuru.
Ọ gara n'ihu mee ka a mara na tupu Julius anwụọ, nne ya rọrọ nrọ ebe ya na mmadụ na-azọ Julius.
N'okwu ya "Nke bụ eziokwu bụ na n'abalị ụbọchị ahụ nwanne nwoke nwụrụ, nne m rọrọ nrọ ebe ọ na-ebe akwa maka na ya na mmadụ na-azọ Julius na nrọ ahụ. Kemgbe nne m rọsirị nrọ ahụ, ọ malitere ịrịa ọrịa".
Monday gwara BBC na nne ya ka nọ n'akwa ọrịa. "Anyị agwaghị ya na Julius anwụọla,"
Ndị ọrụ nchekwa Midrand Protea Estate gbara nkịtị oge a wakporo ma gbuo Julius - Lumka Mgoqi

Ebe foto si, Monday Chukwunta
N'aka nke ọzọ, enyi nwaanyị Julius bụ gwara BBC na ndị ọrụ nchekwa ogige obibi Midrand Protea Estate, gbara nkịtị ma na-ekiri n'anya dịka mmadụ anọ ahụ wakporo Julius n'abali Satọde, 7 Disemba, 2024.
Oge esemokwu ahụ maka ọdụụgbọala ahụ malitere n'etiti Julius na mmadụ anọ ụgbọala ha nọchiri Julius ụzọ, Julius gara ime ka ndị ọrụ nchekwa ogige ahụ mara ihe na-eme. Ọ bụ oge ọ na-aga ka otu onye n'ime mmadụ anọ ahụ tụrụ ya okwute n'isi. Okwute ahụ kupuru ya isi nke mere ka ọbara malite ịpụ ua n'ahụ nike n'ike.
"Oku niile m kpọrọ maka enyemaka amịtaghị mkpụrụ ọbụla, ndị ọrụ nchekwa emeghị ihe ọbụla n'agbanyenghị na Julius bi n'ogige ahụ, enweghị onye ọbụla nyere m aka ibuga Julius ụlọọgwụ oge ihe anụ mere", ka nwaada Lumka kwuru.
Gọọmenti Naịjirịa ejighị ndụ ụmụafọ ya bi na Saụt Afrịka kpọrọ ihe dị mkpa - NICASA

Ebe foto si, NICASA Website
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Onyeisi otu Nigeria Citizens Association South Africa (NICASA) bụ Ụkọchukwu Frank Onyekwelu, ekwuola na gọọmenti Naịjirịa ejighi ndụ ụmụafọ ya bi na Saụt Afrịka kpọrọ ihe ọbụla.
Ụkọchukwu Onyekwelu kwuru nke a dịka ọ na-akatọ ọnwụ Chukwunta Friday Julius gbara afọ 37 e gburu na mpaghara Midrand, mba Saụt Afrịka.
Ụkọchukwu Onyekwelu kwuru na ọ bụ esemokwu maka ọdọụgbọala na Midrand's Protea Estate bụ ihe butere ọnwụ Chukwunta Friday Julius.
N'okwu ya, "Esemokwu ahụ malitere dịka otu nwaafọ Saụt Afrịka ji ụgbọala ha nọchie ebe Julius na-adọba ụgbọala ya n'ọdụụgbọala dị n'ogige ahụ". Nke a butere ọgụ nke mere ka mmadụ anọ nọ n'ụgbọala ahụ malite iti Julius ihe ebe otu onye tụrụ ya okwute n'isi, ọ bụ nke butere ọnwụ ya.
Ka ọ dị ugbua, ụlọọrụ NICASA na-agba mbọ izigara ezinaụlọ Chukwunta Friday Julius ozi maka ọnwụ ya.
Ụkọchukwu Onyekwelu gara n'ihu kwuo na ọ dị mmwute na gọọmenti Naịjirịa enweghị ezi ebumnobi banyere nchekwa ndụ ụmụafọ Naịjirịa bi na Saụt Afrịka. Ọ kọwara na ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa anwụọla n'ụzọ dị iche iche na Saụt Afrịka mana gọọmenti Naịjirịa gbara nkịtị.
Ọ kpọrọ oku ka gọọmenti rụọ ọrụ dịịrị ya iji hụ na ndị Naịjirịa bi na Saụt Afrịka nwere nchekwa zuruoke.
Ndị uweojii anwụchiela mmadụ anọ maka ọnwụ nwaafọ Naịjirịa na mba Saụt Afrịka

Ebe foto si, MIDRAND POLICE STATION
Ndị uweojii Midrand, mba Saụt Afrịka anwụchiela mmadụ anọ a na-eyo enyo na aka ha dị n'ọnwụ nwaamadị Naịjirịa aha ya bụ Chukwunta Friday Julius.
Akwụkwọozi ndị uweojii wepụtara kwuru na mmadụ anọ ahụ busoro Chukwunta Friday Julius bi n'ogige obibi Midrand's Protea Estate agha ụbọchị Satọde, 7 Disemba, 2024.
Akụkọ kwuru na ndị ọrụ gbatagbata bugara Chukwunta Friday Julius ụlọọgwụ Tembisa ebe ọ nọ nwụọ ụbọchị Tuzde, 10 Disemba, 2024 dịka ọ na-enweta nleta n'aka ndị dọkịnta.
Onyeisi mgbasaozi ndị uweojii Midrand bụ Lieutenant Colonel Mavela Masondo kwuru na ndị ọrụ ha gbara mbọ chọpụta ma nwuchie mmadụ anọ ahụ ụbọchị Wenesde 11 Disemba, 2024 ma kpụpụ ha ụlọikpe ụbọchị Fraịde, 13 Disemba, 2024.






























