Boko Haram, ndị ọchiehi, ndịagha Jihad na otu ndị ọzọ na-ebute nsogbu nchekwa na Naịjirịa

Ekperima nọ n'ọhịa na Zamfara
Nkọwa foto, Ọtụtụ ndị ekperima a kpọrọ 'bandits' bụ ndị otu ndị omekome juru ọhịa akpa ike
    • Onye dere ya, Chiagozie Nwonwu
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Africa
    • Ebeg o si, Lagos
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Naịjirịa na-agabiga nsogbu nchekwa n'aka nri na akaekpe dịka ntọ na mwakpo narị ibe ya elu.

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald trump hụtara ya dịka mgbusịsị ndị otu ụka Kraist na aghọtaghị na ihe na-aeri Naijiria nri n'afọ n'okwu mana ihe na-ebe karịrị nke a.

E nwere otụtụ otu di iche iche na-awa Naijiria agba n'okwu nchekwa na mpaghara dị iche iche na Naijiria.

'Ndị 'Bandits' - otu ntọ

Ndị omekome a kpọrọ 'bandíts' na Bekee ndị ọtụtụ n'ime ha bụ ndị Fulani na-achị ehi so na ha.

Ụfọdụ ha juru na Naijiria ahapụla mkpara ha ji achị ehi buru egbe akpaghara na steeti di iche iche na Naijiria – kemgbe mba Libyais kposaa dịka a kwaturu Muammar Gadaffi n'ọkwa onyeisiala Libya.

Ihe na -akpalite mụọ ndị 'ekperima abụghị okwu okpukperechi maọbụ ndọrọndọrọ ọchịchị, ihe dị ha mkpa bụ ego ụtụisi ha na-anata ndị ha tọọrọ nke ka na-enye ha ego karịa ichịgharị anụmanụ.

Ha enweghị otu onye isi, kama, otu ọbụla nwere onye ha na-arụrụ ọrụ. Ndị uweojii etinyele ego n'isi ụfọdụ ndị ndu ha ka dịka Ado Aleru and Bello Turji.

Boko Haram - Otu agha jihad

Otu ọzọ bụ out Boko Haram bụ ndị kpọrụ akpọtụ na n'afọ 2017 maka ị torọ ụmụaka nwụnanyị na-aga akwụkwọ na obodo Chikok ọnụọgụgụ ha karịrị narị abọụ bụ ndị a ka na-achọ mmadụ 90 n'ime ha.

Otu ụka Alakụba nke Mohammed Yusuf hibere n'afọ 2002 na Maiduguri nwere ebumnobi ihie agha okwukwe Jihad nakwa inwe mba nwere naani okpukperechi Alakụba. Ọ bụ ogbugbu e gburu Yusuf n'afọ 2009 dịka ọ nọ n'aka ndị uweojii mere ka otu a fesaa ka akwụkwọ ụgbaka, ma nwee nkewa dị iche iche.

Oge Abubakar Shekau bụ onye ndụ Boko Haram, otu a weghara ọnọdụ n'ụfọdụ ebe na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ-Ugwu . ma tinye ndị 'emir'dịka ndị ndu ụfọdu obodo. Ike Boko Hara m dajụrụ mba afọ anọ gara aka dịka e gburu Shekau.

Boko Haram na-awakpo ụlọakwụkwọ, ụlọ Alakụba, obodo dị n'ime obodo.

Iswap - otu si na Boko Haram kewapụta

Mana Boko Haram kewara, nwee alaka gụnyere out 'Islamic State in West Africa Province'(Iswap) bụ nke Abu Musab al-Barnawi, bụ onye e chere na ọ bụ nwa Mohammed Yusuf bụ onye ndu ha. Nkwenye out a malitere n'agbata afọ 2016 bụ na Shekau na-ada iwu ndị Alakuba site igbu ndị Moslem.

Boko Haram na -eji ndị nanya ogbunigwe n'ahụ awakpo Ahịa na ụlọụka Alakụba, ebe ndị Iswap na—agbara igbu ndi nkịta bụ moslem ọsọ ka ma ha na-etinye anya n'igbu ndịagha na ndị gọọmentị.

Na nsonso a,a tụrụ out onye ndu Iswap bụ Hussaini Ismaila mkpọrọ afọ iri abụọ maka ọtụtụ mwakpo o mere n'afọ 2012.

Ansaru - otu si Boko Haram kewapụta

Otu ọzọ na-anyụnye Naijiria mamịrị n'ọnụ bụ otu Ansaru nke bụ out si Boko Haram Kewapụta.

A na-eche na ọ bụ ha mere mwakpo ụgbọ oloko si Abuja aga Kaduna gbuo mmadụ asaa ma tọrọ mmadụ out narị n'afọ 2022. Onye ndu ha bụ Khalid al-Barnawi, bụ onye a nwụchiri kemgbe afọ 2016 maka ogbunigbwe a tụrụ n'ụlọọru UN n'Abuja n'afọ 2011 nakwa mwakpo ndị ọzọ.

Mahmuda - otu si Boko Haram kewapụta

Otu ọzọ na-akpa ike bụ Mahmuda bụ ndị e chere si Boko Haram kewapụta

Ha na-aga n'ime ime obodo jiri asụsụ Awụsa agbsa oziọma Alakụba bụ ndị e chere na out Iswap nwere mmekọrịta.

Ha na-eji ọgbatumtum eme mwakpo na ahịa nakwa obodo, ndị nche dike ha merela n'ụfọdụ ebe n'Ọdịda Anyanwụ Naijiria dịka Kwara, Niger na Kebbi steeti.

A graphic showing the number of people killed in armed attack across Nigeria from January 2014 to 21 November 2025, according to Acled.

Lakurawa -otu agha Jihad

Otu ọzọ bụ Lakurawa nke bụ otu agha jihad na-akpa ike na Sokoto, Kebbi na Niger steeti.

Na mbụ, ha dowere onwe ha ka ndị na-echekwa ndị obodo n'aka ndị ekperima mana tụgharịa malite imekpa ndị mmadụ ahụ.

Ha na-enyocha ekwentị machi ndị mmadụ ige egwu ha si megidere Islam. Mana n'afọ 2025, gọọmentị machiri ha maka ị na-atọrọ mmadụ iji napụ ya ego nakwa ịwakpo ndị ọrụ gọọmentị welitere isi.

JNIM - Otu agha jihad nọ n'ịkpa Sahel

Ọzọ bụ otu , Jama'at Nasr al-Islam wal Muslimin (JNIM) bụ otu jihad na-akpa ike na mba

Mali na Burkina Faso, bụ nke a sị na-abata na Naijiria.

N'ọkụtoba afọ 2025, ha kwuru na ọ bụ ha mere mwakpo mbu ha na Kwara Steeti bụ ebe a tọr mmadụ iri atọ n'ụlọụka .

Ọ bụrụ n'akụkọ ahụ bụrụ eziokwu, ị mara na nsogbu Ansaru, Lakurawa, Mahmuda, ndị ekperima na Boko Haram ka atawanye akpụ.

Ndị ọchịehi - nke ha na ndị ọrụgbo na-akwata

Otu ọzọ bụ ndị Fụlani ọchịehi bụ ndị ha na ndị ugbo na-akwata na Benue,Taraba, Platu na steeti ndị ọzọ dị n'etiti Naijiria bụ ebe gbuo m, m gbukwara buterela nsogbu ndị si obodo ha gbaa ọsọ ndụ.

Ipob - otu nnwereonwe

Ndị otu Ipob

Ebe foto si, Screengrab

Otu ọzọ aka ha dị na nsogbu nchekwa bụ otu nnwereonwe Biafra a kpọrọ Ipob n'ịchafụ nke Onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu bụ onye a tụrụ mnga mkpụrụ ọka na nsonso a maka ebubo iyi ọha egwu.

Otu a, alaka ọgụ ya bụ ESN, no na steeti ise dị n'Ọwụwa Anyanwụ egbuola ọtụtụ ndị welierere isi n'a mpaghara ahụ, ha na-amanye ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ kwa Monde nke butere nsogbu akụnaụba.