Ụmụnwaanyị ọwụwa anyanwụ kachasị agụ akwụkwọ na Naịjirịa - Ndekọ

Ebe ụmụ nwaanyị Igbo gbakọrọ

Ndekọ nke ụlọọrụ akpọrọ Statisense wepụtara nsonso a egosila na a bịa n'ihe gbasara agụmakwụkwọ, ụmụnwaanyị ọwụwa anyanwụ bu ọkaibe na Naijirịa.

Agụmakwụkwọ a a na-ekwu maka ya bụ nke Bekee kpọrọ 'Literacy' ya bụ ịma agụ,ede ma marakwa asụ Bekee.

Mpaghara bụ nke abụo na-esote ọwụwa anyanwụ bụ mpaghara etiti ndida ebe ọdịda anyanwụ so ya n'azụ.

Mpaghara atọ bụ nke ikpeazụ bụ mpaghara etiti ugwu, ọwụwa anyanwụ ugwu nakwa ọdịda anyanwụ ugwu.

Ndekọ ụlọọrụ ahụ gosikwara na n'agbanyeghi na ụmụnwaanyị ala Igbo bụ mbụ n'agụmakwụkwọ, ọnụọgụgụ ụmụnwaanyị gụrụ akwụkwọ ejirila pasentị 16.8 datuo n'ime afọ ise na Naịjirịa niile.

Ụmụnwaanyị si ọwụwa anyanwụ bu ụzọ n'agụmakwụkwọ.

Ebe foto si, Statisense/Twitter screenshot

Ụmụnwaanyị ndị e lere anya iji nweta ngụkọ a bụ ndị sị afọ 15 rue afọ 49 na Naịjirịa niile.

Ndekọ ọzọ gosikwara na Imo steeti bụ mbụ na steeti ndị ọwụwa anyanwụ ebe ụmụnwaanyị ha gụrụ akwụkwọ.

E wepụtakwara steeti iri bụ mbụ n'ime steeti iri atọ na isii ndị e nwere na Naịjirịa.

Imo bụ mbụ, Anambra so ya, Ebonyi, Lagos, Enugu, Abia,Akwa Ibom, Rivers, Edo, na Delta bụ ndị ọzọ.

Mgbe e si n'agbụrụ dị icheiche mee nyocha a, ụmụnwaanyị Igbo bụkwa mbụ. Lee etu e si depụta ya:

  • Igbo 74.2%
  • Edo 74.2%
  • Yoruba 70.3%
  • Tiv 68.4%
  • Ijaw 63.3%
  • Ibibio 57.7%
  • Hausa 42.2%
  • Kanuri 40.8%
  • Fulani 26.2%
  • Ndi ọzọ 53.7%
Ndekọ ndị kachasị mara akwụkwọ na Naịjiria

Ebe foto si, Statisense/Twitter/Screenshot

Gịnị kpatara nke a?

Otu onye ọnụ na-eru n'okwu aha ya bụ Azuka Onwuka kọwatụrụ ihe nwereike ịkpata ihe a.

Ọ sị na nwoke Igbo nkịtị ka ga-eziga ụmụ ya ndị nwaanyị ụlọ akwụkwọ karịa ụmụ nwoke.

O kwukwara maka ụmụ nwoke ndị na-azụ nwunye ha na Mahadum n'agbanyeghi na ha agụchaghi ụlọakwụkwọ pramarị maọbụ kwụsị na nke Sekọndrị.

"Nwoke Igbo bụ onye nwereike ịkwụsị akwụkwọ, malite ịgba boi iji zụọ ụmụ nwanne ya ndị nwaanyị n'ụlọ akwụkwọ", dịka ọ kọwara.

O kwuru na ụmụ nwoke ndị Igbo kwenyere na nke a n'ihi na n'uche ha, ụmụ nwaanyị na-agụghị akwụkwọ ga-ata ahụhụ na ndụ ha.