Kedụ ndị bụ ndịagha nnupụisi Houthi nke Yemen?

Ebe foto si, Getty Images

Ndịagha nnupụisi Houthi bụ ndị bị na mpaghara akụkụ Yemen amaala ọkwa na mgbe na-adịghị anya na ha ga-awakpọ ụgbọmmịri nịle si n' Okeosimiri Uhie(Red Sea) na-aga Izrel.

N' ọnwa Novemba, ndịagha nnupuisi Houthi wakporo ụgbọmmiri bu ngwaahịa n' okeosimiri a na-enyo enyo na ọ bụ onye Izrel nwe ya.

N' onwa abụọ gara aga, ha ejịrịla 'drone' na ogbunigwe were wakpoo ụgbọmmịrị na-ebu ngwaahịa.

Kedu ka ihe ndị Houthi na-eme si emetụta ndi Izrel?

Ebe foto si, Getty Images

Kemgbe ndị Izrel bidoro agha na Gaza n' ọnwa Ọktọba afọ 2023, ndị Houthi atụọla ọgbụnịgwe gara nsọ n' Izrel.

Ndịagha Amerịka kwuru na ha kwụsịrị ọtụtụ 'drone' na ogbunigwe ndị Houithi turu n' okeosimir nakwa ndị dara ebe Ijipt.

N' ọnwa Nọvemba 2023, ndị nnụpụịsị Houthi kwuru na ha jidere ụgbọmmiri ndị Izrel, buru ha laa n' akụkụ mmịrị ndị Ijipt.

Ndị Izrel kwuru na ụgbọmmiri ahụ abụghị nke ha

Mana akụkọ kwuru na o nwere ike ịbụ onye Izrel nwe ya.

Kemgbe ụbọchị nke atọ n' ọnwa Disemba, ndị Houthis ji dụrọọnụ na ọgbụnịgwe wakpọọ ọtụtụ ụgbọmmịrị ha sịrị na akụkụ mmịri Yemen nwere tụọ.

Ndị US, UK na French kwuru na ha nwụchịrị ma kwụsị ọtụtụ ihe ahụ ndị Houthis turu mana o metụtara ụfọdụ ụgbọmmiri.

Kedu ndị bụ ndị agha nnụpụịsị Houthi? Kedụ ihe ha chọrọ?

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Drone kpọkasịrị e si Yemen zipu n'Abu Dhabi,isiobodo United Arab Emirate n'afọ 2022
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Houthi bụ ndịagha ọlụọ-ọlaa, ndị Alakụba nke Shia, nke Zaidis sịtere na mba Yemen.

E hiwere otu ahụ n' ebe afọ 1960 maka ịbụsọ mpụ n' ọchịchị onyeịsịala Yemen bụ Ali Abdullah Saleh agha.

Ha nwetara aha ha site n'aka onye gụzọwere ha bụ Hussein al Houthi.

Ha na-akpọkwa onwe ha "Ansar Allah" maọbụ ndị na-eso Chineke.

Mgbe ndị Amerịka wakpochara Iraq n' afọ 2003, ndị Houthis kpebịrị ka ha nwee okwu njirimara ha bụ, “Chineke dị ukwuu. Ọnwụ dịrị ndị Amerịka. Ọnwụ nye Izrel. Kpochaa ndị Juu, na mmeri maka Alakuba”.

Ha na-ekwupụta na ha bụ akụkụ nke ndị Iran na-edu nke nguzogide; megide Izrel,Amerịka na mba ofesi – Ha kwụnyere Hamas na Hezbollah.

Nke a na-akọwa ihe kpatara ndị Houthis ji na-awakpo ụgbọmmiri na-aga Izrel na Gulf, dịka Hisham Al-Omeisy, ọkachamara na Yemen na European Institute of Peace si kwuo.

O kwuru na, “Ugbu a, ha na-alụso ndị chọrọ ịchịgharị ọgụ, ha na-alụso ndị iro nke mba Islam ọgụ. Nke ahụ dabara nke ọma na ntọala ha”.

Kedụ ka ndị Houthi si weghara akụkụ buru ibu nke Yemen?

Ebe foto si, Getty Images

Ndị Houthis nwetara nnukwu ike ndọrọndọrọ ọchịchị na Yemen na mbido afọ 2014, mgbe ha biliri megide Ali onye nọchiri Abdullah Saleh dịka onyeisiala, Abdrabbuh Mansour Hadi.

Oge ha na Saleh bụ onye iro ha mbụ nwere nkwekọrịta - ha bu n'obi iweghachi ya n' ọkwa ọzọ.

Ha weghaara mpaghara Saada nke dị na mgbago ugwu Yemen na mbido afọ 2015.

Ha weghaara isiobodo Sanaa, na-amanye Onyeisiala bụ Hadi ịgbapụ ma gbagaa na mba ọzọ.

Ndị Saudi Arabia, bu agbata obi Yemen tinyere aka ma jiri agha were nwaa ịchụpụ ndị Houthis ma weghachi onyeisiala ha, Hadi n' ọchịchị.

Ndị United Arab Emirates (UAE) na Bahrain kwadoro ya.

Ndị Houthis lụrụ ọgụ megide mwakpo ha ma nọgide na-achịkwa nnukwu akụkụ Yemen.

Ha gburu Ali Abdullah Saleh n' afọ 2017 mgbe ọ gbalịrị ịgbanwe sonyere ndị Saudi.

Kedụ onye na-akwado ndị agha nnupụisi Houthi?

Ebe foto si, Getty Images

Ndị agha nnupụisi Houthi na-eṅomi onwe ha na ndịagha Shia na Lebanon, Hezbollah.

Hezbollah na-enye ha nnukwu nka na ọzụzụ e jị alụ agha kemgbe afọ 2014, dịka ụlọọrụ nnyocha Amerịka na-alụso iyi ọha egwu ọgụ, si si kwuo.

Ndị Houthis na-ewerekwa Iran dịka ndị ya na ha na-emekọ, n'ihi na Saudi Arabia bụ onye iro ha.

A na-enyo enyo na Iran na-ebunye ndị agha nnupụisi Houthi ngwaọgụ.

Amerịka na Saudi Arabia kwuru na Iran butere ngwa agha 'ballistic missile' nke ndị Houthis gbara n' isiobodo Saudi Arabia bụ Riyadh, n' afọ 2017, mana nke ahụ erụghị ala.

Saudi Arabia boro Iran ebubo inye ndị Houthis ngwaagha ụgbọmmiri na 'drones' ha ji wakpo ụlọọrụ ebe a na-amị mmanụ nke ndị Saudi n' afọ 2019.

Ndị Houthis agbaala puku kwuru puku ngwaagha dị mkpụ mkpụ na Saudi Arabia, ma nweekwa ebuso agha na UAE.

Ibunye ndị Houthisa ngwaagha ndị a ga-emebi mmachibido iwu nke UN.

Mana ndị Iran gọrọ na ha emeghị otu ahụ.

Kedụ ka ndị agha nnupụisi Houthi siri dị ike? Kedụ mpaghara Yemen ha na-achịkwa?

Gọọmentị ha ka anakpọ ´Ọbakọ ndị ọchịchị” nke Onyeisiala ha bụ Abdrabbuh Mansour Hadi bufere ikike ya n' ọnwa nke anọ, n’ afọ 2022.

Ọ dabere n' isiobodo Saudi Arabia, Riyadh.

Na-agbanyeghị, ọtụtụ ndị Yemen bi na mpaghara ndị Houthi na-achị.

Ndị Houthi na-anakọta ụtụ n'akụkụ ugwu nke mba ahụ, na-ebipụtakwa ego.

Ngalaba otu UN, na-ahu maka nchekwa, onye ọkachamara na ịhe gbasara ndị Houthi, Ahmed al-Bahri, onye kwuru na ka ọ na-eru n' afọ 2010 ndị Houthi nwere ndị sọ n' otu ha ruru bido na mmadu 100,000 rụọ na mmadu 120,000, nke mejupụtara ndịagha ha nakwa ndị nkịtị.

UN kwukwara na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụmụaka 1,500 nke ndị nnupụisi Houthi Yemen kpọgoro n'ọrụ nwụrụ na na-alụ ọgụ na 2020, yana ọtụtụ narị ndị ọzọ n'afọ na-esote.

Ndị nnupụisi Houthi na-achịkwa akụkụ buru ibu nke Okeosimiri Uhie, ebe ha si na ya pụta ịmalite mwakpo ụgbọmmiri na-ebupu ihe.

Mazị al-Omeisy kwuru na mwakpo ndị a enyerela ha aka na mkparitaụka udo ha na Saudi Arabia.

Ọ sịrị, "Site n'igosi ndị Saudi na ha nwere ike mechie Bab al-Mandab - Oké Osimiri Uhie- ha na-etinyekwu nrụgide na Saudi mgbe ha na-akpọ maka nkwenye."