Ihe dị na nnyocha Amerịka mere banyere mkpagbu ndị ụka Kraịst na Naịjirịa

Ebe foto si, Rep. Riley Moore/X
Onyeomeiwu mba Amerịka bụ Riley Moore ewepụtala akwụkwọ nnyocha ha mere banyere akụkọ mkpagbu ndị ụka Kraịst na Naịjirịa ma ziga ya n'obi ọchịchị ha bụ "White House'
N'akwụkwọ ozi ahụ, o kpughere ọtụtụ ihe dị iche iche ha chọpụtara nke gụnyere na "Naịjirịa bụ ebe kachasị ọjọọ n'ụwa ịbụ onye okpukperechi Kraịst."
Ozi a kwuru ndị ojiegbe si agbụrụ Fulani nakwa ndị otu ozọ na-eyi ndụ egwu na-awakpo ma na-egbusi ndị ụka Kraịst, ọkachasị na mpaghara ugwu.
O Kwuru na ụfọdụ iwu dị ire na mpaghara ugwu Naịjirịa ka e ji egbochi ikike nkwuwa okwu ma na-akpagbu ndị Kraịst bi na mpaghara ahụ.
Omeiwu Riley Moore na ndị otu ya tụrụ arọ usoro e nwereike iji kwụsị ma gbochie mkpagbu ndị a.
Akwụkwọ ozi a pụtara dịka Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump gbọpụtara Naịjirịa dịka mba a na-elekwasị anya dị aṅaa a kpọrọ 'Country of Particular Concern' n'ọnwa Ọktoba 2025.
Onyeisiala Trump nyere omeiwu Riley Moore na ndị ọzọ iwu ka ha mee nnyochaa banyere akụkọ ogbugbu a na-egbusi ndị ụka Kraịst na Naịjirịa.
Mana gọọmenti Naịjirịa jụrụ ịnabata mkpọpụta ahụ ma kwuo na Naịjirịa nsogbu nchekwa nke na-emetụta ma ndị ụka Kraịst, ndị okpukperechi Alakụba nakwa ndị ọdịnala.
Lee ụfọdụ ntọala ha wepụtara e nwereike iji gbochie ogbugbu ndị Kraịst
N'akwụkwọ ozi ahụ tụrụ arọ ihe ndị enwereike ime nke gụnyere;
Ka gọọmenti Naịjirịa kagbuo iwu Sharia na kwulu okpukperechi
Ihiwe nkwekọrịta n'etiti Naịjirịa na Amerịka n'ihi banyere nchekwa ndị ụka Kraịst ma kpochapụ ndị na-eyi ndụ egwu.
Wezuga ndị ojiegbe Fulani gbachiri ọtụtụ ọrụ ugbo ndị mmadụ ma mee ka ndị mmadụ gbara ọsọ ndụ lọghachite n'obodo ha.
Ka a machie ma kwụsị ndị maọbụ otu ọbụla aka ha dị n'ịkwado ogbugbu ndị mmadụ na Naịjiria ka ha ghara inwete akwụkwọ njem Visa.
Ịkwụsị enyemaka ego mba Amerịka na-enye Gọọmenti Naịjirịa ruo mgbe ha ga-akwụsị ogbugbu a na-egbu ndị ụka Kraịst.
Ịchọ ụzọ napụta ndị ojiegbe Fulani ngwaagha site n'igbochi ha ibupu maọbụ ire anụ ehi na mba ndị dịka Ivory Coast, Ghana, Saụt Afrịka na Senegal.
Arọ ọzọ gụnyere inwe ezi mmekọrịta ha na mba ndị dịka Fransị, Hungari na Briten.
Ikpochapụ iwu Sharia, otu Hisbah na ihe ndị ọzọ ndịomeiwu Amerịka chọrọ ka gọọmenti Naịjirịa mee

Ebe foto si, US Appropriations House/Bola Tinubu
Ndị omeiwu mba Amerịka na-ebe anya maka akụkọ etu e si akpagbu ndị ụka Kraịst na Naịjirịa nwere mkparịtaụka iji kwụpụta ihe ndị ha chọpụtara n'ebubo a.
Nke a na-abịa dịka Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump nọọrọ n'ọnwa Ọktoba afọ 2025 kwupụta Naịjirịa dịka mba e kwesịrị ilebanya pụrụiche n'ihi akụkọ ogbugbu ndị ahụ.
Trump kwuru na ọ bụrụ na gọọmenti Naịjirịa emeghi ihe ọbụla iji gbochie nke a na ọ ga-ata ndị ndu mba Naịjirịa ahụhụ ma weere ndịagha Amerịka wakpoo ndị ekperima ahụ na-akpa ike na mpaghara ugwu.
Trump nyekwara ndị a omeiwu mba Amerịka iwu ka ha leba anya n'ebubo ma zitere ya ozi banyere ihe ha chọpụtara.
Ugbua ndị omeiwu mba Amerịka elebala anya na nke a ma wepụta ụfọdụ ihe ndị ha chọpụtata nakwa atụmatụ ihe ndị ha chọrọ ka gọọmentị Naịjirịa mee.
Lee ụfọdụ ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ ha kwuru na nzukọ ahụ.

Ebe foto si, US Appropriations House
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Kọmitii ndị omeiwu mba Amerịka nke onyeisioche ha bụ Díaz-Balart kwupụtara ọtụtụ ihe ma tụọ arọ ihe a ga-eme iji gbochie 'ọnọdụ ogbugbu ndị ụka Kraịst na Naịjirịa.
Diaz-Balart kwuru na "onweghi onye ọbụla kwesịrị ịtụ ụjọ maka etu ha si efe chi ha". Ọ gara n'iwu kwuo na iche ọkpukperechi na mbaụwa bụ oke na ọrụ dịịrị mba Amerịka, na dịka onyeisioche kọmitii ahụ na ọ ga-eji ikike ya na ọ ga-agba mbọ chekwaa ikike okpukperechi n'ụwa.
Onye ọzọ na kọmitii ahụ bụ Aderholt kwuru, "Mwakpo nke a na-elekwasị ndị ụka Kraịst rmr na Naịjirịa eme na-arị ibe ya elu abụghị ihe a ga-eleghara anya. Anyị ga-akwụdosi ike n'akụkụ ndị okpukperechi Kraịst na Naịjirịa."
Onye omeiwu Moore kwuru, "Ụmụnne na ụmụnna anyị n'ime Kraịst ka a na-akpagbu na-egbu na Naịjirịa maka ikwupụta nkwenye ha n'ebe Onye nwee anyị Jesus Kraịst nọ. Mbaụwa agaghịzi agba nkịtị na mkpagbu a na-emegide ndị ụka Kaịst na Naịjirịa.
Onyeisi ụlọomeiwu na-ahụ maka mmekọrịta mba n'ibe ha b u Mast kwuru, "Ihe abụghị naanị nsogbu dị n'etiti obodo na ihe ha. Na ọ bụ atụmatụ mkpochapụ dị okpukperechi Ọ sị na e kwesịrị ịmanye gọọmentị Naịjirịa n'ike ka ha kpochapụ ndị Boko Hara, ISWAP na ndị ekperima na-achị ehi ma kpọhachị ndị niile ndị otu a chụpụrụ site n'ụlọ ha.
Kedụ arọ ndị a tụrụ ka gọọmenti Naịjirịa mee?

Ebe foto si, KAGENMI/BBC Pidgin
Nwada Vicky Hartzler nke ụlọọrụ mba Amerịka na-ahụ maka okpukperechi kọwaara na nke bụ eziokwu bụ na ogbugbu a abụghị naanị ndị ụka Kraịst na a na-egbukwa ndị okpukperechi Alakụna mana ndị ọkachasị emetụta.
Hartzler tụrụ arọ sị ka gọọmenti mba Amerịka na nke Naịjirịa rụkọọ ọrụ ọnụ iji kwalite nkwụwa aka ọtọ n'otu aka ahụ na gọọmenti Naịjirịa ga-erite uru ọzụzụ gụnyere nke ndị uweojii na enyemaka ịzikọrịta ozi banyere ngwa ngwa ma a nụ kepu kepu na a chọrọ ime mwakpo.
Otu onye ọzọ so n'ọgbakọ ahụ bụ Ebenezer Obadare, ọkachamaara n'ọmụmụ ihe banyere mba Afrịka kwuru na kamgbe Onyeisiala Trump nyere iwu ahụ, na gọọmentị Naịjirịa agbaala mbọ ịhụ na e belatara ọnọdụ ọjọọ nke nchekwa site n'iwu dị iche iche.
Ọ gara n'ihu kwuo ka gọọmenti mba Amerịka gaa n'ihu ịkwanye gọọmenti Naịjirịa ọkụ n'ike.
Na ha ga-eme nke site n'ụzọ abụọ; nke mbụ bụ site n'inyere ndịagha Naijirịa aka n'ikpachapụ ndị otu Boko Haram.
Nke abụọ bụ ka akwanye Onyeisiala Bola Tinubu ọkụ n'ike ka ọ kagbuo iwu Sharia na steeti iri na abụọ dị na mpagara ugwu bụ ebe iwu a dị iri kamgbe afọ 2000 ma kpochapụ ndị otu Hisbah bụ ndị na-amanye ndị mmadụ irubeisi n'iwu a na-agbanyeghi okpukperechi onye ahụ na steeti ndị a.
Ndị kọmitii ahụ kwuru na ha ga-edegara Onyeisiala Trump akwụkwọ nke ga-achịkọtaọnụ ihe niile ha rụtụrụ aka ma chọpụta n'ọgbakọ nnyocha a gwara ha mee.
Gịnị ka gọọmenti Naịjirịa merela?

Ebe foto si, Presidency/X
Nke bụ eziokwu bụ na kamgbe Onyeisiala Trump mere nkwupụta ahụ, gọọmenti Naịjirịa emeela ọtụtụ ihe iji gosi na nzaghachị ebubo na ọ bụ ụka Kraịst ka a na-akpagbu.
Na-agbanyeghi na ha gọrọ na ọ bụghị eziokwu na ọ bụ nkpagbu ndị ụka Kraịst kama na ọ bụ nsogbu enweghi ezi nchekwa nke metụtara ma ndị okpukperechi ọzọ.
Onyeisiala Bola Tinubu nke Naịjirịa ezigala ndị ọrụ ya ka ha zute ndị ọrụ mba Amerịka iji kpaa nkata etu a ga-esi gboo nsogbu a.
Onyeisi ndụmọdụ nchekwa na Naịjirịa bụ Nuhu Ribadu gara zute onyeisi ngalaba agha na mba Amerịka bụ Pete Hegseth bụ ebe ha nwere mkparịtaụka nke Ribadu kwuru na "ọ mịtara mkpụrụ".
N'otu, Onyeisiala Tinubu hiwere kọmitii ndị ọrụ gọọmenti nke Ribadu nọ n'isi ya bụ ndị ga-ezute ndị orụ gọọmenti Amerịka nwee mkparịtaụka banyere ọnọdụ a./
Ọ họpụtakwara aha ndị ga-anọchiteanya Naịjirịa na mba Amerịka nakwa mba ndị ọzọ iji wulite mmekọrịta dị n'etiti Naịjirịa na mba ndị a.































