Ihe mere ndị mmadụ ji ebi karịa afọ 100 agbanyeghị na ụfọdụ na-ebi ajọ ndụ

N'afọ gara aga, ndị ezinụlọ Josepha Maria's da Conceicao maara na ihe niile adịchaghị mma mgbe ọ kwụsịrị ịrịọ sịga kwa ụbọchị.
Nke a mere obere oge ka onye ọrụ ugbo a lara ezumike nka mere ụbọchị ọmụmụ ya nke afọ 120 dịka ezinụlọ ya siri kwuo.
Cicera onye bụ otu n'ime ụmụ anọ Josefa mụrụ ka dị ndụ kwuru sị, "Mama m sere sịga na ndụ ya niile,"
"Ka ọ na-aka nka, anyị gbalịrị ime ka ọ kwụsị ịṅụ sịga, ma mama m ekweghị kama ọ na-eyi anyị egwu ịzụta sịga nke ya."
Ndị ezinụlọ Josefa na-ekwu ugbua na ọ naghị enwe ume dị ka ọ dị n'afọ gara aga, mgbe ndị ọrụ TV chọtara ya ma kpọọ ya "nwanyị kacha ochie n'ụwa".
Nke mere ka ọ bụrụ onye ama ama na mba Brazil.
Kaadị njirimara Josepha na-egosi na a mụrụ ya na February 7, 1902.
Kama mbọ niile ọ gbara ka ọ nweta ntụrụugo nke Guinness Book of World Records enweghị mkpụrụ ọmịtara.
Onye a na-ahụ dịka nwaanyị kacha ochie n'ụwa niile bụ Lucile Randon, ọ bụ onye France ma dịkwa afọ 118.
Ndị ruru afọ 100 ga-eru otu nde n'afọ 2030

Dịka otu na-ahụ maka ọnụ ọgụgụ mba ụwa niile bụ United Nations Population Division siri depụta na a ga-enwe ihe karịrị mmadụ 621,000 gafere afọ 100 n'ụwa niila 'afọ 2021.
Ha na-atụ anya na ọnụ ọgụgụ a ga-agafe otu nde na njedebe nke afọ 2030.
N'afọ 1990, nanị mmadụ 92,000 dịrị ndụ ruo afọ 100, e weere nke a dịka ihe ịrịbaama n'oge ahụ.
Mmadụ ibi ogologo ndụ ụgbụa bụ ihe ịtụanya.
Dịka ihe ịma atụ, onye a mụrụ n'afọ 1960, a ga-natụ anya na onye ahụ ga-adị ndụ ruo ihe dịka afọ 52.
Ya mere, ibi ndụ ruo afọ otu narị abụghị ihe dị mfe.
Dịka United Nations si kwuo, naanị 0.008% nke ndị bi n'ụwa ga-adị ndụ ruo afọ a.
N'aka nke ọzọ ka ndị Sayensi na-ekwu na ndị mere oke agadi ga-arịa ọrịa dị iche iche na-enweghị mgwọta.
Rhodes, onye ọkankuzi na-ahụ maka ihe ọmụmụ mkpụrụ ndụ na Mahadum Birmingham dị na United Kingdom kwuru, sị: “ịka nka kafee ya oke na ịnwe ezigbo ahụike abụghị otu ihe".
Kedu ihe nzuzo ga-eme ka mmadụ kaa oke nka?

Ebe foto si, Getty Images
Ibi ndụ ruo afọ 100 eseila ike.
Nnyocha ogologo ndụ nke Mahadum Boston mere gosiri na ọ bụ naanị otu n'ime mmadụ nde ise na mba Amerịka ga-adị ndụ ruo afọ 110.
Mmadụ ibi ogologo ndụ adọtala mmasị dị ukwu, ọkachasị ndị sayensi na-enyocha etu mmadụ si aka nka.
Rhodes kwuru sị, "Ndị ahụ nwere ike iguzogide ọrịa ndị na-eme ọtụtụ ndị kara nka, mana anyị amaghị ihe kpatara ya."
Ibi ezi ndụ abụghị iwu nke ga-eme ka mmadụ bie ogologo ndụ.
Dịka ezinụlọ Josepha Maria siri kọwaa na ọbụghị mgbe niile ka ọ na-aṅụ ọgwụ ma na ọ na-eri anụ na-acha uhieuhie ma na-erikwa ihe na-atọ shuga shuga.
"O naghị aga ije dịka ọ na-emebu," ka Cicera, dị afọ 76 kwuru.
"Anyị na-eburu ya dịka nwa ọhụrụ ma gbanwee akwa ya. Ma ọ ka na-atu m anya na ọ ka na-aṅụ sịga site kemgbe m bụ nwata ma ruo ugbua. Ndị na-arụọrụ siri ike nwere ike ịbị ogologo ndụ." Cicera
Ibi ezigbo ndụ ọ na-ebute ogologo ndụ? Ọ bụchaghị eziokwu!

Ebe foto si, Getty Images
Ihe na-agbagwoju ndị ọkachamara n'ịgwọ ọrịa afọ mgbagwoju anya bụ na ụfọdụ ndị na-adị ndụ ihe karịrị afọ otu narị abụghịkwa ndị na-ebi ndụ ahụike ziri ezi.
Dịka e kwuru na mbido akụkọ a, Josefa Maria bụ onye na-ese siga ogologo oge ndụ ya ma tolite na mpaghara ndị dara ogbenye na Brazil na-enweghị enyemaka ọbụla.
Ihe ọzọ na-atụnanya bụ nchọpụta emere n'afọ 2011 nke e bipụtara na Journal of the American Geriatrics Association nke tinyere anya na ihe karịrị mmadụ 400 bụ ndị mba Amerịka ndị Juu dị afọ 95 ma ọ bụ karịa, ma chọpụta na ọtụtụ n'ime ha na-ebi ndụ ọjọọ banyere ahụike.
Farage bụ ọkammụta n'ihe gbasara ịka nka nke mahadum Brighton mba Briten kwuru si, "Ihe mbụ anyị kwesịrị ịgwa ndị nwere mmasị n'ibi ogologo ndụ bụ ka ha hara ịnyomi etu ndị dị afọ 100 maọbụ gafee si ebi ndụ ha".
Ọ sị, " E nwere ihe pụrụiche n'ahụ ha bụ etu e siri mụọ ha, n'ihi na ha na-eme ihe ha na-ekwesịghị ime maka ahụike".
Ọ bụ mkpụrụ ndụ ihe nketa (Genetics) na-echekwa ndị a?

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ọka mmụta sayensị na-eche na mkpụrụ ndụ ihe nketa na-eme ka ndị a bịe ogologo ndụ.
Rhodes na Farage ka na-eme nyocha ịmata etu nke a si enyere ndị a na-ebi ogologo ndụ aka.
Nnyocha ọzọ e mere ndị dị afọ otu narị ndị agbụrụ Juu, nke e bipụtara na 2020, gosiri na ha na-ebu ọtụtụ ụdị mkpụrụ ndụ ihe nketa na-ebute ọrịa ọjọọ nke nwereike ibute ajọ ọrịa mgbe mmadụ kawara nka.
Dịka ọtụtụ mmadụ na-ebi karịa afọ otu narị, ndị sayensi ebidola iche ma oruola mgbe a ga-adọtị afọ ole a na-atụanyana mmadụ ga-ebi.
Mata kwa: Ọ bụ Fernando Duarte dere akụkọ a Chigozie Ohaka were tụgharịa ya n'Igbo

Ebe foto si, Getty Images






























