FSGS Nephrotic Syndrome: Nkọwa ọrịa pụrụiche a sị Sonia Ekweremadu na-arịa

Sonia Chinonso Ekweremadu

Ebe foto si, @Soniaekw/Instagram

Nkọwa foto, Sonia Chinonso Ekweremadu nwa Ike Ekweremadu bụ Sịnetọ Enugwu steeti

Akụkọ ọhụrụ pụtara n’izu a nke si n’aka nwa nwaanyị Sịnetọ Ike Ekweremadu bụ Sonia Ekweremadu na-arịọ ọha ka a gbatara ya ọsọ enyemaka n’okwu ọchịchị akịrị ọhụrụ.

Cheta na n’ọnwa Jụlaị, a nwụchiri Sịnetọ Ike Ekweremadu na nwunye ya bụ Beatrice Ekweremadu na Briten maka ebubo itu mgbere ime ahụ otu nwata nwoke.

Ebubo pụtara na ezinụlọ Ekweremadu kpara nkata ime nke a maka ọchụchụ nwata akịrị ọhụrụ nye nwa ha nwaanyị bụ Sonia Ekweremadu onye e kwuru nwere ọnọdụ ahụike kụdara akịrị ya.

Nwaada Sonia gbara ama nke a na soshal midia ya n’ụbọchị 12 nke ọnwa Sepụtemba, 2022. Ozi ya na soshal mida kọwara na nnyocha ndị dọkịnta gosiri na ọ nwere ọnọdụ ahụike kụdara ya.

"A kwụsịrị m agụmakwụkọ m kemgbe afọ 2019 mgbe achọpụtara na e nwere m ọrịa dị ụkọ akpọrọ FSGS Nephrotic Syndrome" ka nwaada ahụ dere na soshal midia ya

O rịọkwara arịrọ ka ndị mmadụ gbatara ya ọsọ enyemaka site n'inye ya otu akụrụ ha

Gịnị bụ FSGS Nephrotic Syndrome?

Akịrị ahụ mmadụ

Ebe foto si, Kidney Science Photo Library

Otu dọkịta bụ Ifeoma Ulasi akọwabuola ụdịrị ọrịa mgbe anyị gbara ya ajụjụ ọnụ mbụ.

"Nke a bụ ọrịa akịrị na-eme ka protin karịa mamịrị onye ọ na-arịa" ka ọ kọwara.

Mana o kwukwara na ọrịa ahụ nwereike ịrịa ndị okenye dịka Sonia n'onwe ya dị afọ 25 ugbua.

FSGS pụrụiche n'ihi na dịka ngalaba ahụike mba Briten bụ NHS si kwuo, "glomerulosclerosis" pụtara mgbe apa bịara dịri n'ime akịrị mmadụ.

Ha kwukwara na ọ na-enwe ngosi dị icheiche gụnyere ahụ mmadụ ịza maka mmiri dị ya n'ime, ọbara ịkpakọ, ị dị mfe ịbute ọrịa nakwa mgbanwe mamịrị mmadụ.

Ọrịa nke a bụ FSGS na-adịkwa n'agbụrụ dịka Sonia si kọwa mgbe o kwuru na ọ bụ ya kpatara nne ya, nna ya nakwa ụmụnne ya agaghị enweike nye ya akịrị nke ha.

Ụzọ ịgbalahụ ọrịa akịrị

- Onye ọbụla kwesịrị ịṅụ lita mmịrị abụọ kwa ụbọchị.

- Gbaara ịṅụ ọgwụ ahụmgbu maọbụ ịba aghara aghara ọsọ. Hụ dọkịta tụpụ ị ṅụọ ọgwụ ọbụla.

-Na-eme nnyocha ahụ oge ọbụla, e nyere ntuziaka ime ya.

-I nwe ọbaramgbalielu na-aṅụchịte ọgwụ dọkịta nyere gị anya.

-I nwe ọrịa shuga na-elekọta onwe dịka dọkịta si nye gị ntuziaka.

-Na-eri ezigbo nri na-edozi ahụ.

-Mmegharị ahụ