Gịnị bụ ọrịa 'Gastrointestinal disorder' a sị na-enye Nnamdi Kanu nsogbu?

Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Getty Images

Dịka ọkaiwu Ifeanyị Ejiofor bụ onye na-anọchite anya onyeisi otu Ipob bụ Nnamdi Kanu kwuru na Kanu nwere 'Gastrointestinal Disorder', ma kwukwaa na ndị nchekwa DSS ekweghị enye Kanu ohere ka ọ nata ọgwụgwọ ziri ezi.

Ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ sị, gịnị bụ ọrịa Gastrointestinal disorder.

BBC Igbo kpọtụụrụ Uche Okeke, bụ dọkịnta na-arụ ọrụ n'otu nnukwu ụlọọgwụ gọọmentị, ka ọ kọwaara anyị maka ọrịa a.

Okeke kwuru sị, "nsogbu Gastrointestinal disorder na-eme nwoke maọbụ nwaanyị. Ọ na-esite n'ọnụ ruo n'ike ebe mmadụ si anyụ nsị".

Ọ kọwara na ọ na-emetụta ma akpa nrị, eriri afọ, ike na ndị ọzọ.

O kwuru na ọnọdụ a bụ mgbe nrị maọbụ mmiri anaghị esi na-ahụ mmadụ aga nke ọma.

Nnamdi Kanu

Gịnị na-ebute ọnọdụ a?

Ọgwụ
Nkọwa foto, Ọgwụ mmadụ na-aṅụ na-ebute ọrịa a ụfọdụ mgbe

Okeke kwuru sị, "ihe na-ebute ya bụ nje maọbụ mgbe a wara mmadụ afọ, mana mgbe ọnya ahụ na-ala, eriri afọ onye ahụ anyakọọ ọnụ ọzọ."

"Ihe ọzọkwa na-ebute ọnọdụ a kansa nke afọ."

O kwuru na ihe ọzọ na-ebute ya bụ mgbe mmadụ nwere ihe mberede nke metụtara ukwu (waist); maọbụ onye a gbara egbe n'afọ.

"Nke ọzọ bụ ọgwụ mmadụ ṅụrụ metụtara eriri afọ onye ahụ nke mere na mmiri maọbụ nrị anaghị agafe nke ọma".

Ọrịa a ọ dị oke njọ?

Ime afọ mmadụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọrịa a na-afụ ụfụ - Uche Okeke

Okeke gara n'ihu sị na Ị gaa ụlọọgwụ, ọtụtụ mgbe ebutere okwu gbata gbata n'ụlọọgwụ nke na-ebute ịwa ahụ, na ọ na-abụkarị nkechi erịrị afọ nke bụ Gastrointestinal disorder".

O kwuru na nke a pụtara na ọbara, mmiri, ahụrụ, nri na ihe ndị ọzọ kwesịrị ịgazụ ahụ mmadụ anaghị agazụ nke ọma, nke ga-eme ka afọ onye ahụ koo eko.

O kwuru sị, " ụfọdụ mgbe afọ a koro eko nwereike ịnọgịde ngugu nke ga-eme ka o siere onye ahụ ike iku ume".

Dịka Okeke si kwuo, ọnọdụ a nwereike igbu mmadụ ma ọ bụrụ na onye ọ na-eme anataghị ezi ọgwụgwọ n'oge.

O nwere ọgwụgwọ?

Uche Okeke

Ebe foto si, Uche Okeke

Nkọwa foto, Dọkịnta Uche Okeke bụ dọkịnta Bekee n'Enugwu Ukwu General Hospital, Anambra steeti

Okeke kwuru na a ga-ebu ụzọ chọpụta ihe butere ọrịa a tupu a mara etu a ga-esi gwọọ ya.

O kwuru sị, "Ọ bụrụ nke ihe ọzịza butere, a waa onye ahụ ahụ, ma ọ bụrụ na mmadụ loro ihe butere ya, a waa onye ahụ ahụ wepụta ihe onye ahụ loro".

Okeke kwuru na ụfọdụ nke akpụ kansa na-ebute, a ga-ebepụ akpụ ahụ site n'ịwa onye ahụ ahụ.

O kwuo sị, "Ọ bụrụ nke a ga-aṅụrụ ọgwụ, aṅụọrọ ya ọgwụ onye ahụ e nwere onwe ya".