'Structure' PDP na APC nwere bụ nke e ji ego zụta - Pat Utomi

Ebe foto si, Getty Images
Patrick Utomi bụ onye ọnụ na-eru n'okwu a ma ama na Naịjiria nakwa onye hibere otu National Consultative Front (NCF) na-akwado ihe a kpọrọ 'Third Force Movement', etinyela ọnụ n'okwu gbasara ọchịchị Naịjiria n'afọ 2023.
Na mkparịtaụka ya na ndị ụlọntaakụkọ ChannelsTV nwere n'ụbọchị 12 Julaị 2022, Utomi bụ onye ọkachamara n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị ọkachasị ebe o metụtara akụnaụba obodo nakwa onye pati Labour, kwuru okwu gbasara "enweghi 'structure" bụ ihe ndị na-ama ha aka na-ekwu na pati ha enweghi.
Ọ rụtụkwara aka n'ihe gbasara pati All Progressives Congress (APC) iji ndị ụka Alakụba abụọ (Bola Ahmed Tinubu na Kashim Shettima) azọ ọkwa onyeisiala na osote ya.
Gbasara "enweghi 'structure"
Utomi kwuru na pati Labour ka pati abụọ kacha buo ibu na Naịjiria bụ APC na Peoples Democratic Party (PDP), nwee 'structure'.
O kwuru na structure nke pati Labour nwere bụ "nke 'kpọkịrịkpọ', ka mma karịa nke APC na PDP nwere."
Ọ gara n'ihu kwuo na pati Labour hibere isi n'elu otu ndị ọrụ bụ Nigerian Labour Congress (NLC) na Trade Union Congress (TUC), nke gbanyere mgbọrọgwụ na steeti niile dị na Naịjiria, ruo ma n'ime obodo.
O kwuru sị na ha ga-enwe ihe ruru mmadụ 15 ga-akwụdoro ndị pati Labour n'ọgbọ vootu niile. O kwukwara na ha na ụfọdụ ndị pati ndị ọzọ na-arụkọ.
O kwuru na ụdịrị structure APC and PDP nwere bụ "nke e ji ego si n'akpa gọọmentị zụta".
O kwuru sị "ụdịrị 'structure' APC na PDP nwere bụ nke 'i nye m nara gị', nke onwe, na-enweghi ike ịtụlite ọchịchị na-ahụ ebe Naịjiria na-aga ma gbaa mbọ ịhụ na Naịjiria garuru ebe ahụ."
Ọ gara n'ihu kwuo na ihe mere e ji kpụrụ 'structure' n'ọnụ bụ maka na ntuliaka na Naịjiria na-adabekarị n'ịghọ aghụghọ na igobi vootu.
Gbasara 'Muslim-Muslim' tiketị ndị APC
Utomi kwuru na ọ bụ ntozuoke kacha mkpa, na "ndị mmadụ na-aka anọsapụ ahụ n'ọgbakọ ọbụla ma ọ dị ha ka a na-ebu ọdịmma ha n'uche na mkpebi ọbụla a na-eme."
A jụrụ ya ihe mere na 'Muslim-Muslim' tiketị adịghị mkpa na ntuliaka afọ 1993 oge MKO Abiola na Babagana Kingibe ji ya zọọ ọkwa, ma bịa bụrụ ihe a kpụ n'ọnụ n'afọ 2023.
Ọ zara sị: "E nweela ajọ nkewa na Naịjiria ugbua karịa etu ọ dị n'afọ 1993.
"Nke abụọ, ụdịrị mmadụ Abiola bụ dị iche n'ụdịrị ihe a na-ahụ ugbua. Akparamagwa ya dị iche n'ụdịrị ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ndị nke na-ejizi ofufe eme nkewa e ji azọ ndọrọndọrọ ọchịchị."






























