Gọọmentị agwaala ndị ọbaego wepụta ụgwọ ndị nkuzi Mahadum - Ngige
Abụbụọrụ nke ndị nkuzi Mahadum agafeela ọnwa ise ugbua dịka ASUU bụ otu jikọrọ ha kwụ chịm n'ihe ha na-ana gọọmentị etiti n'aka.
N'ihi nke a, onyeisiala Muhammadu Buhari enyela ndị Minista ihe a metụtara iwu ka ebie abụbụ ọrụ a kpam kpam n'izu úka abụọ.
Otu Minista nke a metụtara bụ Chris Ngige ekwuola ihe pụtara dịka ya na onyeisiala Buhari nakwa Minista agụmakwụkwọ mechara nzụkọ n'Abuja.
Ọ gwara BBC Igbo na gọọmentị etiti agwaala ndị ọbaego wepụta ego a ga-eji kwụ ndị Mahadum ahụ ụgwọ.
O kwukwara na Minista agụmakwụkwọ rịọrọ ka enye ya izuụka abụo iji kpọ otu ndị ọrụ Mahadum niile oku ma nwee nzụkọ iji bi ya bụ abụbụ ọrụ.
Ebe foto si, LabourMINNG/Twitter
Isi akụkọ
Kọwaara m isi akụkọ
Akụkọ akachasị gụọ
Content is not available
{{rankTranslation}}