Ikpe Nnamdi Kanu ebiela n'Umuahia... Ụlọikpe etinyela ụbọchị a ga-enye mkpebi

Ikpe Nnamdi Kanu
Nkọwa foto, Okaiwu Aloy Ejimako na nwaane Nnamdi Kanu bụ Emmanuel Kanu

Ikpe dị n'etiti Nnamdi Kanu na gọọmentị Naịjirịa abịala n'isi njedebe n'ụlọikpe ukwu dị n'Umuahia.

Ọkaikpe ji ikpe ahụ bụ Evelyn Anyadike yigharịrị ikpe ahụ ka ọ dị n'izuụka atọ na-abịa abịa.

Ikpe Nnamdi Kanu

Ikpe nke taa malitere dịka ọ fọrọ nkeji iri na ise ka ọ kụọ elekere iri na otu nke ụtụtụ.

Ọkaiwu Mazi Kanu bụ Alloy Ejimakor gwara ụlọikpe ka ha kwupụta hoohaa na ọ bụntọrọ ka gọọmentị Naịjirịa tọọrọ Nnamdi Kanu na Kenya wee kpụlata ya Naịjirịa.

Mana ọkaiwu gọọmentị etiti bụ Simon Enoch kwuru na nke a bụ okwu e kpebirila ekpebi n'oge gara aga, ma rịọ ọkaikpe Anyadike ka ọ kụchapụ ya bụ ikpe maka na o nweghị isi.

N'aka nke ya, Ejimakor kwuru na ikpe nke ụlọikpe kpebiri n'oge gara aga, na ikpe nke taa abụghị otu ihe.

Nke a mere ọkaikpe Evelyn Anyadike ji tinyezie 27 Ọkụtoba iji nye mkpebi ya.

Ikpe Nnamdi Kanu

Nwanne Nnamdi Kanu nke nta bụ Emmanuel Kanu na ụfọdụ ndị ezinụlọ Kanu nakwa ọtụtụ ndị nkwado ya socha na ndị bịara n'ụlọikpe taa.

Ndị ọrụ nchekwa mechiri okporoụzọ gawara ụlọikpe 'Federal High Court' n'Umuahia, n'ihi ikpe Nnamdi Kanu a ga-ekpe ebe ahụ taa bụ Tuzde.

Onye ntaakụkọ BBC Igbo hụkwara ọtụtụ ndị uweojii ka ha gbara okirikiri n'ihu ụlọikpe ahụ.

Ọkaikpe Nnamdi Kanu bụ Aloy Ejimakor na ndị ọkaiwu ndị ọzọ awụchiela n'ụlọikpe dịka a na-eche ka ọkaikpe bịaruo ka ya bụ ikpe malite n'uju.

Ụfọdụ foto si n'ụlọikpe taa

Umuahia court
MNK Umuahia
Nkọwa foto, Kpachi kpachi ụzọ adịla n'ihi na ndị ọrụ nchekwa emechiela okporoụzọ gawara ụlọikpe 'Federal High Court Umuahia
Nnamdi Kanu Umuahia
Nkọwa foto, Ndị ọrụ nchekwa bucha egbe kwụrụ n'ihu ụlọikpe ahụNK
Ikpe Nnamdi Kanu
Nkọwa foto, N'ime ụlọikpe ebe a ga-anọ kpee ikpe nke taa
Ikpe Nnamdi Kanu
Nkọwa foto, Ụfọdụ ndị ezinụlọ na ndị nkwado Mazi Nnamdi Kanu awụchiela n'ụlọikpe
Aloy Ejimakor
Nkọwa foto, Ọkaikpe Kanu bụ Aloy Ejimakor na-agwa ndị ntaakụkọ okwu tupu ikpe amalite

Gịnị ka ikpe nke taa bụ maka ya?

Mazi Nnamdi Kanu na ọkaikpe ya bụ Aloy Ejimakor

Ebe foto si, Aloy Ejimakor

Nkọwa foto, Mazi Nnamdi Kanu na ọkaikpe ya bụ Aloy Ejimakor

Taa ka ụlọikpe ukwu gọọmentị etiti dị n'Umuahia, isi obodo Abia steeti, ga-anụ ikpe dị n'etiti Mazi Nnamdi Kanu na gọọmentị Naịjirịa.

Mazi Kanu bụ onye isi 'Indigenous People of Biafra', otu na-achọ ka mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa kwụụrụ onwe ya dịka mba nke aka ya, mana gọọmentị Naịjirịa na-ahụta ha dịka ndị na-eyi ndụ egwu.

Kanu nọ ugbua na mkpọrọ n'isi ụlọọrụ ndị ọrụ nchekwa nzuzo a kpọrọ 'Department of State Services', dịka gọọmentị Naịjirịa nwụchiri ya na mba Kenya ma kpụlata ya Naịjirịa.

Mana ọkaikpe ya bụ Aloy Ejimakor gbara gọọmentị akwụkwọ n'ụlọikpe n'ọnwa Maachị afọ a, na-ebo gọọmentị ebubo na ọ bụ ntọrọ ka ha tọọrọ Mazi Kanu n'ike ma kpụlata ya Naịjirịa.

Ikpe a ga-ekpe n'Umuahia taa bụ iji kpebie ma nnwuchi a nwuchiri Mazi Kanu ọ dabara n'usoro iwu nke Naịjirịa nakwa nke ' African Charter on Human and Peoples Rights'.

Ihe merela n'ikpe a n'oge mbụ

Ndị ọkaiwu na-anọchite Nnamdi Kanu

Tupu ikpe nke taa, Aloy Ejimakor ewetabuola mkpesa iji kwuo na gọọmentị Naịjirịa zipụrụ ndị agha ka ha wakpo ụlọ Mazi Nnamdi Kanu ma chọọ igbu ya n'afọ 2017.

Ọ bụ nke a kpatara o ji gbaa ọsọ ndụ, dịka ikpe ya na-aga n'ihu n'oge ahụ n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja.

Gbasara nke a, ụlọikpe ahụ kpebiri na n'ezie, mwakpo ndị agha mere n'ụlọ Mazi Kanu n'Afara-ukwu, Ibeku, Umuahia, na 2017 megidere ikike dịịrị ya dịka mmadụ.

Nke a mere ka ụlọikpe ahụ, n'ọnwa Jenụwarị 2022, nye iwu ka gọọmentị Naịjirịa kwụọ Nnamdi Kanu otu ijeri naịra iji tie ya aka n'obi.

'Sit-at-home' agaghị adị taa

Aloy Ejimakor

Ebe foto si, Aloy Ejimakor

Nkọwa foto, Ọkaiwu Aloy Ejimakor kwuru na 'sit-at-home' agaghị adị taa

Kamgbe a nwụchiri Mazi Kanu, ndị otu ya bụ Ipob na-etinye ọnọdụ mmachi mkpagharị, ha na-akpọ 'sit-at-home', ụbọchị ọbụla ọ ga-aga ụlọikpe.

Mana ndị ọkaikpe Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor na Aloy Ejimakor ekwuola na 'sit-at-home' agaghị adị maka ikpe nke taa.

Nke a bụ maka na Kanu n'onwe ya agaghị apụta n'ụlọikpe taa, ọ bụ naanị ndị ọkaiwu ya ga-anọchi anya ya.

Obere ntọala gbasara Nnamdi Kanu na ọchịchọ nnwereonwe Biafra

Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Biafran.org

Nkọwa foto, Nnamdi Kanu na-agbasa ozi na Radio Biafra
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Mazi Nnamdi Kanu nwere ụlọọrụ mgbasaozi a na-akpọ Radio Biafra bụ nke o ji agbasa ozi ma na-akpọ oku nnwereonwe Biafra, ma na-ahazikwa otu ya bụ Ipob.

Radio Biafra a dị na London na mba UK.

N'afọ 2015, gọọmentị Naịjirịa nwụchiri Mazi Kanu dịka ọ batara na Naịjirịa, ma kpụpụ ya ụlọikpe.

Ha boro ya ebubo na ọ chọrọ ịkwatu ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa, na ọ na-akparị onyeisiala Naịjirịa, na ọ na-agbasa ozi nwereike ibute ọgbaaghara n'obodo.

Kanu nọrọ n'ụlọ mkpọrọ nke ndị DSS nwa mgbe nta tupu e mechaa tinye ya n'ụlọ mkpọrọ gọọmentị dị na Kuje, Abuja, dịka ikpe ya na-aga n'ihu.

Gọọmentị etiti mechara machie otu Ipob, kpọọ ha ndị na-eyi ndụ egwu, ma kwuo na onye ọbụla nọ n'otu ahụ na-ada iwu.

E mechara tọhapụ Mazi Kanu nwa mgbe nta n'afọ 2017 ka o si n'ụlọ ya na-abịa ikpe.

Mana na ngwụcha afọ ahụ, dịka ndị agha Naịjirịa sị na ha ga-enwe atụmatụ nchekwa pụrụ iche na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ a kpọrọ 'Operation Python Dance, ha wakporo ụlọ Nnamdi Kanu, n;Afara-ukwu, Umuahia, mana Kanu gbara ọsọ.

Otu a ka o si gbapụkwa na Naịjirịa ọzọ gbalaa mba UK ebe ọ bụ nwa afọ (citizen).

Ebe ahụ ka o si gaa njem na Kenya n'ọnwa Jun afọ 2021, ebe aka nọ kparakwa ya ọzọ tupu a kpụghachite ya Naịjirịa.

Ikpe ya n'ụlọikpe Abuja ka na-agakwa n'ihu ugbua.