Ndị uweojii na mba Amerịka na-achọ Chukwuebuka Nwobodo maka ọnwụ otu nwaanyị

Chukwuebuka Nwobodo

Ebe foto si, Houston Police Department

Ndị uweojii n'obodo Houston nke mba Amerịka ezipula ozi na ha na-achọ otu nwoke aha ya bụ Chukwuebuka Nwobodo maka ebubo igbu otu nwaanyị.

E nyere aha nwaanyị ahụ dịka Felicia Johnson dị afọ 24.

Dịka ọ dị ugbua, achọtabeghi Nwobodo ahụ dịka o riri mbọmbọ ọsọ.

"E boro nwoke ahụ ebubo ịgbu ọchụ nakwa imebi ihe akaebe n'ụlọikpe nke 232nd State" ka ndị uweojii kwuru n'ozi ha.

Akụkọ na-ekwu na Felicia furu kemgbe ụbọchị 16 nke ọnwa Epreelụ n'ebe obibi ya na InterContinental Houston - Medical Center hotel dị na Houston.

E mere mkpesa a mgbe mmadụ chọtara ekwentị ya ọbara gbasara, n'akụkụ okporoụzọ.

Ndị uweojii kwenyere na ọ bụ Nwobodo gara buru Felicia buga ya na be nke ya.

Ha kwenyekwara na o gburu Felicia n'ime abalị ole na ole o buruchara ya.

Ihe ndị akaebe ha ji nata ụlọikpe ikike ịnwụchi Nwobodo

N'ụbọchị 13 nke ọnwa Mee, ndị uweojii natara ụlọịkpe ikike ịnwụchi Nwobodo ma nyochaa ụlọ ya nakwa ụgbọala ya.

Mgbe ha kwụsịrị ya, ha chọtara ọbara n'azu oche nakwa n'ime 'boot' ụgbọala ya.

Ihe ndị ọzọ ha chọtara bụ egbe, gloovu, ihe e ji egwu ala, nakwa nnukwu mma nke ọbara metọrọ.

Ha mechara nwụchie ya ma mechaa tọghapụ ya ma ha akọwaghị ihe ha ji mee nke a.

Ha jichiri ekwentị ya n'ụbọchị ahụ ma mee ya nyocha.

Ndị uweojii hụrụ na ihe ndị ọ na-achọ na ya gụnyere "etu e si e zopu ozu", "ebe ịkpa kachasị dị na Houston", "etu m ga-esi gbalahụ ịgbu ọchụ" na ihe ndị ọzọ.