Trump ewebatala ụtụisi 10% ọhụrụ dịka Ụlọikpe Kachasị jụchara ịnabata ụtụisi mbubata ngwaahịa

Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump amanyela ụtụisi pasenti iri (10%) ọhụrụ maka mbaụwa dị iche iche iji dochie anya nke Ụlọikpe Kachasị kachapụrụ.
Trump kọwara nchabi ikpe kachapụrụ ụtụisi ahụ o tinyeburu dịka "nke dị ezigbo njọ" ma kọwaa ndị Ọkaikpe jụrụ ịnabata atụmatụ ịtụ mgbere ahụ dịka "ndị aparị".
Onyeisiala Amerịka kpughere atụmatụ a n'ime obere oge ndị Ọkaikpe ahụ kachapụrụ ọtụtụ ụtụisi White House manyere mbaụwa dị iche iche n'afọ gara aga.
Na nchabi ikpe ndị Ọkaikpe isii nabatara, ma atọ ndị nke ọzọ anabataghị, ụlọikpe ahụ kwupụtara na Trump emefeela ihe oke karịa ebe ikike ya ruru.
Mkpebi ahụ bụ mmeri gbapụtara ihe maka azụmaahịa dị iche iche nakwa steeti ndị nọ n'Amerịka, bụ ndị gbara ụkwụ megide ụtụisi ahụ.
Ọ ga-emeghekwa ụzọ maka ịkwụghachi ụtụisi ruru ijeri kwuru ijeri dọla, ma butekwa ọnọdụ amaghị nke a ga-eme n'ọnọdụ ịtụ mgbere mbaụwa.
Ụlọikpe Kachasị n'Amerịka akagbuola ụtụegọ Trump

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọikpe Kachasị nke mba Amerịka akagbuola ụtụego Onyeisiala Donald Trump tụkwasara na ngwaahịa na mba ụwa
N'afọ 2025, Trump tinyere ego ụtụisi na ngwaahịa a na-ebubata n'Amerịka, sị na ọ bụ iji nyere Amerịka aka na mmepụta ngwaahịa
Mana kama inweta nkwado Ụlọomeiwu, Trump gbadoro ụkwụ na iwu nke gbatagbata nke akụnaụba mba ụwa nke afọ 1977 a kpọrọ 'International Emergency Economic Powers Act. Declaring an emergency 1977' were tinye n'ọrụ ozugbo.
N'ọnwa Ọgọst afọ 2025, Ụlọikpe Mkpegharị nke Amerịka nyere mkpebi na ọtụtụ ụtụego ahụ Trump tinyere megidere iwu.

Ebe foto si, Getty Images
Mana Ụlọikpe Kachasị tinyere aka n'ikpe ahụ dịka Ụlọọrụ Onyeisiala (White House rịọrọ ka a kagbuo mkpebi ahụ nke Ụlọikpe Mkpegharị nyere.
Otu na-emegide ụtụego Trump chọrọ ka akwụhachi ụtụego ndị a nara ana
Otu nime otu nd i na-emegide ụtụego Trump tinyere a kpọrọ, "We Pay the Tariffs" aṅụrịla maka mkpebi nke Ụlọikpe Kachasị nyere nke kagburu ụtụego Trump tinyere na ngwaahịa.
Otu ahụ ebipụtala akwụkwọ ozi nke ha chọrọ ka ndị mmadụ ibinye aka iji kpoọọ oku ka a kwụghachi ego nile akwụrụ n'ụtụego .
Onyeisiotu ahụ bụ Dan Anthony.kwuru sị, "Mkpebi Ụlọikpe Kachasị nyere taa bụ nnukwu mmeri nye ụmụ obere ụlọahịa Amerịka bụ ndị ibu ụtụisi dara n'isi."
Anthony kwuru na Mkpebi ụlọikpe ahụ enweghị isi ma ọ bụrụ na a kwụghachi nke a natara anata.

































