Etu ndị uweojii si wakpoo ma nwụchie ndị ekperima n'Ebonyi Steeti

Uwe ndị agha

Ebe foto si, Ebonyi police

Ndị uweojii Ebonyi steeti sị na ha awakpola ma kụsaa ogige ndị Ipob na ESN nke dị n'ime oke ọhịa dị nso n'osimiri Opeke, n'obodo Agba nke dị n'okpuru ọchịchị Ishielu, n'Ebonyi steeti.

Ipob pụtara 'Indigenous People of Biafra', ebe ESN bụ 'Eastern Security Network', otu abụọ a bụ ndị sị na ha na-alụ ọgụ maka nnwereonwe Biafra.

Chris Anyanwụ bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ebonyi steeti, kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o zipụrụ n'ụbọchị Sọnde.

O kwuru na ndị uweojii nwụchiri ndị ekperima abụọ bụ ndị isi Ipob/Esn n'Ebonyi steeti, ha wee gbaa ama ebe isi ụlọọrụ ha dị nke mere ndị uweojii ji wakpo ebe ahụ.

Mmadụ abụọ a ndị uweojii nwụchiri bụ Nnamdi Ngwuta Obaji onye a na-akpọ 'Commander No. 3', na Felix Ogudu.

Ihe anapụtara ndị omekome

Ebe foto si, Ebonyi Police

Anyanwu kwuru na mgbe ha na-achọ ndị omekome a n'ọhịa ebe a maara ha ama, na ndị omekome a gbara ha egbe kama ndị uweojii anya na-acha ọbara ọbara gbawara ndịa egbe nke mere ha jiri gbawa ọsọ.

Ọ Dekwara sị na ha gburu ụfọdụ ndị ekperima a ebe ndị ọzọ bu mgbọ egbe n'ahụ gbaa ọsọ.

Anyanwụ kwuru na ọ bụ site na mmiri Opeke ka ụfọdụ ndị a siri gbaa ọsọ.

Ihe anapụtyara ndị omekome

Ebe foto si, Ebonyi police

Ihe ndị uweojii si ha napụtara ndị a

Ihe anapụtyara ndị omekome

Ebe foto si, Ebonyi Police

Ụfọdụ ihe ndị uweojii a sị ha napụtara ndị a gụnyere Uwe bullet-proof 11, Uwe ndị agha 8,Gasị eji esi nyị abụọ, mgbọ egbe FNC 110 ,mgbọ egbe GPMG anọ, Egbe single-barrel 5 ,otu ụgbọala, mapụ Biafra na ihe ndị ọzọ.

Anyanwụ kwukwara sị, " Anyị wakporo ihu arụsị nke onyeisi ndị otu a bụ Ambassador nke dị n'Anike Isu Onicha".

O kwuru na ha napụtara ha ọgbatumtum anọ, uwe ndị agha asaa na ọkpụk[pụ ụkwụ ndị agha abụọ.

O kwuru sị 'otu n'ime ndi isi otu a a na-akpọ SARS COMMANDER, onye na-ebu isi dada ma bụrụkwa onye Krọs Riva steeti bụ onye ha na-achọ achọ'.

Anyanwu kwukwarana ọnye a so na ndị wakporo ụfodụị ụlọọrụị ndị uweojii ma soro na ndị wakporo onyeisi ụlọakwụkwọ Federal College of Education, Isu Onicha n'ụzọ agba abalị ole gara aga.

Ihe anapụtyara ndị omekome

Ebe foto si, Ebonyi Police