Ndị mmadụ na-ekwenyeghi na nje dị ire

Nje dị n'ime efere 'petri dish'

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, O nwere ndị nọ n'obodo na-ekwenyeghi na nje dị ire na-agbanyeghi na a hụrụ ihe na-ebute nje bụ 'virus' n'ime efere 'petri dish'.
    • Onye dere ya, Rachel Schraer
    • Ndị mere akụkọ a, Health and disinformation reporter

Oteela aka atụmatụ ọgwugwo ndị ọzọ na amasị m, Veronica Haupt kwụrụ nke a n’ụlọ ya nke di na akụkụ mmiri Cape Town South Africa. Ọbịbia ọria corona virus malitere mmasị ọzo n’ịme m.

Veronica achoghị ịzị fọtọ ya, nwada a bụ onye amaama na enye ndumodu n’ịhe gbayere ahụ ịsịke na ụsoro dika chi sirike nke ndi oyinbo na akpọ ‘’naturopath’’ usoro nwere ike ịdị ịchie na ụsoro ndị onyibo wepụtara.

Ụsoro Veronica abughị ihe ọhụrụ nyere ndị mmadu, nwaada ahụ nwere mmasị ni ịhe gbasara ahụ ịke na ịgụ akwụkwọ gbasara ahụịke na ọgwụgwọ ọria.

Obuzọ nwebe mmasị na ihe ndi ejiri mepụta ọgwụ mgbochi Covid nakwa ịhe mere ejiri meeya ịwụ na ụfodu ụlọ ọru.

Ngwa leezịe ịhe mere echiche Veronica jiri di ịche na nke ndi ọzọ.

Veronica kwụrụ na okweteghị na mmadu nwere ịke ịsị na ahụ mmadu ịbeya bute ọria, ọsirị na uche nke ya, ịhe a bụ asị ehịdoro site na afo kwuru afo.Veronica gwara m na okweteghị na enwere ịhe dika nje nke ndi onyibo nakpọ ‘’Germs’’ asiri na ọbụ ya na akpata ọria.

Na ntụghari okwu nke ndi na kweghị na nje (germ) kwụrụ na soshol media, ha gbadoro ụkwu na eweghị mparịta ụka gbayere nje tụpụ afo 2020, dika hasiri kwu, akụkọ nje malitere na oge Covid bidoro. Akụkọ covid akwụsịrọ ebe ahu, akọrọya karia etu esi kọ ya na afo atọ gara aga wee ruọ 2023.

Otụ na kweghị na nje(germ) nwere mmadu puku ịrị na eso ha na facebook nakwa telegram, ụfọdụ ndi otu ha ekweghị na ịhe dika germs di, ebe ụfọdụ kwere na germs di mana ha ekweghị na ọna akpata ọria.

Ọtutu n’ịme ha gbadoro ụkwụ na ịhe ndi ọkachamara kwụrụ na teori nke afo 1800 maka nje nke ndị bekee nakpọ ‘’Germs’’, na otu aka ahu, ụfọdụ mmadu gbadoro ụkwo na teorị nke kwụrụ na enwere ịhe dịka nje (germs).

Antoine Bechamp wepụtara atumatu nke ọkpọrọ ‘’terrain theory’’. Teọri nke a kwụrụ na nje enweghị ịke ịmeru mmadu ahu,kama na ịhe nje na eme n’ịme ahu bụ ibupụta ọria di bu adi na ahụ mmadu.

Teọri Bechamp mechara bụrụ ịhe na eweghị ụme mgbe ebidoro nwebe akaebe maka otu nje siri akpata ọria .

Otu osiri di ụgba, ọtụtụ ndi mmadu ekweteghị na atụmatụ Bechamp.

Enwere ịke ịkwu na ịhe kpatara atụmatụ a bu otu ndi mmadu siri kweye na teọrị nke ndi onyibo wepụtara na 19th centụarị nakwa otu ha siri ju ịhe ọbụla gọọmentị kwụrụ nke na doro anya.

Mana ọpụtaghị na ịhe nile gọọmetị kwụrụ abụrọ ezị okwu.

Dan Wilson, Debunk the Funk

Ebe foto si, Debunk the Funk

Nkọwa foto, Dọkịta Dan Wilson na-ajụ ihe mere ụlọọrụ na-ahụ maka ahụike si ebuagha megide nrụpụta ọgwụ.
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Dọkịta Dan Wilson onye na eme ịhe oyonyo na akụzị maka molescular biology na youtube, nke akpọrọ’’ Debunk the Funk’’ kwụrụ na echiche ndi na soghị na sayensi dabara na ahụịsịke.

Nke a bụ ịchụzọ echiche zuru oke nke ọdịmma anụ ahụ na nke uche, site na nri, mmega ahụ na omume ahụike ndị ọzọ. Ọ na-agụnyekarị ịjụ ọgwụ ọgwụ, nke a na-ahụta dị ka “ihe na-adịghị mma”, ma mepụta ọtụtụ nde mgbasa ozi mgbasa ozi. Ihe oputara bu icho odinamma ziri ezi site na iri ezigbo nri nakwa ime ihe ndi ozo na enyere ndu aka.

Ihe ndi ọzọ soyere ya bu ịjị ọgwu bekee nke ana ahụ dika ihe na dighị ka chi sireke ya nke nwetere puku echiche ndi mmadu na ihu sohal media.

Dọkịta Wilson kwụrụ na ahuike bu ihe dọrọ onye obula choro enyere ndu ya aka. Okwuru ịri nrị di ahu mma ezuola igbochi ọria ma nyere aka idi ogologo ndu.

Dika Dokita Wilson Siri kwu, ọbughị iwu na aga agbagbu teọri na kweghị na nje, kama na ọbụ echiche ha na enwere usoro ega-eji nguọ ọgwu bekee moobu otu ega esi bi ndu ga enyere aka megide nje ma nwete ahuike.

Ọbughi ọria nile sitere na nje, enwere ụfodu ọria bụ ọnatachi, ụfodu ọria si na otu onye si ebi ndu nakwa ebe onye bi.

Thabo Mbeki

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Thabo Mbeki bụ onyeisiala mba Saụt Afrịka site na 1999 ruo 2008 ebe o wetere atụmatụ Aids denialism n'obi gọọmentị

Mana, na-echịche Veronica, ọria nile dị mmadu na ahụ nwere ịhe kpatara ya. Ọgwara ndị ahia ya na ahuịke ha adighị na aka dọkịta kama na ahuike ha di ha na-aka.

Lee otu teọri na kweghị na nje siri nwee mmgbagọju anya...

Otu ndi na kweghị na nje mepere Facebook accant wee bido nye be ndi mmadu ndụmodụ,sị ha zeere ndị dọkịta bekee nakwa ọgwu mmgbochi ọria nke ndị bekee wepụtara.

Otu a esila na mmadu 150 ha nwere na facebook n’ịme 2019 banye mmadu 30,000 ruo ụgbụa.

Dọkịta Wilson kwụrụ na otu ndi na kweghị na nje abụrụla ịhe nsogbu na ụwa, ka chị na efo ka ọtu a na abawị, n’ịhi na ọtụtụ mmadu kwenyere na ya. Ọmere ka anyị mara na, na agbanwere na ọtụ a ekweghị na nje na abute ọria, enwela ọtutụ akaebe ịjị gosi na enwere ịhe dị ka nje na akpata ọria, ịhe ndi oyinbo kpọrọ microscope ka eji ahụ ya bu nje(germs)

Okwụrụ na ụfodụ ndị ekweghị na ọria HIV were ịke ibaye na AIDS na agbanyere na ụwa asala anya.

Na afo 2000s na obodo South Africa bu obodo Veronica, onyeịsịala ha mbge ahụ bụ Thabo Mbeki ekwetaghị na ọria HIV bụ ya na abanye AIDS, n’ịhị nke a, ọjụrụ ịbụte ọgbụ na enyere ndi na arịa ọria HIV nke ndị bekee kpọrọ Antiretroviral drugs. Ọgwụ a na eme ka HIV hapu ịgbasa na ahụ ruo AIDS.

Ndị na ahụ maka mgbochi ọrịa HIV na South Africa kwụrụ na ịhe di ịche adịla ụgbụa, na ha enwerozi nsogbụ ịhe gbasara otu ndi na kweghị na nje.

Roberto Pereira bụ otu onye na ndị na enyocha ịhe gbasara ọria HIV kwụrụ na agbanyere na ịhe di ịche adigo, ọhere ka di na ịhe mere na mbụ were ịke ịme ọzọ.