" Ọ bụ maka mkpachapụ ka ndị Ipob ji azọ nnwereonwe" – Sheikh Gumi

N’ụtụtụ a ka onye nkụzị Alakụba a ma ka Sheikh Ahmad Abubakar Mahmud Gumi wuwere na soshal midia maka ihe ọ dere na facebook ya.
Gumi sị na ọ bụ maka mkpachapụ mere ndị agbụrụ dị icheiche jị ekopu isi na gọọmentị Naịjirịa.
O bidoro n’iji nkwekọrịta ndị omekome na otu obodo bụ Mada nwere na Zamfara were maa atụ.
Ọ sị na ọ bụrụ na Gọọmentị Naịjirịa na ndị omekome kwekọrịta, na udo ga-alọghachite na Naịjirịa.
O kwuru na nkopu isi otu Ipob ebelatala n'Ọwụwa anyanwụ maka na Peter Obi pụtara ịzọ ọchịchị Onyeisiala, otu Bola Tinubu siri pụta n’ọdịda anwanwụ.
Gumi na-ekwusi ike na ọ bụrụ na gọọmentị mee ihe ndị mmadụ chọrọ, na ha agaghị ekopu isi.
Ọ sị na “nkopu isi niile a na-eme na Naịjiria gosiri na Gọọmentị Muhammadu Buhari na-achị ugbua, akpọụla afọ n’ala”.
Ọ kelere Chukwu na ha apụwala.
Gumi kwenyesiri ike na ọ bụ ka ndị Naịjirịa si ahụta ụwa mere ha ndị omekome ịnwe mkparịtaụka.
Ọ sị na ndị Igbo agaghị ekweta na gọomentị na ndị omekome ndị ugwu ga-enwe mkparịta ụka maka na ha na ahụta ha ka ndị ajọ mmadụ.. “otu ahụ ka o ga-esi ara onye ugwu ahụ ikweta na gọomentị na ndị Ipob ga-enwe mkparịtaụka”.
O kwuru na mkpagbu, nnapụ na mmegbu butere nkopụ isi.
Ọ sị na ọ bụ “nwayọ nwayọ ka aga eji rapụta ndị mmadụ n’ihe ha kwenyere”.
BBC Juru ya na ndị mmadụ na-eche na ya bụ Sheikh Gumi kwesiri ịnọ na mkpọrọ ugbua maka na ya na ndị omekome na-ayị.

Ebe foto si, Olisa Agbakoba/Twitter
Gumi zara, “ndị ahụ amaghị ihe ha na-ekwu. Ha aghọtaghị Naịjirịa”.
Ọ sị na ọ bụ enyemaka ka ya na-enye iji mee ka ihe dị mma.
O kwuru na ihe na-ese okwu na Naịjirịa bụ okwu agburu.
“O bụ ọgụ agburu ka a na-anụ na Naịjirịa. Ndị mmadụ che na ọ bụ gọọmentị ka a na-ebuso agha".
Ọ sị na ya agaghị agba nkiti na-ekiri ka a na-egbucha ndị be ha.
O kwuru na ọ bụ aka ka ya na-enye ịzọpụta ndị be ha.
Onye ọkaiwu ukwu Naịjirịa bụ Olisa Agbakọba sị na Gumi enweghị ezigbo okwu maka na ya bụ ihe o kwuru bụ ihe ha kwesiri ịma kemgbe.

Ọ jụrụ sị, “kedu ihe mere ha jiri mata ya ugbua? Kedu ihe mere ha ejighị mata na ọ bụ oke mkpachapụ mere ndị mmadụ ji ekopu isi na gọọmentị?
O kwukwara sị, ọ bụrụ na ha mata na ya ugbua, na taa ka bụ gboo.
Joe Igbokwe bụ onye enyemaka Gọvanọ Lagos steeti maka adịmọcha obodo sị na Gumi kpụ nzu ọma ya n’ọnụ, nke pụtara na ihe Sheikh Gumi kwuru bụ eziokwu, "mmadụ niile a ana egbu bụ maka ndọrọndọrọ ọchịchi".






























