Mwakpo Ịran: Gọọmenti na-agba mbọ ịhụ na onweghị onye Naijiria nọ na nsogbu - Ụlọọrụ NiDCOM

Ebe foto si, AFP via Getty Images/ NiDCOM/ Web

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Ụlọọrụ na-ahụ maka ndị Naịjirịa nọ na mba ọzọ bụ Nigerians in Diaspora Commission (NiDCOM) ekwuola na Gọọmentị etiti na-arụ ọrụ iji chekwaa ndị Naịjirịa nọ na mpaghara Middle East n'ihi ọgbaaghara na-aga n'ihu na mpaghara ahụ.

Ụlọmgbasaozi mpaghara kwuru na nkwupụta a dị n'ozi onyeisi ngalaba mgbasa ozi na mmekọrịta ọha na eze nke ụlọọrụ NiDCOM bụ Abdur-Rahman Balogun, wepụtara n'ụbọchị Tuzde 3 Maachị 2026.

Ọ gara n'ihu kwuo na ndị ọchịchị Naịjirịa na-enyocha ọnọdụ ahụ ma na-anatakwa oku "site n'aka ndị Naịjirịa ole na ole nọ na Qatar, UAE, na Iran bụ ndị na-ajụ banyere nkwadebe maka ịkwapụ ndị mmadụ ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa.

"Eziokwu dị na ya bụ na Mịnịstrị nke mmekọrịta mba ọzọ na ụlọọrụ niile dị mkpa na-arụkọ ọrụ maka usoro kwesịrị ekwesị, ebe ọ na-arịọ ndị Naịjirịa nọ na mba ndị ọnọdụ ahụ metụtara ka ha mee ihe dị na ndụmọdụ njem dịka Ministri nke mmekọrịta mba ọzọ si nye ma kpọtụrụ akara ekwentị gbatagbata nke ministri ahụ nyere.

"Ndị Naịjirịa nọ na mba ndị ọgbaaghara ahụ metụtara kwesịrị inwe obi sie ike na gọọmentị etiti na-enyocha ọnọdụ ahụ ma ga-eme ihe dị mkpa iji hụ na ọ dịghị ndụ Naịjirịa nọ n'ihe ize ndụ," ka akwụkwọ ozi ahụ kwuru.

Cheta na Gọọmentị etiti Naịjirịa dụrụ ndị Naịjirịa nọ na mpaghara Middle East, ọkachasị na Iran, ọdụ n'ụbọchị Satọde, ka ha gbaa mbọ chekwaa onwe ha n'ihi nsogbu dị na mpaghara ahụ.

Chetakwa na mba Amerịka na Izrel malitere ịwakpo mba Iran n'isi ụtụtụ Satọde 28 Febụwarị 2026. Mana ndị ọchịchị Iran megwara ma mechaa wakpoo mba ụfọdụ dị na mpaghara Gulf.

Agha Izrel na Ịran: Anyị nọ n'ọsọ oge niile - Nwaafọ Naịjirịa bi n'Izrel

Nkọwa foto, Etu ọnọdụ si dịrị ugbua na mpaghara Bennie Bracks dị n'Izrel

Ụfọdụ ụmụ Naịjirịa bi na mba Izrel ekwuola na ndụ ha nọ ihe egwu dịka agha dapụtara n'etiti mba ahụ na Ịran na ngwụcha izuụka.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Kemgbe ụbọchị Fraide, Izrel na Amerịka jikọrọ aka tụọ ogbunigwe gburu onye ndụ Ịran bụ Ayatollah Khamenei, Ịran na Izrel jizi mgbọ na ogbunigwe eme onwe ha tụmsara.

Ọgbaghara ahụ dapụtara emetụtala njem ụgbọelu, dịka e mechiri ụfọdụ ọdọụgbọelu, ọrịrị ọnụahịa mmanụ agbịdị, ma butekwa ngagharịiwe n'ụfọdụ obodo dịka Naịjirịa na Pakịstan ma tinye ịtụ uche nye ndị Afrịka bi na mba ndị o metụtara.

Otu nwaanyị Naịjirịa na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na kemgbe ụbọchị atọ gara aga, ọ bụ na bọnka ka ya na di ya, ndị Naịjirịa, ndị Izrel na ndị mba ọzọ na-ehi ụra.

"Anyị bidoro ịgba ọsọ maka ogbunigwe a na-atụ n'Izrel n'ụtụtụ ụbọchị 27 Febụwarị. Anyị nwetara ozi gbatagbata kwuru ka anyị dị nkwadobe maka ihe chọrọ ime".

"Ha gwakwara anyị oge anyị ga-eji ruo na bọnka ebe nchekwa dị. Otu nkeji na ụma ka e nyere anyị iji ruo ebe ahụ. Ọ na-abụ anyị nụ ụda opi gbatagbata, onye ọbụla ewere ọsọ gbagaa na bọnka ahụ. Ị garuo ebe ahụ, ị nọrọ ala maọbụ dinara".

"Ị ga-anọzi ebe ahụ na-anụ ụda ihe na-eme. Ọ bụrụ na ha mechaa, anyị ga-anụ ụda ọzọ ga-agwa anyị ka anyị pụta, na ihe niile adịla mma. Mgbe ụfọdụ ị baa n'ụlọ ka i mee ihe ụfọdụ dịka isi nri, ụda gbatagbata ahụ ebidokwa ọzọ," ka nwaanyị ahụ gwara anyị.

O kwuru na ọnọdụ a na-enye ha nsogbu, ma na-emekwa ka ha ghara ime ihe ndị ha kwesịrị ime.

"Anyị anaghị esinwu nri, anyị anaghị erinwu nri, o nweghị ebe anyị na-aga. Ị banye n'ụgbọala bọọsụ, ụda ahụ ebido, anyị agbapụkwa," ka o kwuru.

Nwaanyị ahụ kọwara na ya nọ na mpaghara Bennie Bracks dị n'Izrel, mana ka ọ dị ugbua, onye niile nọ n'ụlọ maka na a dọrọ aka na ntị sị onye agakwala ọrụ.

O mere ka anyị mara na okporoụzọ niile dị ka ebe a gbara ọsọ maka na onye niile nọ n'ime ụlọ.

Dịka o siri kwuo, ọnọdụ a na-ewute ya, maka na o nweghị onye ma ihe ọ ga-eme.

"Anyị na-ele anya iji mara ma ọ ga-akwụsị mgbe na-adịghị anya ka anyị malite ibi ndụ dịka o kwesịrị," ka nwaanyị ahụ gbakwunyere.

Gịnị ka gọọmenti Naịjirịa na-eme?

Ebe foto si, @DOlusegun/X

Nkọwa foto, Akwụkwọ ozi Ụlọnnọchiteanya Naịjirịa dị na mba Kuwait nakwa Bahrain wepụtara n'ụbọchị 1 Maachị 2026

Ụlọnnọchiteanya Naịjirịa dị na mba Kuwait nakwa Bahrain enyela ụmụafọ Naịjirịa ndị bi n'ebe ahụ ndụmọdụ ka ha gaa n'ihu mụrụ anya, rube isi na ntuziaka nchekwa niile nke gọọmenti mba ha nọ na ya ma dere duu oge niile.

Nke a dị n'otu akwụkwọ ozi Ụlọnnọchiteanya ahụ wepụtara n'ụbọchị 1 Maachị 2026, nke onye enyemaka pụrụiche nye Onyeisiala Tinubu n'ihe gbasara soshal midịa bụ Dada Olusegun kesara n'akara X ya.

Ozi ahụ gbara ndị Naịjirịa niile bi na Kuwait nakwa Bahrain ume ka ha na-ege ntị n'akụkọ ndị na-eme na mba ahụ mgbe dum.

Ụlọnnọchiteanya ahụ kwuru na ha asaala anya mmiri iji mara ihe niile na-eme, dịkwa ka ha na-akpọtụrụ ndị ndu obodo dị iche iche.

Ka o sina dị, ozi ahụ kwuru na Ụlọnnọchiteanya ahụ ekepụtala akara WhatsApp iji hụ na ha na mmadụ niile na-akparịta ụka oge dum.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post

Cheta na ọ bụ n'ụbọchị Satọde 28 February, 2026 ka ụlọọrụ mgbasaozi mba Ịran kwupụtara na onyendu kachasị n'Ịran bụ Ayatollah Ali Khamenei anwụọla na mwakpo mba Amerịka na Izrel wakporo Ịran.

Ọnọdụ a emeela ka e nwee nkwarịta mgbọ n'etiti mba Izrel na Ịran, dịka ụfọdụ ndị Naịjirịa bi na mba ndị ahụ na-egosi ụjọ gbasara ya.