Mmadụ 80 n'ime 177 a tọọrọ na Kaduna steeti apụtala n'aka ndị ntọ – Ndị uweojii

Ebe foto si, BBC / Getty images
Ndị uweojii na Kaduna steeti ekwuola na ndị ụka mmadụ iri asatọ n'ime mmadụ otu narị, iri asaa na asaa (177) a tọọrọ na Kaduna steeti apụtala n'aka ndị ntọ.
Ndị uweojii kwuru na ndị ahụ anakwurula ezinaụlọ ha, mana ndị uweojii na-ekwu nke a n'ihe karịrị izu ụka ole ma ole a tọọrọ ndị ahụ.
Cheta na ha so na mmadụ 177 a tọọrọ n'ụlọụka dị na Kurmin Wali, n'ime obodo a Kaduna steeti.
Ndị uweojii kwuru na ọtụtụ n'ime ndị ahụ gbara ọsọ ndụ ha, gbapụrụ n'aka ndị ntọ n'otu ụbọchị ahụ ndị ntọ na-akpụrụ ha.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Mansur Hassan gwara BBC kwuru na ọtụtụ n'ime ndị ahụ gbara ọsọ ndụ ha gbabara n'obodo ndị ọzọ dị nso, ma na-eche mgbe ihe ga-adị mma ka ha lọghachita azụ n'obodo ha.
Ọ sị na ha emeela nnyocha n'isi ndị ahụ lọghachitere azụ, nelee ahụike ha, ma mee ka ha nakwuru ezinaụlọ ha.
Ndị uweojii gara n'ihu kwuo na ha na-agba mbọ ịzọpụta mmadụ iri na asaa ndị ọzọ ka nọ n'aka ndị ntọ.

Ebe foto si, US Emassay,Nigeria
Gọọmentị Amerịka agwala Gọọmentị Naijiria ka ha gbalịsie ike ịhụ na tigbuo-zogbuo megide ndị ụka Kraịstị kwụsịrị.
Nke a na-abịa dịka atọọrọ ihe karịrị mmadụ 170 na n'ụlọụka atọ na Kaduna Steeti Ụbọchịụka.
Odeakwụkwọ na-ahụ maka ndọrọndọrọ Ọchịchị bụ Allison Hooker bụ onye kwuru nke a dịka otu Amerịka na Naijiria bụ nke e hiwere ọhụrụ maka okwu nchekwa a kpọrọ "US-Nigeria Joint Working Group," nwere nzukọ mbụ ha n'Abuja na nsonso a.
Hooker kwuru sị,"Anya anyị dị n'akụkọ na ndị bu egbe tọọrọ ihe karịrị ndị ụka Kraịstị 170 na Kaduna n'abalị 18 nke ọnwa Jenụwarị."
"Anyị chọrọ ka ụdị tigbuo-zogbuoa kwụsị."
Hooker kwuru na ọgbakọ ahụ bụ ka a kpaa otu mba abụọ ahụ ga-esi arụkọ iji hụ; na tigbuo-zogbuo megide ndị ụka Kraịstị kwụsịrị, na-enyochara mwakpoo nile ma kpụpụ ndị aka ha dị na ya ụlọikpe iji belata ogbugbu, agbamọsọndụ nakwa ntọrị ndị ụka Kraịstị.
Ndị bịara ọgbakọ ahụ gụnyere onye ndụmọdụ nchekwa Naijiria bụ Nuhu Ribadu, onyeisi ndịuweojii Naijiria bụ Kayode Egbetokun nakwa Mịnịsta na-ahụ maka mgbasaozi bụ Mohammed Idris.
'Ọbara ebe nile' - Nwaanyị so na ndị a tọọrọ mịlahụrụ ndị ntọ na Kaduna

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Obodobo plasta e ji anyado dị ya n'ise ebe ndị ojiegbe ahụ kụrụ ngwọgụ n'isi.
Nwaanyị onye anyị achọghị ịkpọ aha ya nọ n'ụlọụka n'otu ime obodo dị n'Kaduna Steeti oge ndị ojiegbe wakporo tọọrọ ndị bịara ụka ma kpụrụ ha pọ.
Ha kụrụ nwaanyị gbara afọ 60 isi egbe n'isi iji kpalite ya ka o welite ụkwụ.
Ọsịrị dịka ọ na-eme ebe o meruru ahụ n'isi aka sị,"Ọbara juru ebe nile."
"Atara m ahụhụ",
I lee ya anya hụ na ọgabigara nnukwu ihe n'abalị anọ gara aga.Ha dọọrọ m na-aga na-agbannyeghị n a m gwara ha na ụkwụ adịghị m."
"A gakata, m zoo rue mgbe m ahụghịkwa ha ọzọ, m were gbere egbere gbebata n'obodo."
A tọọrọ ọtụtụ mmadụ n'ụlọụka ya nke bụ ụlọụka 'Cherubim and Seraphim Movement Church' nakwa ụlọụka abụọ ndị ọzọ n'obodo Kurmin Wali nke bụ kilomita 135 km (84 miles) ma i si ebe ahụ gawa Abuja.
Na-agbanyeghị na mmadụ 11, gbalahụru ndị ntọ ahụ, mmadụ 160 ka bụ ndị a mabeghị ebe ha nọ, dịka ngalaba otu jikọrọ ndị ụka Kraisti'Christian Association of Nigeria' si kwuo..
The remaining villagers have been left devastated and fear more attacks.
Ndị fọrọ n'obodo ahụ ka na-ama jiji n'ihe egwu na e nwere ike inwe mwakpo ọzọ.
Ndị gọọmentị ewepụtabeghị ọnụọgụgụ ndị ntọrị a metụtara.
'Gọọmentị chọrọ ikpuchi anyị ọnụ, ha achọghị ka anyị kwuo maka ntọrọ a tọrọ mmadụ 177 n'obodo anyị.'

Ebe foto si, Getty Images
Ndị obodo Kurmin Wali dị n'Okpuru Ọchịchị Kajuru ebe a tọrọ mmadụ 177 eboola ebubo na ndị gọọmentị gbalirị ikpuchi ha n'ọnụ ikwupụta ihe mere.
Ndị obodo gwara BBC na n'abalị 21 nke ọnwa Jenụwarị na ndị gọọmetị gwara ha agwakwala ndị ntaakụkọ ọbụla okwu, ha gbochikwara ndị ntaakụkọ ịbata obodo ahụ.
Otu onye obodo ahụ achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ndi gọọmentị dọrọ ha aka na ntị ka ha ghara ịgwa ndị ntaakụkọ maka mwakpo ahụ.
BBC enweghị ike ịba obodo Kurmin Wali ozigbo ka ha rutere n'ihi na ndị ọrụ nchekwa nọ n'ebe e si abata obodo ahụ gwara ndị ntaakụkọ BBC chighaa azụ.
Mana ha nyere ndị ntaakụkọ anyị ohere ka ha kwesiri ịba obodo ahụ.
Ndị a tọrọ na ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ha nọ n'ụjụ na ịtụegwu n'ihi enweghị nchekwa zuru oke.
Gọvanọ Sani agaala leta ezinaụlọ ndị a tọọrọ na Kaduna Steeti
Aka na-achị Kaduna steeti bụ Gọvanọ Uba Sani agaala njem nleta n'ebe ahụ a tọọrọ ndị ụka Kraịst na steeti ahụ.
Nke a na-eme dịka ndị uweojii kwuru na ọ bụ eziokwu na ndị ntọ wakporo otu obodo ma tọrọ ndị ụka na steeti ahụ.
Sani zutere ọtụtụ ezinaụlọ mkpamkpa ahụ metụtara ọkachasị ndị meruru ahụ mgbe ha na-agba ọsọ ndụ ha.
A tọọrọ mmadụ karịrị otu narị n'ụlọ ụka atọ dị na n'okpru ọchịchị Kajuru, na Kaduna steeti.

Ihe ndị ntọ kwuru mgbe ha tọọrọ ndị obodo anyị mmadụ 177- Emir

Emir obodo a na-akpọ Kurmin Wali, Kajuru dị na Kaduna steeti akọwaala ihe ndị ntọ gwara ha mgbe ha na-awakpo obodo ahụ na-atọrọ ndị mmadụ.
Ndị ntọ tọrọ mmadụ ruru 177 n'ụbọchị ụka gara aga.
Mana Emir nke Kurmin Wali bụ Ishaku Ishaku E. Sidi kwuru na ndị ntọ ahụ gwara ha na ndị obodo ha napụrụ ha ọgbatumtum ruru iri na asaa na ọ bụ ya mere obodo ahụ niile ga-akwụ ụgwọ ya.
Ishaku Ishaku E. Sidi sị na ha gara kpụrụ ndị nọ n'ụlọụka ma kpọrọ ha baa ime ọhịa.

Ihe ndị uweojii kwuru maka ntọrị ahụ
Ndị uweojii Naịjirịa ekwuola na ọ bụ eziokwu na a tọọrọ ndị ụka Kraịst n'obodo Kurmin Wali dị n'okpuru ọchịchị Kajuru na Kaduna Steeti.
Nke a na-abịa dịka ndị uweojii mere ka o doo anya na ozi ahụ ha wepụtara n'abalị Tuzde 20 Jenụwarị 2026 bụ n'ihi na ha enweghị ozi zuruoke gbasara ndị ahụ a tọọrọ nakwa ihe ndị ọzọ banyere etu o si mee.
Ozi onu na-ekwuru ndị uweojii Naịjirịa bụ Benjamin Hundeyin wepụtara kwuru na nnyocha ha mere gosiri na e nwere ndị a tọọrọ.
Hundeyin ekwughị mmadụ ole a tọrọ mana ọ gwara ndị ntaakụkọ na e zigala ndị uweojii kara aka n'okpuru ọchịchị Kajuru nakwa obodo ndị ọzọ gbara ya gburugburu iji nye ọhanaeze bi ebe ahụ ezi nchekwa.
Ọ gara n'ihu kwuo na a na-eme nnyocha iji chọpụta ndị ahụ a tọọrọ ma zọpụta ha n'aka ndị ojiegbe ahụ tọọrọ ha.

Ụfọdụ ndị obodo ahụ gwara BBC na ndị ojiegbe ahụ tọọrọ ndị ụka Kraịst 177 n'ụlọụka atọ dị n'obodo Kurmin Wali, mana mmadụ 11 gbapụrụ nke pụtara na mmadụ karịrị 160 nọ n'aka ndị ojiegbe ahụ.
Akwụkwọ ndekọ BBC hụrụ n'ụbọchị Tuzde 20 Jenụwarị, 2026 gosiri aha mmadụ ruru 160, mana a maghị ma ndekọ ahụ ọ bụ eziokwu.
Onye hụrụ oge ihe mere gwara BBC na ndị ojiegbe ahụ wakporo ụlọụka ahụ n'elekere iri nke ụtụtụ n'ụbọchị Sọnde 18 Jenụwarị, 2026.
N'okwu ya: "Ụfọdụ ndị mmadụ chọrọ ịgbapụ ọsọ mana ndị ojiegbe ahụ gbara obodo ahụ gburugburu, ha chịkọtara ọtụtụ ndị mmadụ ma kpọrọ ha banye n'ime ọhịa".
Ndị obodo kwuru na ụlọụka o metụtara gụnyere Cherubim and Seraphim Movement Church (C&S) 1, Cherubim and Seraphim Movement Church (C&S) 2 na ụlọụka Evangelical Church Winning All (ECWA).

Onyeisioche otu Christian Association of Nigeria na mpaghara ugwu Naịjirịa bụ Ụkọchukwu Joseph Hayab kwuru na ọnụọgụgụ ndị ojiegbe buru ibu.
Ndị obodo kwuru na ndị ojiegbe ahụ zuuru ego nakwa ụfọdụ ihe ndị ọzọ ma kwuo na ka ọ dị ugbua, egwu na-atụ onye niile n'obodo ha.
Ndị ojiegbe a na-awakpo ma na-atọrọ ọtụtụ mmadụ na mpaghara ugwu Naịjirịa iji napụta ezinaụlọ ndị a tọrọ ego. Oge ụfọdụ ndị ojiegbe a na-egbu ụfọdụ ndị ha tọọrọ n'abanyeghị na ha anatala ego.

Ebe foto si, Copilot
Ihe Amnesty International kwuru

Ebe foto si, Getty Images
N'aka nke ọzọ, otu na-ahụ maka ikike nke mmadụ bụ Amnesty International akatọọla agwa ndị uweojii Naịjirịa, n'ihi agụgọ ha gọrọ gbasara ndị ahụ a tọọrọ.
Ha kwuru na ọ dị mkpa na gọọmenti mapụtara atụmatụ ga-egbochi oke ntọrị ndị ojiegbe na-atọrị ndị mmadụ na Naịjirịa kwa mgbe kwa mgbe.


































