Ihe mere gọọmentị Enugwu ji mechie ụlọakwụkwọ karịrị 1,000

Foto ministrị agụmakwụkwọ nke Enugwu steeti

Mịnịstrị na-ahụ maka Agụmakwụkwọ n'Enugwu steeti agbachiela ụlọakwụkwọ 1,904 kwụụrụ onwe ha n'ihi na ha agbatachaghị akwụkwọ na-enye ha ikike ibụ ụlọakwụkwọ.

Ya bụ ozị pụtara n'izuụka gara aga, bụ nke tinyegoro ndị ụlọakwụkwọ ya bụ mmachi metụtara na gbagharịa, n'ihi na ndị nne na nna akwụchaala ụgwọ akwụkwọ maka afọ akwụkwọ ọhụrụ ka malitere amalite.

Kọmishọna agụmakwụkwọ na steeti ahụ bụ Ọkammụta Uche Eze, kwuputara na ya bụ mmachi abịaghị na mberede, kama na gọọmentị gwara ụlọakwụkwọ ndị ahụ ka ha gbaa mbọ kwụnye ụgwọ ha (ụgwọ akwụkwọ ikike ịbụ ụlọakwụkwọ) n'akpa gọọmentị Enugwu steeti tupu afọ akwụkwọ ọhụrụ a amalite, mana ha aṅaghị ntị ganye na e mechie ha.

BBC Igbo gara na Divine Academy Ugwogo Nike, bụ otu n'ime ụlọakwụkwọ ndị ahụ a gbachiri agbachi, ebe otu onye nkuzi nọ gwa anyị na onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ agaala ịgbata akwụkwọ ikike ya n'isi ụlọọrụ ndị agụmakwụkwọ.

Onye nkuzi ahụ kwuru na olileanya ha bụ na ụlọakwụkwọ ha ga-emepe ngwa ngwa.

Onyeka Obiowo, otu onye nna nwa ya na-aga akwụkwọ na God's Own Academy Ifo, Abakpa Nike, Enugwu, gbarụrụ ihu wee taa gọmenti ụta na ha kwesịrị ịgwa ndị nwe ụlọakwụkwọ iwu ha dara tupu amalite oge agụmakwụkwọ nke atọ.

Onye nne sara anyị okwu bụ Sandra Ani, kwuru na ya akwụọla ụgwọ akwụkwọ ụmụ ya anọ tupu ọ nụ na ụlọakwụkwọ ha bụ Amazing Heights Nursery na Primary dị n'Agbani, so na ndị emechiri emechi.

Oriakụ Ani gara n'ihu rịọ gọọmenti ka ha mepee ụlọakwụkwọ ndị ahụ n'ihi na ọtụtụ ndị nne na nna akwụọlarị ụgwọ akwụkwọ.

Ihe anyị hụrụ n'ụlọọrụ ministri agumakwụkwọ Enugwu steeti mgbe anyị garuru, bụ na ọtụtụ ndị nwe ụlọakwụkwọ emechiri emechi na-agba mbọ imezu ihe iwu kwuru, ka e nwee ike mepee ha.

Onye ọrụ na ya bụ ministri na-achọghị ka akpọọ aha ya, gwara BBC Igbo na e nyere ụlọakwụkwọ ndị a ozi idọ aka n'ntị ugboro ugboro n'ime ọnwa ole na ole gara aga, mana ha egeghị ntị.