Lee ụbọchị ụlọikpe kachasị tinyere ikpe Nnamdi Kanu - Ọkaiwu Ejiofor

MNK

Ụlọikpe kachasị bụ 'Supreme Court' na bekee etinyela ikpe dị n'etiti Mazi Nnamdi Kanu na gọọmentị Naịjirịa ka ọ bụrụ n'ụbọchị Mọnde, Ọktoba 24, 2022.

Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor kwuru nke a n'ozi o zipụtara n'akara soshal midia ya na mgede Tọzde.

Ejiofor kwuru na ya gara leta Mazi Kanu taa bụ Tọzde n'ụlọ mkpọrọ ndị DSS "ebe ha ka jicihiri Kanu na nnupuisi na mkpebi ụlọikpe".

O kwuru na ihe ya na Mazi Kanu kpara maka ya gbadoro ụkwụ n'akwụkwọ nke gọọmentị Naịjirịa gbara Kanu n'ụlọikpe kachasi, gbasara mkpebi nke ụlọikpe mkpegharị nyere nke bụ ka a tọhapụ Kanu.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post

"Mụ na Kanu kpara gbasara usoro anyị ga-agbaso iji hụ na Onyendu pụtara na mkpọrọ, ọ kacha ugbua ụlọikpe tinyere ikp ahụ n'ụbọchị Mọnde, Ọktoba 24, 2022," Ejiofor depụtara.

"Ọ bụ eziokwu na gọọmentị nwere ikike ịgbagharị akwụkwọ, mana anyị kwenyesiri ike na gọọmentị ga-ebugodu ụzọ rube isi na mkpebi ụlọikpe mkpegharị nke kwuru ka atọhapụ Mazi Kanu na-egbughị oge."

Ejiofor kwuru na o doro ha bụ ndị ọkaiwu Kanu anya na akwụkwọ a gọọmentị etiti gbara n'ụlọikpe kachasị bụ ka ha hụ ohere ha ga-eji jigide Mazi Kanu, "mana atụmatụ ha agaghị emezu".

"Ndị ọkaiwu Onyendu nke Ọkaiwu Mike Ozekhome SAN bụ onyeisi ya, dị njikere maka ụbọchị ikpe bụ Ọktoba 24, 2022."

Gọọmenti Etiti agbaghariala Nnamdi Kanu akwụkwọ n'Ụlọikpe Kachasị

Gọọmentị kwuburu na ha ga-achọ ụzọ n'ikpe Kanu dịka mpụtara ikpe n'ụlọikpe mkpegharị gbara n'ọha.

Ebe foto si, Malami/BBC

Nkọwa foto, Gọọmentị kwuburu na ha ga-achọ ụzọ n'ikpe Kanu dịka mpụtara ikpe n'ụlọikpe mkpegharị gbara n'ọha.

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na Gọọmenti Etiti agbaghariala onye ndu otu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu akwụkwọ n'Ụlọikpe Kachasị.

Ụlọikpe  Mkpegharị dị na Abuja nọrọ  n’abalị 13 nke ọnwa Oktoba, afọ 2022 nye mkpebi ka atọhapụ Kanu, sị na ikpe amaghị ya na-ebubo metụtara iyi ndụ egwu.

Mana Gọọmentị Etiti site n'ụlọọrụ Ọkaiwu Naijiria bụ Abubakar Malami gbara akwụwkwọ ụnyahụ bụ Wenezde n'abalị 19 nke ọnwa Oktoba, afọ 2022. n'ụlọikpe Kachasị sirịọ ka ụlọikpe ahụ gbachie ntọhapụ Kanu.

Gọọmentị gbadoro ụkwụ n'ihe asaa bụ ihe ha sị ha jiri gbajọọ mkpebi Ụlọikpe mkpegharị.