Onitsha Main Market: Gọọmentị Anambara steeti amalitela ịkwatu ụlọ na ọdọahịa ndị adabanyeghị n'iwu

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Gọọmentị amalitela ịkụri ụlọ nakwa ọdọahị adịghị adabanyeghị n'iwu n'Ahịa 'Main Market Ọnịcha n'ụtụtụ taa bụ Ụka, abali mbụ nke ọnwa Maachị, afọ 2026.

Ndị ọrụ ahụ nke malitere n'ezi ụtụ bụ ụlọahịa ndị a tụrụ aka ikwatu n'ahịa ahụ a sị ahịa kachasị n'Ọdịda Anyanwụ Afrịka.

Onye ntaakụkọ anyị gara ebe ahụ kwuru na ọ bụ ndị ọrụ Okpuru Ọchịchị 'Onitsha-North' bụ ndị kwaturu ụlọ ndị ahụ n'ụzọ ụtụtụ Ụbọchịụka.

Skip Facebook post
Hapụ Facebook ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Facebook. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Facebook iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of Facebook post

Cheta na Gọọmentị Anambara steeti na ndịahịa nwere nkwekọrịta ihazigharị ahịa 'Main Market' na nso nso a dịka ha nwere ọgbakọ..

Gọọmentị nyere ndị ahịa ịzuụka anọ tupu mbibi ụfọdụ ụlọahịa n 'Onitsha Main Market' amalite

Nkọwa foto, Ndị na-akwa ibu ha tupu nkwatu ọdọahịa ahụ

Gọọmentị Steeti Anambra adọrọ aka ná ntị nke ikpeazụ nye ndị ụlọahịa ha so na ndị nke e tinyere akara maka mbibi.

N'akwụkwọ ozi gọọmentị ime obodo Ọnịcha Nọt wepụtara nke Onyeisioche Anthony Nwora binyere aka, e nyere ndị ụlọahịa nọ na 'Park 1,2 na 3' ohere abalị iri na anọ ka ha jiri nwayọo wepụ ngwaahịa ha ma bibie ụlọahịa ha nke iwu na-akwadoghị.

Dịka ohere enyere ha gachara n'ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Febụwari, ha rịọrịọ arị rịọ ka enye kwuo ha abalị iri na anọ ọzọ nke gọọmentị kwenyere mana ohere ahụ bịara na njedebe n'abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Febụwarị.