'Adị m afọ 33, osote m dị afọ 26 na-azọ isioche Amac n'Abuja' - Ugoh

Aha onyonyo, 'Adị m afọ 33, osote m dị afọ 26 na-azọ isioche Amac n'Abuja' - Ugoh
'Adị m afọ 33, osote m dị afọ 26 na-azọ isioche Amac n'Abuja' - Ugoh
Nkọwa foto, Toochi Ugoh onye ji pati APP azọ ọkwa onyeisioche 'Abuja Municipal Council' (Amac) nke FCT na ntụlikaka a ga-eme na abalị iri abụọ na ọtụ nke ọnwa Febụwarị afọ 2026
    • Onye dere ya, Marvelous Obomanu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Onye dere ya, Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist

Toochi Ugoh onye ji pati APP azọ ọkwa onyeisioche 'Abuja Municipal Council' (Amac) nke FCT na ntụlikaka a ga-eme na abalị iri abụọ na ọtụ nke ọnwa Febụwarị afọ 2026 ekwuola na ọ bụ ọdịka mmadụ chọrọ ka ụmụnwaanyị nwere ikike ọchịchị ya mere o ji kpọrọ otu nwaada dịka osote ya na ntụliaka ahụ.

O kwuru na Amac na mba Saụt Afrika kwesịrị ị na ama aka mana etu ọ dị ugbua, Amac emegaghị ọfụma.

"Ihe mere eji anụ maka mmepe AMAC bụ n'ihi minista na-ahụ maka FCT bụ Nyesom Wike"

Mgbe BBC Igbo jụrụ ya maka ebumnobi ya maka nchekwa, o kwuru na ndị na-enye nsogbu na Amac bụ ndị ntorobịa mana ya bụrụ na-ewepụta ọrụ, nsogbu nchekwa ga-ebelata.

"Anyị na-aga achụnta vootu gburugburu n'ime obodo. Anyị na-ahụ nsogbu dị iche iche, anyị ma ihe anyị ga-eme eweta ngwọta zuru oke"

Ọ kọwara na ego eji arụ ọrụ na Amac Karịrị akarị iji rụọ ọrụ mana ndị nọ n'ọchịchị anaghị ekwe ka eji ego ahụ mmepe obodo.