Tiffany Folasade Mordi: Etu e si gbagbuo nwaagbọghọ Naịjirịa gbara afọ 25 na Chicago, America

Ebe foto si, Tiffany Mordi Facebook
N'ụbọchị 18 nke ọnwa Maachị afọ 2022, n'obodo Chicago, mba Amerịka, ka otu nwaada Igbo lara mmụọ site n'aka ndị oji egbe amabeghị ndị ha bụ.
Tiffany Folasade Mordi gbara afọ iri abụọ na ise (25) gara na nke enyi ya nwoke n'abalị fraịde ahụ mgbe ọ fọrọ nkeji 15 ka ọ kụọ elekere 12 nke abalị, mgbe ya bụ arụ mere ya.
Akụkọ kọrọ na ndị ojiegbe ahụ ji ụgbọala nke ha nyachie ya ụzọ ebe ọ nọ n'ime ụgbọala nke ya n'ihu be enyi ya nwoke.
Otu onye n'ime ha si na ụgbọala ahụ pụta gbawa ya egbe ugboro ise wee gbagbuo ya.
Ọ ka gbara ndị mmadụ gharịị ndị kpara ya bụ arụ, dịka ndị enyi Tiffany kọwara ya ka ezigbo mmadụ na-enweghi onye iro.
Ụfọdụ n'ime ha eforola ntutu taa, tie aka n'ala na ha ga-achọtarịrị onye gburu ya.

Ebe foto si, Screengrab
Ha atụtala ihe karịrị dọla puku iri anọ na abụọ ($42,000) iji hụ isi ọnwụ mberede nwaada a na maka akwamozu ya.
O nwebeghị onye a nwụchiri aka ya dị n'ogbugbu nwaada a kemgbe abalị asaa ihe a mechara.
Ndị be Tiffany nọ n'iru uju kemgbe ụbọchị asaa agbagbuchara ya bụ nwaada.
Onye bụ Tiffany Folasade Mordi?
Tiffany Folasade Mordi bụ onye Ibusa na Delta steeti.
Nna ya si Ibusa ebe nne ya bụ onye Yoruba.
Tiffani kwesịrị ime ncheta ọmụmụ ya echi ya bụ 19 Maachị nke afọ 2022, tupu o zute ọnwụ ya n'abali 18 Maachi 2022.
Ya na enyi ya nwoke ahụ ayịala afọ asaa; ha malitere ime ọyị mgbe ha nọ n'ụlọakwụkwọ sekọndịrị.
Ọ gụrụ "Health Care Management" na Mahadum Southern Illinois University, n'Amerịka.
Tiffany na nne ya bi n'obodo Bolingbrook, bụ ebe o si gawa ịhụ enyi ya nwoke na Little Village, tupu a gbagbuo ya.






























