Nturuugo African Sports Personality 2021 eweputala aha ndị nwereike imeri
BBC ahọpụtala ndị egwuregwu olemole pụrụiche n'egwu ha dịka ndị a ga-azọ nrite onye kachasi ibe ya n'egwuregwu n'afọ 2021.
Ndị otu ntaakụkọ nọ na mba Afrịka nakwa na mba Brịten tụkọtara aka ọnụ wee họpụta mmadụ isii ga-azọ nturuugo a.
Gịnị bụ Africa Sports Personality of the Year (ASPOY)?
Africa Sports Personality of the Year - ASPOY n'ichafu bụ ihe nrite ndị na-enye ndị eme egwuregwu nke BBC a kpọrọ ọ bụ ihe nrite nke a na-enye nturuugo onye bụ ọkachasị eme ihe egwuregwu site na nhọpụta ndị na-ege BBC redio.
Nke bụ ndị nsonso BBC onwe ha na-ahọpụta ha site ozi ekwenti maọbụ n'igwe intaneti.
Kedụ ndị a na-ahọpụta?
Ndị a ahọpụtara bụ ndị ritere mmeri pụrụịche n'egwu nke ha na mba ofesi dị ịcheịche bido na ọnwa Jenụwarị ruọ ọnwa Sepụtemba 2021.
Ahọpụtakwara ndị ikike mmeri ha gafere egwu nke ha bawanye ruo ma metụta egwu ndị ọzọ.
Ndị ahọpụtara bụ:
•Eliud Kipchoge (Ọgba ọsọ)
•Faith Kipyegon (Ọgba ọsọ)
•Ntando Mahlangu (Onye ọgba ọsọ ọrụsị)
•Christine Mboma (Ọgba ọsọ)
•Edouard Mendy (Ọgba bọọlụ)
•Tatjana Schoenmaker (Ọnye na-egwu mmiri)
Lee ihe ndị dị mkpa ị kwesiri ịma maka ndị a ahọpụtara nakwa etu ị ga-esi tinyere onye masiri gị vootu.
Marakwa na itinye vootu ga-emechi n'oji otu nkeji banye elekere iri na abụọ nke abali n'ụbọchị iri na itolu (19) n'ọnwa Disemba.
A ga-akpọpụta onye ritere mmeri n'ụbọchị asaa nke ọnwa Jenụwarị n'afọ 2022 na ihe onyonyo BBC bụ 'Focus on Africa', aga akpọpụtakwa ha na BBC redio nakwa n'akụkụ egwuregwu na websaịt BBC.
Pịa aka ebe a ka i tinyere onye masiri gị vootu - Kedụ onye mba Afrịka ndị a i ga-etinyere vootu ka BBC họpụta dịka ọpụrụịche n'egwuregwu n'afọ 2021?
Eluid Kipchoge
Ebe foto si, Getty Images
Eluid bụ onye mba Kenya, ọ dị afọ iri atọ na asaa (37) ọ bụ onye ọgba ọsọ ogologo oge nke Beekee n'akpọ 'Marathon'.
Eluid bụ ọpụrụịche n'egwu ịgba ọsọ dịka o ritere ọlaedo nke abụọ ya n'asọmpị Olympics ma gbaa ọsọ gafee 'miles' iri abụọ na isii (26 miles).
Faith Kipyegon
Ebe foto si, Getty Images
Faith bụ nwaada mba Kenya, ọ dị afọ iri abụọ na asaa (27), ọ bụ onye ọgba ọsọ.
Faith bụ ọpụrụiche n'egwu ọsọ dịka ọ mere ihe mmadụ emetụbeghị n'egwu ịgba ọsọ nke asọmpị Olympics na mba Tokyo ebe ọ gbakariri ndị ogbo ya niile n'ọsọ ruo 'miles' otu puku na ọkara ya (1500 miles).
Ntando Mahlangu
Ebe foto si, Getty Images
Ntando bụ onye mba South Africa, ọ dị afọ iri na itolu (19) Ntando bụ onye ọgba ọsọ nke ndị ọrụsi bụrụkwa onyue na-awụli elu n'egwu 'Long Jump'.
Nwaamadi a ritere nturuugo nke mbụ ya mgbe ọ dị afọ iri na anọ (14).
Ọ mere ihe mmadụ emetụbeghị n'ewgu ịgba ọsọ nke ndị ọrụsịọ ebe ọ gbafere mmadụ niile n'ọsọ nke '200 meters' n'oge nkeji iri abụọ n'ụma (22.94s).
Christine Mboma
Ebe foto si, Getty Images
Nwaada a bụ onye mba Namibia, ọ dị afọ iri na asaatọ, ọ bụ onye ọgba ọsọ ọbere oge.
Christine bụ nwaanyị mbụ nke mba Namibia riterela mmeri n'egwu ịgba ọsọ nke asọmpị Olympics.
O ritere mba ha mmeri ọlaọcha n'egwu ịgba ọsọ na Tokyo 2020, ihe a bụ nke mbụ mba Namibia na-enweta nturuugo n'asọmpị Olympics kemgbe afọ iri abụọ na ise gara aga.
Edouard Mendy
Ebe foto si, Getty Images
Edouard bụ onye mba Senegal, ọ dị afọ iri abụọ na itolu, ọ bụ ọchee goolu.
Maazị Mendy e gosila na ọ bụ ọpụrụịche n'ịchee goolu n'otu Chelsea.
Ọ bụ onye mba Afrịka mba so n'egwu ikpezụ nke asọmpị 'Champions League', bụrụ kwa onye mba Afrịka mbụ so n'asọmpị European Cup kemgbe afọ 1985 mgbe Bruce Grobbelaar bụ onye mba Zimbabwe mere nke a . Tatjana Schoenmaker
Ebe foto si, Getty Images
Nwaada Schoenmaker bụ onye ọpụrụịche na-igwu mmiri dịka o ritere mba ya bụ mba South Africa ọlaedo nakwa ọlaọcha na asọmpị Olympics nke Tokyo 2020 ebe ọ mere ihe ndị ogbo ya emetụbeghị n'egwu ịgwu mmiri nke 100m na nke 200m.
Isi akụkọ
Kọwaara m isi akụkọ
Akụkọ akachasị gụọ
Content is not available