Anambra election 2021: Ihe ị kwesịrị ịma maka mmadụ 18 na-azọ oche gọvanọ Anambra steeti
Dịka ndị mmadụ na-akwado ime ntuliaka e ji ahọpụta onye ga-achị Anambra steeti afọ anọ ọzọ na-abịa, lee ihe ị kwesịrị ịma maka onye ahụ.
N'ime mmadụ 18 anyị ga-akọwa ndị ha bụ n'akụkọ a, otu onye ga-azọtarịrị ya bụ oche gọvanọ.
Onye ka ọ ga-abụ?
Ndị na-azọ ọkwa Gọvanọ n'Anambra
- Profession: Dọkịta ahụike na-ahụ maka ịgwọ ụfụ nke Bekee kpọrọ ‘pain management’.
- Age: 62
- Maduka bụ onye Umuchukwu dị n’okpuruọchịchị Orumba dị n’Anambara steeti.
- Ọ gụrụ akwụkwọ ma na-arụ ọrụ na mba Amerịka tupu ọ pụta ịzọ ọkwa ọchịchị.
- Ọ rụọla ọtụtụ ụlọụka, ụlọọgwụ, ụlọikpe nakwa ụlọọrụ ndị uweojii n’obodo Umuchukwu.
- Profession: Ọ bụ ọgụego nke Bekee kpọrọ ‘Accountant’.
- Age: 58
- Ọ bụ diọkpara nwaanyị mbụ bụ gọvanọ na Naịjiria bụ Virgy Etiaba.
- Ọ bụ onye Ezekwuabor Otolo-Nnewi.
- Ọ pụtaburu ịzọ ọkwa gọvanọ n’okpuru pati APC tupu ọ gbaa arụkwaghịm ma gafee n’AA n’ọnwa Julaị 2021.
- Ọ bụbu onyeisi otu Institute of Chartered Accountants of Nigeria nke mpaghara mba Briten, site n’afọ 2002 ruo 2004 ma bụrụkwa onyeisioche Enugwu Sports Club site n’afọ 2017 ruo 2019.
- Profession: Ọ bụ ojiegoachụego
- Age: 55
- Ọ bụ onye Oko, n’okpuruọchịchị Orumba Nọt.
- Ọ pụtaburu ịzọ ọkwa gọvanọ n’okpuru pati APC tupu ọ gafee n’AAC ka ọ na-azọtanwughi ikike ife ọkọlọtọ APC n’ọnwa Septemba 2021.
- Ọ bụ onye mmepụta ihe kacha mara anya ihe gbasara ngwa e ji arụ ụlọ na mpaghara Naịjiria na mpaghara Afrịka.
- Ọ bụ onye omere ọha nke zigarala ọtụtụ mmadụ akwụkwọ n’efu ma menyerela ọtụtụ ndị ogbenye nọ n’obodo ya aka.
- Profession: Ọ bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị
- Age: 59
- Ọ bụ onye Ọkịja dị n’okpuruọchịchị Ihiala He hails from Okija, Ihiala LGA.
- Ọ bụ onye ndụmọdụ pụrụiche nye Goodluck Jonathan bụbu onyeisiala Naịjiria.
- Ọ pụtaburu ịzọ ọchịchị n’okpuru APGA tupu ọ mabanye ADC.
- Ọ bụkwa onye ọkachamara n’ihe gbasara idozi esemokwu nke Bekee kpọrọ ‘conflict resolution consultant’.
- Ọ bụ onye Amichi dị n'Okpuruọchịchị Nnewi Saụt.
- Ọ rụrụ ọrụ dịka onye isi ndị ntorobịa nye Goodluck Jonathan bụbu onyeisiala Naịjiria, n’oge ntuliaka 2015.
- Ọ bụ onye otu Nigeria Union of Petroleum and Natural Gas Workers (NUPENG)."
- Profession: Onye ọkachamara n’ihe gbasara igbo mkpa ndị nwere mkpesa maka ahụike ha.
- Age: 62
- Ọ bụ onye Ụga, n’okpuruọchịchị Agụata He hails from Uga, Aguata LGA.
- Ọ bụbu onye enyemaka pụrụiche nye Olusegun Obasanjo bụbu onyeisiala Naịjiria.
- Ọ chịrị Anambra steeti naanị mkpụrụ ụbọchị iri na asaa (17) n’afọ 2007 tupu ụlọikpe ewepụ ya ma tinyeghachị Peter Obi.
- Profession: Ọkachamara n’ihe gbasara akụnaụba obodo
- Age: 61
- Ọ bụ onye Isuọfịa, n’okpuruọchịchị Agụata He hails from Isuofia, Aguata LGA
- Ọ chịrị ụlọakụ kachasị na Naịjiria bụ Central Bank of Nigeria site n’afọ 2004 ruo 2009.
- Ọ bụghị mbụ ọ na-apụta ịzọ ọkwa gọvanọ dịka ọ nwara n’afọ 2010 n’okpuru PDP, mana Peter Obi meriri ya. Ọ nwakwara n’afọ 2013 n’okpuru APGA, mana ndị nnyocha otu pati ahụ kwuru na o tozughi.
- Profession: Ọ bụbu onye agha ma bụrụkwa onye Bekee kpọrọ ‘Architect’
- Age: 63
- Ọ bụ onye Ichi n’okpuruọchịchị Ekwusigo He hails from Ichi in Ekwusigo LGA
- Ọ zọburu ọkwa gọvanọ Anambra n’afọ 2010.
- Ọ zọkwara ọkwa sinetọ ga-anọchi Anambara Saụt n’afọ 2018.
- Profession: Ọ bụ onye Bekee kpọrọ ‘Philosopher’
- Age: 50
- Ọ bụ onye Ụmụọkpụ, n’okpuruọchịchị Ọka Saụt.
- Ọ bụ osote onyeisioche College of the Immaculate conception (CICOBA) dị n’Enugwu.
- Profession: Ọ bụ onye na-ede akwụkwọ nakwa Injinia
- Age: 47
- Ọ bụ onye Ezinifite, n’okpuruọchịchị Agụata.
- Ọ zọrọ oche gọvanọ Anambara steeti n’afọ 2013 na 2017 mana ọ zọtaghị ya.
- Ọ zọrọ oche Ụlọomeiwu nta n’afọ 2015 mana ọ zọtaghị.
- Ọ zọtaghị oche n’ụlọomeiwu steeti Anambara n’afọ 2019. He failed to secure a seat at the Anambra state House of Assembly in 2019.
- Profession: Ọ bụbu onye ọrụ ụlọakụ
- Age: 40
- Ọ bụ onye Ezinifite, Nnewi Saụt.
- Ọ bụ onye inyere ndị mmadụ aka na-amasị dịka o hibere ngalaba na-enyere ndị ụbịam aka ma na-ezigakwa ụfọdụ akwụkwọ n’efu na Naịjiria. Ọ bụ onye ihe gbasara ikwalite ndị ntorobia na-anụ ọkụ n’obi, dịka o kwenyere na o ruola oge ndị ntorobịa kwesịrị itinye uchu n’ọchịchị na mwulite obodo.
- Ọ bụ onye Ọkịja dị n'Okpuruọchịchị Ihiala.
- Profession: Ọ bụ onye na-ahụ ihe Bekee kpọrọ Real Estate manager nakwa onye ojiegoachụego
- Age: 45
- Ọ bụ onye Ekwulọbịa n’okpuruọchịchị Agụata.
- O hibere otu ndọrọndọrọ ọchịchị a kpọrọ ‘Afamation Movement’ n’afọ 2017, maka ndị ntorobịa na ndị okenye ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị doro anya chọrọ iweta ezigbo ọchịchị.
- Ọ zọburu oche Agụata II n’ụlọomeiwu Anambara steeti n’okpuru APC n’afọ 2019 mana ọ zọtaghị ya. Ọ mabara NRM n’ọnwa Maachị 2021.
- Profession: Ọ bụ ọgụego nke Bekee kpọrọ ‘Accountant’. Accountant
- Age: 50
- Ọ bụ onye Amesi n’okpuruọchịchị Agụata He hails from Amesi, Aguata LGA.
- Ọ bụ onye ihe gbasara iji ego achụego doro anya, dịka o riterela ọtụtụ nzere na nturuugo na ya. He is an erudite businessman who has been recognised for his numerous accomplishments.
- Ọ bụkwa onye mwulite obodo doro anya dịka aka ya dị na mwulite ebe dị iche iche n’ụfọdụ akụkụ Naịjiria.
- Profession: Dibia mgbọrọgwụ na mkpakwụkwọ
- Age: 45
- Ọ bụ onye Nando dị n’okpuruọchịchị Anambara.
- Ọ na-ekwu na ọ bụghị onye ndọrọndọrọ ọchịchị, na ọ chọrọ ịchị Anambara steeti naanị afọ anọ tupu ọ rịtuo.
- Nwawuo a ma dịka Igwe Ayaya pụtaburu ịzọ ọkwa gọvanọ n’okpuru pati AA tupu ọ banye PRP.
- Profession: Ọkaiwu/Ojiegoachụego Lawyer/Businessman
- Age: 58
- Ọ bụ onye Umunnamehi, Ihiala n’okpuruọchịchị Ihiala.
- Ọ zọbuola ọkwa gọvanọ Anambara steeti n’okpuru NDP n’afọ 2003 mana ọ zọtaghị ya. Ọ nwara ọzọ n’afọ 2013 mana ọ zọtaghị ọkọlọtọ ịnọchi anya PDP na ntuliaka, ọ nwakwara ọzọ na 2017 mana APC enyeghi ya ohere ife ọkọlọtọ ha. .
- Ọ bụ onye onyinye nke inyere ndị nọ n’ụbịam aka na-anụ ọkụ n’obi. Ọ zụọla ọtụtụ ndị ogbenye n’akwụkwọ n’efu, mezie ụfọdụ ụzọ n’obodo, rụọ ụlọụka dị iche iche ma rụkwaara ụfọdụ ndị ogbenye ụlọ.
- Profession: Ojiegoachụego
- Age: 50
- Ọ bụ onye Ụmụanụka, Otolo, n’okpuruọchịchị Nnewi Nọt.
- Ọ bụ onye onyinye a ma ama nke nyerela ọtụtụ ndị aka n’ụzọ dị iche iche gụnyere ịzụ ndị mmadụ n’akwụkwọ n’efu, mwulite na ndozi obodo, ihe gbasara agbambọọlụ wdgz.
- Ọ zọrọ ọkwa gọvanọ Anambara n’okpuru LP n’afọ 2014 mana ọ zọtaghị ya. N’afọ 2019, ọ zọọ ma zọta oche Sinetọ na-anọchite anya Anambara Saụt n’Ụlọomeiwu ukwu Naịjiria, n’okpuru pati YPP.
- Profession: Ọ bụ ihe Bekee kpọrọ ‘Political Economist’ nakwa ojiegoachụego.
- Age: 55
- Ọ bụ onye Ogidi, n’okpuruọchịchị Idemili Nọt.
- Ọ zụburu ahịa n’Ọnịcha tupu ọ gaa mahadum na mba Rọshịa.
- O ritela ọtụtụ nzere na nturuugo n’azụmahịa nakwa n’ihe gbasara mkpata na mmefu akụnaụba.
- Ọ bụ onye kwenyere na mwulite na ndozi obodo n’ụzọ gụnyere ịzụ ndị mmadụ n’akwụkwọ n’efu, ịrụ ụlọụka, ụzọ nakwa ihe ndị ọzọ, wdgz.


























