E liela ndịagha Naịjirịa 12 ahụ e gburu na Benue Steetị

Ndịagha Naịjirịa

Ebe foto si, Nigerian Army/Twitter

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

E liela ndịagha mmadụ iri na abụọ ahụ ndị ekperima gburu n'okpuruọchịchị Konshisha dị na Benue Steetị n'izuụka gara aga.

Ndị ezinaụlọ ha, ndịagha ibe ha, ndịisi ndịagha si n'ogige ndịagha 72 Battalion dị na Makurdi nọ ebe ahụ.

Gọvanọ Benue Steetị bụ Samuel Ortom na ndị ọrụ ya na gọọmentị Benue gaa akwamozu ahụ iji tie ezinaụlọ ndị a, ndịisi ndịagha nakwa gọọmentị etiti aka n'obi.

Ọ katọrọ ogbugbu ndịagha ahụ ma kwee nkwa inyere ndịagha aka ka a chọpụta ndị gburu ha.

Ọ katọkwara etu ndị nkịtị ji ebu egbe megide ndị ọrụ nchekwa.

Ortom gara n'ihu rịọ ezinaụlọ ndịagha a mgbaghara maka ihe o kwuru na mbụ na ọ bụ naanị ndịagha abụọ ka e gburu.

Ọ rịọkwara Onyeisiala Muhammadu Buhari na onyeisi ndịagha maka nke a.

Etu ndị o ji egbe si wakpoo obodo Ngbo dị n'Ebonyi State

Gun

Ebe foto si, STEFAN HEUNIS

Ndị a na-eche na ha bụ ọchị ehi bu egbe awakpola obodo Ebele , Ngbo dị n'okpuruọchịchị Ohaukwu n'Ebonyi.

Kọmishọna na-ahụ maka ime obodo na steeti ahụ bụ Stanley Okoro Emegha kwuru na agbara ọtụtụ ụlọ ọkụ mana amabeghị ma o nwere onye e gburu n'ọdachị ahụ.

O kwuru na amabeghị kpọm kwem ndị kpara mkpa mkpa a mana a na-eche na ọ bụ ndị ọchị ehi nakwa ndị Agila si Benue steeti.

Kọmịshọna uweojii n'Ebonyi steeti bụ Garba Aliyu kwetere na mwakpo a mere mana ọ natabeghị mkpesa gbasara ya makana ọ nọghị ya.

Ndí agha Naíjiría

Ebe foto si, Audu Marte

Ngalaba mba ụwa niile bụ UN n'aha ịchafụ ekwuputala n'ezie na Boko Haram wakporo otu ụlọọrụ ha dị na Borno steeti.

Edward Kallon bụ onyeisi ha na Naịjirịa kwuru na ọ na-echekasị ya etu mwakpo si arị ibe ya elu na Naịjirịa.

Ndị agha Naịjirịa abụọ nwụkwara na ya bụ mwakpo ebe ụlọobibi igwe obodo ahụ gbara ọkụ.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Mmadụ 57 butre ọrịa coronavirus na Naịjirịa taa

Achọtala ọrịa coronavirus n'ahụ naanị mmadụ iri ise na asaa na Naijirịa n'ụbọchị ụka dịka Ngalaba NCDC si kwuo.

Nke a na-abịa ka gọọmentị Naịjirịa jisike ekesa ọgwụ mgbochi si ụlọọrụ Astrazeneca na ala a.

Nwaanyí na-ebinye aka na vootu

Ebe foto si, Getty Images

Ntụliaka onyeisiala na Benin Repọblik

Onyeisiala Benin bụ Patrice Talon etola ntụliaka e mere na mba ụbọchị sọnde gara aga ma na-ekwu na ha abụrụla ọkachamara n'ihazi ntụliaka.

Ndị mmadụ apụtachaghị n'uju itu vootu na ya bụ ntụliaka onyeisiala ọtụtụ ndị na-ama Talon aka gbahapuru dịka French public radio si depụta.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

N'egwuregwu,

West Brom na Southampton ga-apịrị ya n'elekere isii nke mgbede ebe Brighton na Everton ga-ama onye ike ga-agwụ n'elekere asatọ nke mgbede taa n'asọmpi premier league.

Kedụ nke ịchere ga-akụpụ ibe ya ọkwụrụ n'anya?