Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: NFF akwụbeghị ndị Super Eagles ụgwọ

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:

Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:

Ndị IPOB na-achọ inye ndị Ohaneze ọsọ n'ọgbakọ Ohaneze na-akwado ime.

Ohaneze ndị Igbo na Naịjirịa
Nkọwa foto, Nnia Nwodo malitere dịka onye ndụ nke itolu (9) ndị Ohaneze ndị Igbo na 2017

Dịka a na-ele anya maka ọgbakọ ndị Ọhaneze chọrọ ime maka ịhazigharị obodo, ndị IPOB ekwuola na ha ga-me ọchụ ebe ahụ ma onye ndu ala Igbo ọbụla gaa ya bụ ọgbakọ.

Naịjirịa

Nyesom Wike na gọọmentị etiti na-akọrịta ọnụ nke ọhụrụ a.

Wike

Ebe foto si, Rivers State Government / Fescebook

Aka na-achị Rivas steeti bụ Nyesom Wike etiela mkpu na gọọmenti etiti chọrọ igbu ya.

Mana ụlọọrụ onyeisiala kwuru na ebubo anụrụma codeine na-ebute na-efegharị ebe niile nke na-ekwesighi nzaghachi.

Ebe ọzọ na Naịjirịa

Gọọmenti etiti na-ekwu ka ụmụ Naịjirịa ghara iweghachite ndị PDP

Ndị PDP

Ebe foto si, Getty Images

Na aka nke ọzọ, ụlọorụ onyeisiala ekwuola na ụmụ Naịjirịa nwaa anwa weghachite ndị PDP n'ọchịchị, ị mara na ego niile PDP zuru a natara ha ga-alaghachikwurukwa ha ọzọ.

Akụkọ mba ofesi

A na-agba mbọ ijide ebola n'ime DR Congo sọọsọ.

Ndị ọrụ ahụike

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ebola bịara na Naịjirịa na 2014 mana gọọmenti Naịjirịa jidere ya nkeọma

Ndị na-chọ ịkwụsị ọrịa Ebola na Congo ebidola inye ọgwụ mgbochi a ka na-enyocha enyocha.

Ndị ọrụ ahụike ga-ebu ụzọ nara ya bụ ọgwụ.

N'egwuregwu,

NFF akwụbeghi ndị Super Eagles ụgwọ mana ha ga-akwụ na nso a.

Super Eagles

Ebe foto si, Super Easgles/ Twitter

Dịka asọmpi iko mbaụwa na-abịa, ndị NFF ekwuola na ha ga-akwụ ndị Super Eagles ụgwọ ha n'oge na-adịghị anya.

Super ga-agbakwa otu Athletico Madrid n'Uyo echi n'asọmpi enyi na enyi iji kwado maka asọmpi iko mbaụwa ahụ.

Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri nke taa:

Aha onyonyo, Ọgbaghara otu APC Imo steeti eruola Abuja